Nsukka Mosque: A chabiri ihe onyonyo Bishop Godfrey Onah n'ụdị o ji riri ghọọ ihe ọzọ- Nsụkka Catholic Diocese

Ebe foto si, Catholic Diocese of Nsukka
Ụka Katọlik nke Diayọsis Nsụka ekwuola na ihe onyonyo Bishop Godfrey Igwebuike Onah nke na-efegharị na soshal midia nke ụfọdụ na-arụ aka sị na ọ bụ ya butere ọgbaghara mere e jiri gbaa ụlọụka Alakụba ọkụ na Nsụka bụ nchabi ka a chabiri ya n'ụdị ka ọ ghọọ ihe ọzọ.
Otu jịkọrọ ndị ụka Alakụba na Naijiria bụ 'Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) na Bekee nọrọ na nso nso a degarala onyeisi ndị uweojii Naijiria nakwa Onyeisi ndị uweojii nzuzo(DSS) akwụkwọ mkpesa sị ka e jichie Bishopụ Ụka Katọlik na Nsuka bụ Rt Rev Godfrey Onah.
NSCIA na ndị Ụka Alakụba ụfọdụ weliter isi na-ebo Onah ebubo ikwu okwuchukwu kpaliri mwakpo ndị okpukerechi Alakụba na ụlọụka ha n'Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Ndịda-Ndịda(South-South).
Onye enyemaka mgbasaozi Gọvanọ Umar Abdullahi Ganduje nke Kano stteeti bụ Salihu Tanko Yakasai kwuru na ọ ga-adị mma ma ndị ọrụ nchekwa jiri Onah kuziri ndị ọzọ ihe. site na ịnwuchie ya ma kpụpụ ya ụlọikpe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana mkparịtaụka Odeakwụkwọ dịayọsis ahụ bụ Rev Fada Cajetan Iyiobi na BBC Igbo nwere n'ekwentị, o kwuru na a dụkọrọ ihe onyonyo ahụ n'ụzọ mere ya ka nghọta ya dị iche na ihe Bishop kwuru.
Ọ sịrị, "O nwere ahịrịokwu ị ga-ekwu, mana ewepụ ya etu isi kwuo ya mana ewepụ ya etu isi kwuo ya ọ pụta ihe ọzọ."
"Ndị a gara were akụkọ ebe a kpọtara ụka Kraistị na ụka Alakụba aha wepụ, hapụ ihe ekwuru na mbụ nakwa ihe e kwuru na ikpeazụ."
Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ n'otu ya bụ ookwuchukwu ka Bishopụ Onah kpọrọ ndị ntorobia oku ka ha ghara itinye aka na tigbuo-zọgbuo nakwa imebi ihe ọbụla.
N'okwu mkpesa otu NSCIA kpesara ma kpoo oku ka a nwụchie Onah, Fada Iyiobi kwuru na Ụka Katọlik adịbeghị njikere ịsa ya bụ okwu.
" Mgbe anyị dịrị nkwadebe anyị ga-agwa ndị ntaakụkọ."
Ka nke na-eme, otu 'Muslim Rights Concern'(MURIC) esonyela na-akpo okpu ka anwụchie Bishọpụ Onah.
Onyeisi otu ahụ bụ Ishaq Akintola kwuru na ịnwụchi Onah ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ndu ụka ga-achọ iji ụlọụka mere ebe ha na-akpalite ọgbaghara aka na ntị.
Nsukka Mosque: Ọgbaghara Nsụka abụghị banyere okpukperechi- Onyeisioche Ọkpuru Ọchịchị Nsụka

Ebe foto si, BBC/Cosmas Ugwueze
Onyeisioche okpuru ọchịchị Nsụka bụ Cosmas Ugwueze agbaala ama na mmadụ anọ merụrụ ahụ n'ọgbaghara mere na Nsụka ahapụla ụlọọgwụ ebe Ndị uweojii tọhapụrụla ndị anwụchiri maka ya bụ okwu.
N'ụbọchị Satode,abalị 30 nke ọnwa Oktoba afọ 2020, ọgbaghara dapụtara n'Odenigbo-Nsuka nke mere na e merụrụ ụfọdụ ndị mmadụ ahụ ma gbaa ụlọụka ndị na-ekpe ụka Alakụba ọkụ.
Okwu ahụ ghọrọ okwu a kpụ n'ọnụ dịka ụfọdụ maliete ịkpọ ya ọgbaghara dị n'etiti ndị Ụka Kraistị na ndị Ụka Alakụba.

Ebe foto si, Cosmas Ugwueze
Mana Ugwueze kwuru na ọgbaghara enweghị ka o siri emetụtaghị okpukperechi ọbụla.
"O nweghị onye dunyere ha gaa mee ihe ha mere. O nweghị ihe gbasara ụka n'ihe . Ọ bụ ndị na-ese okwu ego njem."
"Onye Igbo na-anya Keke butere nwaanyị onye Awusa buru ya rue na Barracks Junction. Onye ya N100, onye Keke si na ihe ha abụọ kpebiri bụ N150."
Nwaanyị tie mkpu, ndị be ha gbaputa tiwe onye keke ihe, ọbara si ya isi na ọnụ na-apụta."
Ọ kọwara na ọ bụ ụmụ Igbo hụrụ ihe mere, "weziri iwe webiga ya oke were gaa mebiwe ihe."
"Anyị gbara mbọ buga mmadụ anọ ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ. Gọọmenti amalitela ịrụgharị ụlọụka Alakụba "
Ugwueze gara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, udo alọghachiela na mpaghara ahụ.

Kepụkepụ BBC Igbo nwetara na-ekwu na a nwụchiri ụfọdụ ndị Ugwu nakwa ndị Nsụka maka ọgbaghara ahụ mana a tọhapụla ndị a nile.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu bụDavid Ndukwe ekweghị aza ekwentị ya iji gwa anyị nke bụ eziokwu.
Na mkparịtaụka nke ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde, Ugwueze kwuru na ọ bụ nghọtahịe dị 'etiti onye Igbo na-anya keke na nwaanyị onye Ugwu na-ere tomatọ banyere keke ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na ha agbanyụọla ya bụ ọkụ dịka ha kpọtara ndị ọrụ bụghị mmadụ anọ bụ ihe merụụahụ bụ
Nsukka Mosque: NSCIA edegarala onyeisi ndị uweojii Naijiria mkpesa

Ebe foto si, NPF/NSCIA
Otu jịkọrọ ndị ụka Alakụba na Naijiria bụ Nigerian Supreme Council for Islamic Affairs (NSCIA) na Bekee edegarala onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu akwụkwọ na-ebo Bishopụ Ụka Katọlik na Nsuka bụ Bishop Godfrey Onah ebubo ikwu okwu butere mwakpo ndị okpukerechi Alakụba nsogbu na Ọwụwa-Anyanwụ nakwa Niaja Delta.
Otu ahụ na-ebo Onah ebubo ikwu okwu butere ọgbaghara mere ka awakpo ndị ụka Alakụba na Nsuka na nsonso a.
Na akwụkwọ mkpesa nke Osote odeakwụkwọ NSCIA nke Salisu Shehu binyere aka, ha kwuru na ụfọdụ ndị ụka Kraistị wakporo ndị ụka Alakụba na Nsụka gbaa ụlọụka Alakụba ọkụ dịka Bishọpụ Ona gbaschara ozioma ya.
Ozi ahụ kwuru sị, "N'Ụbọchị Satọde abalị 31 nke ọnwa Ọktoba, ụfọọ̄ụ ndị ụka Kraịstị wakporo ndị ụka Alakụba na Nsuka, gbaa ụlọ Alakụba ha ọkụ n'ihi okwuchukwu nke jụpụtara okwu akpọmasị,asị nke otu Bishọpụ odfrey Igwebuike Onah ziri."
Ha gara n'ihu boo ebubo na ọ bụ okwuchukwu ya kpalitere ndị ụka ya ịwakpo ndị ụka Alakụba nakwa ụlọụka ha.

Ebe foto si, NSCIA
Gịnị na-esere ndị alakụba na ndị obodo Nsụka? Lee ihe anyị chọpụtara

Ebe ya bụ mkpamkpa ọgụ nọrọ dapụta ụbọchị satọde gara aga bụ na ogige obibindị nchekwa dị nso n'Odenigbo Nsukka.
BBC mere nchọpụta na ihe kpatara ya bụ nsogbu bụ na onye ụgbọala keke na onye o bu bụ nwaanyị awụsa bụ onye ofufe alakụba nwere nhọtahie, nke kpatara na ụmụnne nwaanyị ahụ were mma makasịa onye keke ahụ.
Dịka Imam na elekọta Central Mosque Nsukka Barracks bụ Yakubu Abdulahi Omeh siri kọwaa, ndị otu ya bụ onye Keke na ndị ntorobịa Nsukka chere na onye Keke ahụ anwụọla nke mere ha jiri wakpo ndị niile bụ ndị Hausa ụbọchị ahụ ma tiwe ha nnukwu ihe.
Ha gbakwara ụlọ ofufe ndị alakụba abụọ dị ebe ahụ ọkụ ma mebisia ụlọ akwụkwọ.
Otu Onye Keke bu Okechukwu Ome kwuru na ha chere na onye keke ibe ha anwụọla nke kpatara ha jiri mebiwe ihe ndị alakụba ahụ. Ọ kọwara na nwaanyị ahụ bụ Aisha kpọrọ ndị moslem bịara maa onye keke mma n'ihi na ha nwere nyọtahie maka ụgwọ njem ya.

Ihe emebiri gunyere ụlọ ndị Alakụba abụọ agbara ọkụ, ụlọ akwụkwọ ndị na-ekuzi maka Islam nakwa ọtụtụ akwụkwọ na akụrụngwa ha ji ekpe ekpere.
Bishop ndị katọliki na Nsukka bụ Bishop Onah eburularị ụzọ yọọ ndị ntorobịa ka ha hapụ imebisi ihe ma ọ bụ gbuo onye ọbụla n'ihi na omegidere iwu nke chukwu.Nnukwu ọgụ ahụ dara na Nsukka ụbọchị ole na ole gara aga n'etiti ndị okpukperechi nke Kraịst na nke alakụba abịala na njedebe mana e mebiri ọtụtụ ihe.
Mbọ BBC gbara inweta ọnụ ndị uweojii amịtaghị mkpụụ n'ihi na ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ David Ndukwe azaghị ekwentị ya.











