Charity Maduka: Ihe gbara ọkpụrụkpụ na ndụ nwunye Cosmas Maduka

Charity Maduka

Ebe foto si, Charity Maduka/Facebook

Nkọwa foto, Charity Maduka

Charity Maduka, nwunye Cosmas Maduka, onye e ji Coscharis mara, alaala mmụọ.

Akụkọ kwuru na oriaku Charity Maduka nwụrụ n'ụbọchị Sọnde a dịka ọ rịachara obere ọrịa.

Otu onye ezinụlọ ya na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya ugbua kwuru na ọ bụ eziokwu na nne ha ahapụla ụwa a.

Onye bụ Charity Maduka?

Cosmas Maduka na nwunye ya bụ Charity Maduka

Ebe foto si, Coscharisgroup.Net

Nkọwa foto, Cosmas Maduka na nwunye ya bụ Charity Maduka

Ọtụtụ ihe a ma banyere Charity Maduka bụ ihe di ya bụ Cosmas kwurula banyere ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'oge gara aga, Cosmas Maduka kwuru na ọ bụ nwunye ya mere ya ihe ọ bụ taa.

Coscharis kwuru na ya lụrụ nwunye ya tupu ya eruo afọ iri abụọ.

  • Ozi dị n'akara Facebook ya gosiri na Charity Maduka gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Nnewi Girls, ma gakwaa mahadum n'ụlọakwụkwọ 'Collage of Education' dị na Nsugbe
  • Oge ha abụọ lụrụ, Cosmas Maduka abụghị ọgaranya mana nna Charity bụ onye ọgaranya a ma ama."Mana o nwere ihe ọ hụrụ n'ime m nke mere o ji kweta na ọ ga-alụ m," Cosmas kwuru.
  • Ha abụọ hụrụ onwe ha n'ụlọụka oge Cosmas dị afọ iri na asatọ, o wee kpebie na ọ bụ ya ka ọ ga-alụ.
  • N'ime afọ abụọ ha hụrụ onwe ha ka ha agbaa akwụkwọ."
  • Ọ bụ Charity Maduka bụ osote onyeisi ụlọọrụ Coscharis.
  • Ọ bụ mbido aha Cosmas na Charity ka ha ji mepụta aha ụlọọrụ ha (COSmas na CHARIty = Coscharis).
  • Coscharis na nwunye ya ebiela afọ iri anọ na atọ na-enweghị esemokwu ọbụla, dịka o si kwuo.
Charity Maduka

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Facebook

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị Igbo a ma ama ezigarala Cosmas Maduka ozi iti aka n'obi

Cosmas Maduka kọkwara etu ya na nwunye si zụlite ụmụ ha niile n'ụzọ kwụ ọtọ.

O kwuru na ha enweghị onyonyo TV n'ụlọ ha oge ụmụ ha na-etolite.

Nke a bụ iji kuziere ụmụ ha mkpa ọ dị itinye uche n'agụmakwụkwọ ha ma hapụ ihe ga-emesa ha anya.

Cosmas na Charity Maduka

Ebe foto si, Charity Maduka/Facebook

Nkọwa foto, Cosmas na Charity Maduka