Nye m Nnamdi Kanu, udo ga-alọghachi n'Ọwụwa Anyanwụ - Mbazulike Amaechi gwara Buhari

Onye okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa bụ Mbazulike Amaechi arịọla Onyeisiala Muhammadu Buhari ọzọ ka ọ tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu na mkpọrọ.
Amaechi kwuru nke a n'ọgbakọ Buhari na ndị okenye Igbo nwere n'Abakiliki n'ụtụtụ Fraịde, abalị isii nke ọnwa Mee afọ 2022.
O kwuru sị: "I chetara ihe m rịọrọ gị oge m bịara Abuja n'ọnwa Nọvemba afọ 2021."
"Agwara m gị na achọrọ ka udo lọghachi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ tupu m lakwuru ndị nna nna m."
"Agwakwara m gị ihe ga-eme ka udo ahụ lọghachi."
"Biko mee ihe ahụ m rịọrọ gị, kpọnye m nwa amadi a (bụ Nnamdi Kanu), ana m ekwe gị nkwa na aga m enye gi udo n'Ọwụwa Anyanwụ."
Cheta na Mbazulike Amaechi na ụfọdụ ndị okenye Igbo gakwauuru Onyeisiala Buhari n'Abuja ma rịọ ya ka ọ tọhapụrụ ha Nnamdi Kanu.
N'oge ahụ, Buhari gwara ha na ọ ga-echeba echiche banyere arịrịọ ha.
Mana o mechara pụta kwuo na ya bụ okwu dị n'ụlọikpe, na ya ga-ahapụ ka ụlọikpe kpebie ya.
Tohapụ Nnamdi Kanu - Arịrịọ ndị okenye Igbo rịọrọ Buhari n'Ebonyi

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndị Okenye ala Igbo akpọọla oku ka Onyeisiala Muhammadu Buhari tọhapụ Mazi Nnamdi Kanu bụ onye eji na mkpọrọ ndị DSS maka ebubo ịkpa nkata ịkposa Naịjirịa, iyi ndụ egwu na ịkpa aghara.
Ndị okenye a nke onye kwuchitere ha ọnụ ha bụ onyeisi ndị otu ụka a kpọrọ Christian Association of Nigeria (CAN) n'ọwụwa anyanwụ bụ Rev. Father Abraham Nwali, gwara onyeisiala ụbọchị Fraịde n'ime njem abalị abụọ ọ mere n'Ebonyi steeti.
Nwalị sị, "anyi na-arịọ ka e jiri ụzọ udo kpebie ya bụ ikpe dịka nna, nna nwere obi mgbaghara, nye Nnamdị Kanu mgbaghara. Anyị chọrọ ka a gbaghara ya".
"Anyị ji ohere a akpọkụ ndị niile na-azọ mnwereonwe ka ha kwụsị tigbuo na zọgbụọ, jiri nwaanyọ rịọwa ka e nwee Naijirịa ebe anaghị akpa oke, ebe agụụ na ụbịam adịghị.
Onyeisiala Muhammadu Buhari atụpụghị ọnụ maka ya bụ arịrịọ.
Cheta na gọọmentị Naịjirịa ji Nnamdi Kanu eji maka ebubo na ọ chọrọ ikpose Naịjirịa ya na ịbụ onye ndụ ndị otu omekatara ihe pụọ ụjọ bụ nke a malitere kemgbe 2015.
Ihe Buhari sara ndị okenye Igbo rịọrọ ya ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Aso Rock Villa/Facebook
Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwusiela ike na ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi ikpe Nnamdi Kanu.
Buhari kwuru nke a dịka ọ na-asa ndị okenye Igbo okwu na njem nleta ọ gara n'Ebonyi Steeti n'ụbọchị Tọzde.
O kwuru na ya anụla arịrịọ ndị okenye rịọrọ ya, "mana ebe ọ bụ na okwu ahụ adịla n'ụlọikpe, ọ bụ ụlọikpe ga-ekpebi ya."
Buhari gakwara n'ihu gbarụọ ihu maka etu ndị ntorobịa si ebugharị egbe na mpaghara ọwụwa Anyanwụ na-eyi ndị mmadụ egwu.
"Onweghị onye nwere ikike ibu egbe AK-47 ma ọ bụghị onye ọrụ nchekwa," Buhari kwuru.
"Anụla m akụkọ dị icheiche etu ndị oyi ndụ egwu si akpa mkpamkpa dị icheiche na mpaghara a, ma na-egbusi ndị mmadụ nkịtị."
"Ọ dị mwute na ọ bụ ndị agha anyị ji ndụ ha echekwa ndị mmadụ ka ndị ekperima a na-awakpo."
"Ihe bụ mkpa m bụ ndị mmadụ na-agbara onwe ha mbọ, ndị aka ha dị ọcha, bụ ndị chị obi ha n'aka ugbua n'ihi mwakpo ndị ekperima."
Etu ndị unknown gunmen si gbaa ụgbọala, ọgbatumtum ọkụ n'Ebonyi steeti

Ndị omekome a na-akpọ "Unknown gunmen: agbaala otu ụgbọala nakwa ọgbatumtum ọkụ n'okporoụzọ dịketere Pa-Ngele Oruta stadium dị n'Abakiliki.
Dịka anya hụrụ si kwuo, ndị omekome ahụ kwụsịrị ndị niile nọ n'ụgbọala na ọgbatumtum ndị ahụ agbara ọkụ, chụsasia ha ma gba ụgbọala ahụ ọkụ.
A na-eche na ọ bụ mgbe ndị omekome ahụ na-achọ ka ha jiri ike kwanye ndị mmadụ ọkụ n'ike ha nọrọ n'ụlọ ka ọdachị a mere.
Onye bi n'akụkụ ebe ihe a mere na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na ndị omekome ahụ ji egbe gbalie elu ọtụtụ mgbe nke mere ka ndị mmadụ gbafuo ebe ahụ maka ụjọ ji ha.
Onye ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị uweojii nakwa ụfọdụ ndị otu Ebubeagu(nchekwa ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere) gbara ebe ahụ okirikiri ugbua.
Mgbe onye ntaakụkọ anyị jụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Loveth Oda, Oda kwuru na ọ natabeghị ozi gbasara mwakpo a.










