Nnamdi Kanu Court Case: Ihe ise nwere ike ime dịka Nnamdi Kanu nwetara mmeri n'ụlọikpe n'Umuahia

Ọ bụ ezie na ụlọikpe ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia, Abia steeti, enyela iwu ka gọọmentị Naịjirịa kwụọ otu ijeri naịra nye Mazi Nnamdi Kanu, onyeisi otu na-azọ nnwereonwe na Naịjirịa bụ Ipob, maka imegide ikike dịịrị ya dịka mmadụ.
Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụ sị ikpe ebe a ga-akwụ Nnamdi Kanu N1billion ọ bụ otu ikpe ya n'Abuja?.
Ụfọdụ ana-ajụ sị "gịnị ga-emezi ugbua?"
Ọkaiwu Joe Eboigwe bụ onye ọkaiwu na Legọs gwara BBC Igbo uche ya maka ihe ndị o che nwere ike ime dịka ụlọikpe nyechara mkpebi a.
1) Gọọmentị etiti nwere ike ịgbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpesa

Ọkaiwu Eboigwe kwuru na gọọmentị etiti nwere ike ịgbagha mkpebi ahụ n'ụlọikpe mkpesa maọbụ 'appeal court' na Bekee.
"Ọ bụrụgodi na Kanu merie n'ụlọikpe mkpesa, gọọmentị nwekwara ike ịgbagha ya n'ụlọikpe kachasi - 'Supreme Court'."
Eboigwe kọwara na ọ bụrụ na gọọmentị agbaghaghị ikpe ahụ, ọ pụtara na ha nabatara ya, na ha ga-akwụkwa Nnamdi Kanu ụgwọ ụlọikpe sị ka a kwụọ ya.
"Mana n'uche nke m, gọọmentị etiti ga-agbagha mkpebi ahụ."
2) E nwere ike ịgbapụta Nnamdi Kanu na mkpọrọ

Ọkaiwu Ugo Egbujo kwuru na mmeri Nnamdi Kanu nwetara n'ụlọikpe nke Umuahia, nwere ike inye aka ka ụlọikpe nke dị n'Abuja nye iwu ka a tọhapụ ya nwa mgbe nta.
Egbujo kọwara sị: "Mkpebi ụlọikpe nke Umuahia egosila n'ezie na etu ndị agha si wakpoo ụlọ Nnamdi Kanu na 2017 ezghị ezi."
"Cheta na Nnamdi Kanu na-ekwubu na ọ bụ maka mwakpo ndị agha n'ụlọ ya kpatara o ji gbaa ọsọ ndụ, ọ bụghị na ọ gbara ọsọ ikpe a na-ekpebu ya."
"Mkpebi a e nyere n'Umuahia pụtara na ihe Nnamdi Kanu na-ekwubu bụ eziokwu."
"Nke a nwere ike ime ka ọkaikpe Binta Nyako nọ n'Abuja tuleegharịa ya bụ okwu, ma nye iwu ka a tọhapụ Nnamdi Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa ụlọ ikpe, nke bekee kpọrọ 'bail'.
Mana n'aka nke ọzọ, ọkaiwu Joe Eboigwe kwuru na ikpe abụọ ahụ dịwagaara onwe ha iche, onweghị ihe gbasatara ha abụọ.
Eboigwe kọwara sị: "Ikpe nke Umuahia bụ maka ikike dịịrị Nnamdi Kanu, ebe nke Abuja bụ ebubo mpụ ka gọọmentị boro ya. Ha abụọ emetụtaghị onwe ha."
3) Ndị mmadụ ga-emetewere Nnamdi Kanu ebere

Ugo Egbujo kọwakwara na mkpebị ụlọikpe Umahia ga-ewetara Nnamdi Kanu ebere ndị mmadụ, nke bekee kpọrọ 'public sympathy'.
"Ndị mmadụ ga-ahụtawa ya dịka onye gọọmentị na-emegide."
"Nke a bụkwa ihe ndị ọkaiwu ya na ndị nkwado ya chọrọ achọ," Egbujo kwuru.
4) Ikpe nke Abuja nwere ike igbu oge

Ọkaiwu Ugo Egbujo kwuru na mkpebi ụlọikpe nke Abuja nwere ike ịdọtị oge ikpe nke Abuja.
Ọ kọwara na ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu nwere ike chọọ ụzọ ha ga-esi were mkpebi ahụ na-egbu oge n'ụlọikpe n'Abuja.
"Mana ọ bụrụ na ọkaikpe Binta Nyako kwụsie ike, ọ gaghị ekwe ka nke ahụ mee," Egbujo kọwara.
5) Ụlọikpe Umuahia enweghị ikike karịa nke Abuja

N'aka nke ya, ọkaiwu Eboigwe gakwara n'ihu kọwaa na ụlọikpe ukwu dị n'Umuahia na nke dị n'Abuja nwere otu ikikere, onweghị nke karịrị ibe ya.
"Ha abụọ ha nhatanha, maọbụ etu bekee si ekwu ya, 'courts of coordinate jurisdiction'", Eboigwe kwuru.
Nke a pụtara na otu n'ime ha agaghị etiri nke ọzọ iwu ihe ọ ga-eme.
Cheta na ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimako kọwara na ụlọikpe Umuahia kwuru na ụzọ ka mma iji soo okwu dị n'etiti Nnamdi Kanu na gọọmentị etiti bụ mkparịtaụka, maọbụ nke bekee kpọrọ 'political solution'.
Mana ọkaiwu Joe Eboigwe kwuru na ụlọikpe nke Umuahia enweghị ikike ịgwa nke dị n'Abuja ihe ọ ga-eme.
Oge eruola ka ndị nkwado Nnamdi Kanu ṅụrịwa ọnụ?...

Ebe foto si, Reuters
Ọtụtụ ndị nkwado Nnamdi Kanu na-awụli elu n'ọṅụ, na-ekwu na onye ndu ha emeriela gọọmentị Naịjirịa n'ụlọikpe.
Olileanya ndị dị otu a bụ na a ga-atọhapụzi Kanu n'ụlọ mkpọrọ ka ọ lawa.
Mana ọ dị mkpa ịkọwa na ikpe dị n'etiti Nnamdi Kanu na gọọmentị Naịjirịa dị ụzọ abụọ.
Nke mbụ bụ nke gọọmentị kpụpụrụ ya n'ụlọikpe dị n'Abuja, na-ebo ya ebubo, iyi ndụ egwu nakwa ịchọ ịghsa ọchịchị Naịjirịa.
Nke abụọ bụ nke Nnamdi Kanu gbara gọọmentị n'Umuahia, Abia steeti, maka ịwakpo ụlọ ya n'ụzọ na-ezighi ezi, n'afọ 2017.
Ọ bụ ikpe nke a dị n'Umuahia ka e kpebiri n'ụbọchị Wenezde, abalị iri na itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2021.
Ebe ahụ ka ọkaikpe Benson Anya nọrọ kwuo na gọọmentị mere ihe ọjọọ ịwakpo ụlọ Kanu, maka na o megidere ikike dịịrị Kanu dịka mmadụ.
Mana ikpe nke dị n'Abuja, nke ọkaikpe Binta Nyako nọ n'isi ya, ka na-aga n'ihu.
Ọ bụ n'abalị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị ka e yigharịrị ya.
Gini bụ Ipob?
Ipob pụtara 'Indigenous People of Biafra'.
Ọ bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ obodo nke aka ya.
Mana gọọmentị Naịjirịa akpọọla ha otu na-eyi ndụ egwu, ma kwuo na o megidere iwu mmadụ isonye n'otu ahụ.
Onye bụ Nnamdi Kanu?
Nnamdi Kanu bụ onye hibere otu Ipob n'afọ 2009, ọ bụkwa ya bụ onyeisi otu ahụ ugbua.
Ọ bụ onye Afaraukwu dị n'Umuahia, Abia steeti, n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, mana o nwekwara akwụkwọ gosiri na ọ bụ onye mba Briten.
Kanu bụ onye ama na-ekwu okwu megide ọchịchị Naịjirịa ma na-akpọ oku ka e nwee ntuliaka ebe ndị Ọwụwa Anyanwụ ga-ekwu ma ha achọrọ ịnọgide na Naịjirịa.
Gọọmentị Naịjirịa jichiri Nnamdi Kanu nke mbụ n'afọ 2015, malite ikpe ya ikpe n'ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu ọchịchị Naịjirịa.
N'afọ 2017, Kanu gbapụrụ ọsọ na Naịjirịa, n'ihi na o kwuru nd ndị agha wakporo ụlọ ya ma chọọ igbu ya.
Mana ndị ọrụ nchekwa nwuchikwara ya ọzọ na mba Kenya n'ọnwa Jun afọ 2021, kpụlata ya Naịjirịa.
Ikpe ya malitekwara ọzọ n'ọnwa Sepụtemba afọ 2021.










