Illegal drug trade: Saudi Arabia na mba ndị ọzọ ga-egbu maka ọgwụ ike

Ogwu ike a nwuchiri

Ebe foto si, Press Association

Dịka ọgwụ ike bụ ihe amachịrị n'ọtụtụ mba, ndị chọrọ ịbụ ọgaranya na erughịeru ka na agba mgbere ọgwụ ndịa.

Igbo sị na agwa ntị ma ọ nụghị, egburu isi osoro isi laa.

Dịka ọgwụ ike ndi a jọgburu onwe ha, anyị ga egosi kwa mba ndị iwu ha maka ọgwụ ike na ire ya na-ama aka nke jọgburu onwe ya.

Ihe ruru mba iri atọ na abụọ nke gunyere Amerịka dere na iwu ha na ha ga-egbu onye zubatara ogwu ike n'obodo ha, mana ka ọ dị , ọ bughi ha niile na-eme ihe ha dere n'iwu.

Na agbenyeghị nkea, e nwere ụfọdụ mba na-ehibe iwu a ma meruo ya n'isi.

Ha gunyere :

Saudi Arabia

Ọkọlọtọ mba Saudi Arabia

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị mba Saudi Arabia na egbupu isi onye ikpe mgbere ọgwụ ike mara

Mba Saudi Arabia bụ mba jụpụtara na mma dịka ha ji mmanụ agbidi Chineke ji gọzie ha dozie obodo ha.

Na aka nke ọzọ, onye ha jidere na agba mgbere ọgwụ ike n'obodo ha bụ onye nwụrụ anwụ.

Iwu ha megidere ịgba mgbere ọgwụ ike.

Mara kwa na 'igbo' so na ihe ndị Saudi Arabia gunyere dịka ọgwụ ike.

IRAN

osisi esi emepụta ọgwụ ike 'Opium'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na agbanyeghi na mba Iran ji aka ike eso ogwu ike, eji Opium mara ha.

Na agbanyeghi na eji ogwuike ndị bekkee na akpọ 'opium' were mara ha, Iran anaghị emere ndị ha jidere bụ ọgwụ ike a na mba ha ebere.

Ha na ekpekarị onye ahụ ikpe ọnwụ.

Dika 'Amnesty International' kwuru "Na n'ime mmadụ 600 Iran gburu n'afo a, opekete mpe mmadụ pacent iri asatọ (81%) n'ime ha bụ maka mgbere ọgwụ ike."

Ihe na agbagwojuanya bụ na n'ime afọ 2015 ngalaba Gọọmeti Iran bụ 'Expediency council' na-ama ọkwa ka mba Iran bido kọwa ma na-erekwa ọgwụ ike.

CHINA

Ọgwụ Ike

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Na China, ọgwụ ike gunyere 'Cocaine','Opium' na Igbo.

China bụ mba kachasị egbu ndị ejidere na-agba mgbere ọgwụike kwa afọ.

Onye ndị mba China jidere bụ ọgwụike karịrị otu kilogram (1kg), ha ga-ekpe onye ahụ ikpe ọnwụ ma gbuo kwa onye ahụ.

N'agbanyeghi na ndị mba ọzọ na-arịọ China ka ha nwee obi ebere maka ndi ha jidere.

Kama China anaghị ege ha ntị.

SINGAPORE

Onye na agba mgbere ọgwụ ike a nwuchịrị

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Singapore anaghị emere ndi na-ere ọgwụ ike ebere

Singapore na-ejikwa akaike eso ndị na-ere ọgwụ ike n'obodo ha.

Onye ha jidere ji ọgwụ ike a na ekpekarị onye ahụ ikpe ọnwụ.

Site n'afọ 1991 ruo afọ 2004, Singapore ekpela mmadụ narị anọ (400) ikpe ọnwụ maka ọgwụ ike.

Ọgwụ ike ndị a gunyere 'igbo' na mba Singapore.

MALAYSIA

Ndị mkpọrọ na Malaysia

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị amara ikpe ọnwụ maka igba mgbere ọgwụ ike

Onye ndị mba Malaysia mara ikpe maka ire ọgwụ ike na enwetekari ikpe ọnwụ.

Malaysia na ahụta 'Igbo'dịka ọgwụ ike.

Onye ejidere ji opeketempe '7 Ounces', a ga-ekpe ya ikpe dịka onye na-ere ọgwụ ike.

Ọzọkwa bụ ọnye enyochara ahụ ya ma nwete ọgwụ ike n'ime ahụ ya nwere ike ị ga mkporọ opeketempe, otu afọ.

INDONESIA

Ndị anwuchịrị maka igba mgbere ọgwụ ika

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Nne na Nna na-agwaghị ndị uweojii na nwa ha na-ere ọgwụ ike ga-aga nga n'Indonesia.

Indonesia anaghị achị ebe ndị na-agba mgbere ọgwụike nọ.

Onye ahụtara ọgwụ ike n'ime ahụ ya nwere ike inweta ikpe ọnwụ.

Ndị mba Indonesia na-eji egbe egbu ndị ha jidere na-agba mgbere ọgwụ ike.

Mba ndị ọzọ nwere ike igbu onye ha jidere na-agba mgbere ọgwụ ike gunyere, Japan, UAE, North Korea, Iraq, Libya, Sudan, South Sudan na mba syria.

Lee akụko ndị ọzọ ga-amasị gị :

Lee ihe nkiri ga-amasi gị

Aha onyonyo, Ọgwụ ike Enugwu