Nnamdi Kanu court trial: Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ikpe Nnamdi Kanu n'Umuahia

Obiozor, Ijele na Achalla

Taa bụ ụbọchi 19 nke ọnwa Jenuwarị 2022 ka e kpebiri ikpe Nnamdi Kanu bụ nke o jiri gbaa gọọmentị etiti akwụkwọ maka mwakpo ụlọ ya n'ụbọchị 10 nke ọnwa Septemba 2017, ya na otu e siri kpara ya aka na Kenya afọ gara aga.

Ndị mmadụ na-ekwu ka obi dị ha maka ya bụ ikpe e kpebiri, ebe ụlọikpe kwuru ka a kwụọ Nnamdi Kanu otu ijeri Naịra.

BBC gbara ndị ọnụ na-eru n'okwu ajụjụ ọnụ ịmata ka obi dị ha gbasara ya bụ mkpebi.

'Anyị ga-eleba anya na ya bụ mkpebi'

Ohaneze ndị Igbo nke George Obiozor nọ n'isi ya sị na "ndị ọkammụta anyị ga-eleba anya na ya bụ ikpe tupu anyị agwa ọha ihe anyị che maka ya".

N'otu aka ahụ, Alex Ogbonnia ya bụ odeakwụkwọ mgbasa ozi Ohaneze Ndigbo, kwuru sị na "anyị nụrụ okwu abụọ gbasara ya bụ ikpe. Ụfọdụ sị na otu Ipob meriri ebe ndị ọzọ sị na ọ bụghị eziokwu, kedụ nke anyị ga-eso eso?"

Ogbonnia sị na ya ga-ekwu okwu mgbe ya matara nke bụ eziokwu n'ime okwu abụọ a.

'Eziokwu emechaala pụta ihe gbasara ikpe a.'

Paul Achalla bụ onye ndụmọdụ otu Indigenous People of Biafra (Ipob) n'ihe gbasara ikpe na mba Briten, sị na obi dị ha ụtọ na ha meriri ya bụ ikpe.

Ọ sị na nke ahụ gosiri na gọọmentị Naịjirịa dara iwu mgbe ha wakporo ụlọ Kanu n'afọ 2017.

Mgbe BBC jụrụ ya ma o che na Gọọmentị Naịjirịa ga-akwụ ya bụ nha otu ijeri ụlọikpe dara ha, Maazi Achalla sara na "ma ha akwụrụ ya ma ha akwụghị ya adịghị oke mkpa. Ihe kacha mkpa bụ na e meriri ha n'ụlọikpe".

Ọ sịkwa na "eziokwu emechaala pụta ihe gbasara ikpe a."

Mana Achalla sịkwa na mmeri a ezubeghi itewe egwu maọbụ kpọwa mmanya maka ya, ruo mgbe ekpechara ya bụ ikpe.

Mgbe a jụrụ ya ihe o chere maka mkpebi ikpe nke abuọ gbasara ikpe na etu e siri kpụlata Nnamdi Kanu na Kenya, Achalla sị na obi adịchaghị ha mma maka nke ahụ, maka na "ọ dị ka Ọkaikpe agbara ya nkọ nkọ, gaa ya akụkụ akụkụ", mana ọ tụrụ ilu sị na "ka anyị na-aga n'ubi ka ọka na-aka".

'Eluigwe ga-ebu ụzọ ruo ala tupu N1bn ahụ eruo Nnamdi Kanu aka'

Chukwuka Ofoegbu nke a na-etu Ijele Speaks na soshal midia sị na ikpe a "agbagwojughi m anya. Mgbe e buuru ya bụ ikpe gawa Umuahia, a ma m na ọ bụ etu ọ ga-adị."

O kwuru na ya bụ ikpe ga-etipịa ma o ruo ụlọikpe mkpegharị.

Ọ na-ekwusi ike na onweghị onye ga-enye Nnamdi Kanu ego ahụ adara gọọmentị nha, "eluigwe ga-ebu ụzọ ruo ala tupu ego ahụ eruo ya aka".

Mgbe mbụ e jidere Nnamdi Kanu bụ n'Ọnwa Ọktoba 2015 were bo ya ebubo igbu ọchụ, ibu egbe na-enweghi ikike, nakwa ibubata igwe na-ebusa okwu na redio na nzuzo.

Mana Maazi Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya sị na ọ bụghị eziokwu.

E mechakwara tụkwasa ya ebubo ndị ọzọ nke mere ya iri na ise ugbua.