Arthur Nzeribe Buried: Etu mmemme akwamozu ya siri gaa

Ọtụtụ ndị ọdịka mmadụ ọdịka mmadụ n'Imo steeti nakwa ala Igbo niile gbakọrọ n'obodo Oguta taa bụ Satọde, abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee afọ 2022, ịkwanyere Arthur Nzeribe ugwu ikpeazụ.
Arthur Nzeribe bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n'imo Steeti, onye rụkwara ọrụ dịka Sịnetọ nọchitere anya mpaghara Imo West n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa.
Ọtụtụ ndị gara n'emume akwamozu a gụnyere Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma, na aka chịburu Imo steeti bụ Emeka Ihedioha.
Ndị ọzọ gụnyere Emmanuel Iwuanyanwu, Enyinnaya Abaribe, Gerald Ironah, ndị omeiwu a ma ama, na ọtụtụ ndị ọzọ.

N'okwu ya n'emume akwamozu ahụ, Gọvanọ Uzọdịmma kọwara Arthur Nzeribe dịka isi a hụrụ kwaba okpu na ndọrọndọrọ ọchịchị n'Imo steeti.
"Okwu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa agaghị ezu oke ma ọ bụrụ na-akpọnyeghị aha Arthur Nzeribe," Uzodinma kwuru.
"Ọ bụ nnukwu mmadụ, nwa nwoke Imo steeti ji eme ọnụ."
Arthur Nzeribe: Lee ihe ụfọdụ ji hụ ya n'anya, ụfọdụ akpọọ ya asị

Ebe foto si, Arthur Nzeribe
N'omenala Igbo, ọ naghị adị mma ikwu okwu ọjọọ banyere onye nwụrụ anwụ, nke a mere na oge ọbụla mmadụ lara mmụọ, naanị okwu ọma ka ị ga na-anụ banyere ya.
Akụkọ banyere ọnwụ Arthur Nzeribe ebulitela ọtụtụ okwu banyere nnukwu mmadụ a kpara ike na ndọrọndọrọ ọchịchị Imo steeti na Naịjirịa.
Ọtụtụ na-ekwu okwu ọma banyere ya, ebe ndị ọzọ na-akatọ ụfọdụ ihe o mere oge ike ka dị ya.
Mana ọ bụ gịnị ka ọtụtụ mmadụ ji kpụrụ Arthur Nzeribe n'ọnụ?
Ụbụrụ ya na-aghọ nkọ
N'ezie, abịa n'ịma akwụkwọ, ụbụrụ Artur Nzeribe na-acha ọkụ.
O nwetara agụmakwụkwọ n'efu na mba Ingland n'afọ 1957.
Oge ọ lọtara Afrịka, ya na Kwam Nkrumah, bụ onyeisiala mbụ nke mba Ghana rụkọrọ ọrụ.
Nzeribe dekwara ọtụtụ akwụkwọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.
Ndị ọ kpọlitere na ndọrọndọrọ ọchịchị
Mmadụ dịka Emeka Ihedioha agaraghị abụ aha a na-anụ anụ taa ma e wepu ndị dịka Arthur Nzeribe.
Ọ bụ site na nkwado Arthur Nzeribe ka Ihedioha ji banye n'ụlọ omeiwu nta Naịjirịa ebe ọkwa ya nọ gbalite ruo osote onyeisi.
Cheta na Emeka Ihedioha mechara bụrụ gọvanọ Imo steeti, mana ụlọikpe kachasị mechara chụtuo ya.
Ndị ọzọ Arthur Nzeribe nyeere aka na ndọrọndọrọ ọchịchị gụnyere John Oyegun, Gerald Irona, Gideon Nwaeze, na ndị ọzọ
Ụlọọrụ FANZo hibere
Arthur Nzeribe malitere ụlọọrụ ya nke ọ kpọrọ FANZ n'afọ 1969.
N'oge ahụ ụlọọrụ ahụ so n'ụlọọrụ Naịjirịa a kacha anụ aha ya na Naịjirịa.
Lee ihe mere ọtụtụ ji kpọọ Arthur Nzeribe asị
June 12, 1993
Arthur Nzeribe so n'isi sekpụ ntị mere e ji kagbuo mpụtara ntuliaka e mere na Naịjirịa n'afọ 1993.
Ọ bụ Nzeribe bụ onyeisi otu kpọrọ onwe ha 'Association for Better Nigeria (ABN)' nke gara nata akwụkwọ ikike n'ụlọikpe iji gbochie ntuliaka ahụ.
Ọ bụ n'akwụkwọ ikike a ka onyeisiala oge ahụ bụ Ibrahim Babangida gbakwasara ụkwụ iji kagbuo ntuliaka Jun 12.
Ebubo ịzụ ahịa ngwa ọgụ
Ụfọdụ akụkọ kwukwara na Arthur Nzeribe zụrụ ahịa egbe.
Ebubo a na-ekwu na Nzeribe resịrị Naịjirịa nakwa Bịafra egbe n'oge agha, mana amaghị kpọmkwem ma nke a ọ bụ eziokwu.
Ebubo izu ego
Na Nọvemba afọ 2002, ụlọ omeiwu ukwu nke Anyim Pius Anyim nọ n'isi ya, boro Nzeribe ebubo na o riri ego dị nde naịra iri abụọ na abụọ (N22 million).
Ebubo a mere e ji chụpụ Nzeribe n'ụlọ omeiwu ukwu.
Nzeribe akwadoghị 'Orlu State'
Dịka okwu nkewapụta steeti ọhụrụ na Naịjirịa na-aga n'ihu, Arthur Nzeribe so na ndị na-akwadoghị ka e kewapụta Steeti Orlu.
O mere nke a n'agbanyeghị na ọ bụ ya na-anọchite mpaghara Orlu n'ụlọ omeiwu ukwu.
Nke a mere Arthur Nzeribe na Gọvanọ Imo steeti n'oge ahu bụ Achike Udenwa see nnukwu okwu.
Udenwa haziri ngagharịiwe nke ọ kpọrọ "One million march" iji kpọọ oku ka a chụtuo Nzeribe n'ọkwa.
Arthur Nzeribe alaala mmụọ n'afọ 83

Ebe foto si, Tonynwajeipost
Francis Arthur Nzeribe alaala mmụọ.
Otu onye ezinụlọ ya kwuru na nke a mere eme n'ezie.
Dịka o si kwuo, Arthur Nzeribe nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'ala bekee.
Ezinụlọ Nzeribe mechara wepụta akwụkwọ ozi nke ha ji kwuo kpọmkwem na nna ha ukwu alaala mmụọ n'eziokwu.
Ha dere sị: "Ezinụlọ obi eze Nzeribe nke dị n'obodo Umudei, Oguta...na-ekwupụta ọnwụ nwa anyị, nwanne anyị, nna anyị na papa nnukwu anyị bụ Ichie Francis Arthur Uzoma Nzeribe."

Ebe foto si, Nzeribe Family
"Ọ lara mmụọ n'abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2022, ka ọ gbachara afọ iri asatọ na atọ (83).
"Ezinụlọ anyị ga-amalite emume na ihe ndị ọzọ dịka omenala anyị si dị, tupu anyị ekwupụta etu mmemme akwamozu ya ga-esi gaa."
Ndị binyere aka n'akwụkwọ ozi ahụ bụ Francis Anyaegbu Nzeribe, Anthony Akpati Nzeribe na Oliver Nwedo Nzeribe.













