Mkpụrụ mmiri: Ihe mere o jiri bụrụ ọgwụ ike na-enye nsogbu dị egwu

Ebe foto si, Australian Federal Police
Ugbua, otu ihe na-ewusike na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ mkpa mkpa ọgwụike Igbo na-akpọ mkpụrụ mmiri na-akpa n'obodo dị iche iche.
Ọtụtu ihe onyonyo a na-etinye na soshal midia na-egosi ebe ndị ikoroọbịa n'ụfọdụ obodo, ọkachasị na Steeti Anambara, na-anwụchi ma na-eti ndị mmadụ ihe maka ebubo na ha na-aṅụ ọgwụ ike a.
Onyonyo ndị ọzọ na-egozikwa ebe ndị mmadụ na-atụrụ onwe ha n'ala dịka ndị nọ nso na-ekwu na ọ bụ ọgwụike ha ṅụrụ na-emetụ ha n'isi.
Onyonyo nke na-egosi ebe a na-apịa ndị mmadụ ihe, n'ebumbuche na ọ ga-eme ka ha kwụsị isi, ịgba maọbụ ịnụ mpụrụ mmiri.
Akaebe a niile na-egosi na mkpụrụ mmiri bụ nsogbu dịrị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ugbua.
Mana, ọtụtụ mmadụ na-ada ebube, ma na-ajụ ihe bu mkpụrụ mmiri a na ihe mere ojiri bụrụ ihe akpụ n'ọnụ ugbua.
Gịnị bụ mkpụrụ mmiri?

Mkpụrụ mmiri bu ọgwụike akụrakụ Bekee na-akpọ Crystal Meth. Ọ bụ ọgwụike si agbụrụ nke a na-akpọ "Speed" siri ezigbote ike.
A na-akpọ ya ka ụtaba, ese ka sịga, agba ya n'akwarama ma na-aṅụ ka mmiri. O nwekere ndị na-ata ya ka nri.
Mkpụrụ mmiri na ọgwụ Bekee kpọrọ methamphetamine yiri ihe si otu agbụrụ ọgwụ, mana dịka e ji methamphetamine agwụ ndị nwere ọrịa Bekee na-akpọ ADHD, onweghi ihe e ji mkpụrụ mmiri eme karịa ndị chọrọ ka o mee ha ihe ọgwụike na-eme.
Ndị dọkịta na-ekwusike na mkpụrụ mmiri abụghị ihe ọma ma ncha. Ha na-ekwukwa na ọ bụ ihe nwereike enye mmadụ ezigbote nsogbu, nke Bekee na-akọwa dịka ihe dị "highly dangerous".
NDLEA kwuputere ihe ndị a gbara ọkpụrụkpụ maka Mkpurummiri
Femi Babafemi bụ ọnụ na-ekwuru ngalaba na-ahụ maka ihe niile gbasara ọgwụike na Naijiria bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) kwuru ọtụtụ ihe mmadụ ịṅụ ọgwụike a akpọrọ 'mkpuru mmiri' nwereike ime n'ime ahụ mmadụ.
Sịte na mkparịtaụka ya ndị ụlọọrụ ntaakụkọ The Guardian Nigeria nwere, lee ihe ndị o kwuru maka mmadụ ịnụ ọgwụike a:
- Ọgwụike a bụ ihe ụtọ ya na-aba n'ụmị mmadụ nke ukwu
- Ikike ọgwụ a nwereike ịmetụta akparamagwa mmadụ nke ukwu nke bụ na onye ahụ nwereike igbu onwe ya maọbụ gbuo onye ọzọ ma ọkpasuo ya iwe
- Ọgwụ a nwere ike ime ka mmadụ na-ahụ ihe dịka onye nọ na nrọ
- Ọgwụ a na-eme na mmadụ hapụ iwe ike larụ ụra chacha
- Ọ na-akpalite ọbara mgbali elụ nakwa ọrịa obi
- Ọ na-eme ka mmadụ ka nka n'ike
- Ọ na-eme ka eze mmadụ ree ere n'ike
- Ọ na-emetụta anụ ahụ mmadụ, nke bụ na ihe dịkaọya nwereike ịvụkashi n'ihu onye ahụ
- Ọgwa a na-akpalite isi mgbaka, ụdị nke na-adịghị mfe ịgwọ (Ụsọrọ ndụmọdụ e ji agwọ isi mgbaka nke a, ndị dọkịnta anaghị eme ya na Naijịrịa
Na nchịkọta okwu ya, o kwuru na amalite nnyocha ịchọpụta ụzo aga e ji kwụsị mmụbanwanye ọgwụ a n'ọwụwa anyanwụ. Maazị Babafemi kwuru na ha enyopụtala ma kposasia ebe a na-emepụta ọgwụ a n'ala Naịjirịa nke ọnụọgụgụ ya rurula iri na asatọ. O kwukwara na onyeisi ụlọọrụ ha enyela iwu ọsọ gbata gbata ime nnyocha nmaka etu ọgwụ si efegharị n'ọwụwa anyanwụ.
Kedụ ihe o yiri?

Ebe foto si, Getty Images
Etu mkpụrụ na-acha maọbụ di na-adi icheiche site n'onye mere ya.
Ọ dị mkpa ịkọwa ebe a na mkpụrụ mmiri abụghị ihe a na-enwete n'onwe ya (dịka ọ bụghị ihe si na akwụkwọ ndụ dịka igbo, kọkane, na heroin), ọ bụ ihe e ji "chemical" a gbọkọrọ agbwọkọ eme.
Ọ bụ ihe mere etu ọ na-acha maọbu dịrị na-adị iche iche.
Ihe mere e ji akpọ ya mkpụrụ mmiri bụ makana o na-adịkarị ka mkpụrụ mmiri ozuzo nke Bekee na-akpọ "ice".
Kedụ ihe ọ na-eme mmadụ n'ahụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ na-akpalị mmadụ obi elu, mee ka onwe ha na-atọ ha ụtọ, ma mekwa ka ọtụtụ chefuo ihe bụ ihe ọma na ihe bụ ihe ọjọọ.
Onye ṅụrụ mkpụrụ mmiri nwereike na-ahụ onwe ya na onweghi ihe ọgaghị emeli.
Ọnọdụ ịnaghị ama nke bụ mma maọbụ ọjọọ nwereike mee ka onwe ahụ kpaa agwa ọgaghi akpalị ma ha bụrụ n'ọbụghị ọgwụ ahụ na-achị onye ahụ.
Onye ṅụrụ ọgwụike ga-anọnwu n'ụdịrị ọnọdụ a site awa abụọ ruo awa iri na abuọ.
Ka otu ụbọchị gafechara, onye ṅụrụ mkpụrụ mmiri ga-amalite ịnọ n'ọnọdụ onye ike gwụrụ nakwa onye ụwa anaghi atọ ụtọ.
Nke a sọ n'ihe na-eme ka onye ahụ chọwa ụzọ ọ ga-esi aṅụ ya ọzọ iji nwekwaa ụdịrị aṅụrị o nwere oge ọ ṅụrụ ya mbụ.
Ọdachị na-eso mkpụrụ mmiri

Ebe foto si, Getty Images
Mkpụrụ mmiri na-emetụta ahụike mmadụ n'ụzọ na adịghị mma.
Nke kachacsị bụ na ọ bụ ọgwụ ike nwere ezigbote mmasị itinye mmadụ n'ọnọdụ Bekee na-akpọ "addiction".
Ọ so n'ọgwụ kachasị ejide mmadụ n'ọnọdụ a.
Ọ kachasi ejide ndi na-ese ya na ndị na-agba ya aka etu a.
O nwereike bute ọrịa umeju na ọrịa akpa ume maọbu nke ka ndị a njọ.
Ọgwụgwọ onye mkpụrụ mmiri ji aka

Ebe foto si, Australian Federal Police
Dịka e edere n'elu, mkpụrụ mmiri so n'ọgwụ na-ejidesi mmadụ aka n'ike karịa n'ụwa ugbua.
Ọ dịkwa mfe ime, dịka ndị mmadụ nwereike ime ya na be ha, nke mere o jiri jupute ebe niile ugbua.
Nke mere ọgwụgwọ ya jiri bụrụ ihe ndị ọkachamara n'ihe banyere ọgwụike bụ ndị kwesiri ibu ụzọ.
Onye nwetere onwe ha n'ọnọdụ maọbụ nwete nwanne ya gawa ụlọ ọgwụ, ebe ndị ma ihe ha na-eme ga-enye ndụmọdụ banyere usoro ọgwụgwọ.









