Nnamdi Kanu: Ihe Falana, Nwala na Ezeife kwuru maka iji mkparịtaụka udo tọhapụ Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Falana/Nwala/Facebook
Okwu iji mkparịtaụka udo tọhapụ onye ndu otu 'Indigenous People of Biafra' bụ Nnamdi Kanu ka na-arị ibe ya elu.
Kemgbe ndị okenye Igbo sịka Mbazulike Amaechi, Chukwuma Ezeife na ndị ọzọ gachara zute Onyeisiala Buhari maka okwu a, ọtụtụ ndị gbapụtara ihe etinyela ọnụ na ya.
Ọkaiwu na-ahụ maka ikike dịịrị onye bụ Femi Falana sị na Gọọmentị Etiti kwesịrị ige ntị n'oku a ha kpọrọ maka iji ụzọ udo tọhapụ Kanu na Sunday Adeyemi a ma dịka 'Sunday Igboho'.
O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị ụlọọrụ mgbasaozi Arise TV jụrụ ya banyere njem ndị a mere.

Ebe foto si, Falzthebahdguy/Instagram
Ọ sị na ọ dị n'Iwu Naịjirịa ma bụrụkwa ikike ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami ịkagbu ebubo ọbụla gọọmentị boro mmadụ.
Falana sị na ọ ga-ara gọọmentị ahụ igosi akaebe n'ebubo ha boro Nnamdi Kanu nke a kpọrọ 'sedition' bụ nke a kagburu n'iwu Naịjirịa n'afọ 1983.
Ọ gakwara n'ihu sị na otu ịchọ nnwereonwe ha emegideghị iwu na-achị Naịjirịa n'ụzọ ọbụla.
Ọ sị ọ kaara gọọmentị mma iji mkparịtaụka udo n'okwu banyere Nnamdi Kanu na Sunday Igboho.

Ebe foto si, Úzódínma Nwala
N'otu aka ahụ, onyeisi otu 'Alaigbo Development Foundation' (ADF) bụ Ọkammụta Uzodinma Nwala sịrị na ịtọhapụ Nnamdi bụ otu ihe dị mkpa.
Ọ sịrị na o nweghi onye ga-agba nkịtị ma a nwụchie nwa ya na-emeghi ihe ọbụla banyere ya.
Nwala, onye toro ndị okenye Igbo gara hụụ Buhari maka okwu Nnamdi Kanu sịrị na ihe ọzọ kachasị mkpa bụ ileba anya n'ọnọdụ ndị Igbo na Naịjirịa.
Ọ sị na e kwesịrị ịnọkọ ọnụ kparịa ụka maka etu a ga-esi mee ka ndị Igbo soro n'ihe a na-eme n'ala Naịjirịa.

Onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu a bụ Chukwuemeka Ezeife bụ aka chiburu Anambra Steeti bụkwa otu n'ime ndị so mee njem ahụ.
Mgbe ọ na-aza ajụjụ n'Arise TV banyere njem ha, Ezeife sị na o nwere olileanya na Onyeisiala Buhari ga-eleba anya n'arịrịọ ha rịọrọ.
Ọ sị na obi dị ha ụtọ etu onyeisiala si nabata ha ma gee ha ntị, na o gosiri na ọ ga-eleba anya n'eziokwu.
Ezeife kwukwara na ndị nọ onyeisiala nso mere ka ha mata na olileanya dị na ozi ha ziri anwụrụ ọkụ ga-eru eluigwe.
Mana otu dị iche iche si na mpaghara ugwu ekwuola ka Onyeisiala Buhari ghara ige oku a ndị a kpọrọ ntị.
Ha sị na e nweghi etu a ga-esi atọhapụ onye ha sị ndị otu ya wakporo ma gbuo ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa.
Ha gaara n'ihu sị na ọ bụrụ gọọmentị tọhapụ Nnamdi Kanu na ọ ga-abụ ihe ịmaatụ ọjọọ nye Naịjirịa n'ọnọdụ dị etu a.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:









