Anyị na-agba mbọ ike anyị niile ịhụ Nnamdi Kanu - Mba Briten

Ebe foto si, Govt Nigeria/Getty
Otu onye na-ekwuchitere mba Briten agwala BBC Igbo na ha na-agba mbọ ha niile 'izute nwa afọ ha' aka ji na Naịjirịa.
N'ịzaghachi ajụjụ BBC Igbo jụrụ banyere ihe ji ha ịga hụ nwa amadị ahụ, onye ahụ siri na ha na gọọmentị Naịjirịa na-akpa maka ya kwamgbe.
Ọ sịkwa: "Anyị na ezinaụlọ Kanu nakwa ndị ọkaiwu ya na-ekwu okwu".
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor kwuru maka ọnọdụ a dịka ọ sị na ọ bụghị eziokwu na onye nnọchịte anya mba Briten maọbụ onye ọrụ ya gara hụ ya n'ebe ngalaba a kpọrọ "Department of State Services" ji ya.
N'okwu o kwuru n'ọba Facebook ya, Ọkaiwu Ejiofor sị na ka na-ekwusi ike na onwebeghi oge onye ọbụla si ngalaba nnọchite anya Briten a kpọrọ High Commission.
Ejiofor sị ka ndị mmadụ ghara ige ntị "n'asị ụfọdụ ndị mmadụ na-atụrụ ọha.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya ma ihe ya na-ekwu n'oge ya na-asị na "aka mba Briten dị na nwuchi a nwuchiri Nnamdi Kanu na mba Kenya".
Ọ sị na ha amlitela njem n'ụlọikpe na Briten iji hụ na "mba ahụ mere ihe ha kwesiri maka nwa afọ ha".









