War against drug abuse: Ihe ise ịṅụ ọgwụ ike nwere ike ime gị- Dọkịta

Ndị na-ese anwụrụ ike

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndi dibia bekee kwuru na ise anwụrụ ike na-emebi ụbụrụ isi

Otu onye seburu guff nke a kpọrọ 'cannabis' na Bekee agwala BBC Igbo na onweghị uru ọbụla dị na isi azụ.

Anselm Chukwu kwuru na o sere guff ọtụtụ afọ tupu ọ kwụsị.

O kwuru na isonyere ajọ otu nakwa ndị ajọ enyi nwere ike ime mmadụ ka o bido sewe anwụrụ ike.

Chukwu kwuru sị, "A bụ m ganja man tupu m wụsa ọwa.

1. "Ọgwụ ike ga-eme mmadụ ọgaghị arụnwụ ọrụ ọbụla bara uru."

2. "Ego gi niile ga na-aba na ya.

3. "I gaghị enweta onwe gi ma ọbụrụ na ị ṅughị ya."

Onye na-ese igbo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ise igbo adịghị mma.

Chukwu gara n'ihu kwuo na ọ bụ ya ji aka ya kpebiere onwe ya ịkwụsị ịṅụ anwụrụ ike.

N'otu aka ahụ, onye dibia bekee na-ahụ maka ndi nwere orịa isi aha ya bu Dkta Okoro Johnson Nwabueze gwara BBC Igbo na ịṅụ ọgwụ ike jọrọ nnukwu njọ.

Dr Okoro Johnson Nwabueze

Ebe foto si, Dr Okoro Johnson Nwabueze

Nkọwa foto, Dkt Okoro Johnson Nwabueze bu ọkacha mara n'ihe gbasara ọrịa isi

O kwuru na:

4. "ọgwụ ike na-emetụta ma onye na-aṅụ ya, ma ezinaụlọ ya nakwa obodo o bi n'ime ya."

5. " Ọgwụ ike nwere ike ịgbaka mmadụ isi"

Dọkịta Nwabueze bụ onye na-arụ na 'Federal Neuropsychaitric Hospital', Enugwu, kwuru na onye chọrọ ịkwụsị ịṅụ ọgwụ ike ga-ebu ụzọ nwee mkpebi n'obi ya ma gbaa mbọ gaa ụlọọgwụ ka e nyere ya aka.

Abali iri abụọ na isii nke ọnwa Juun afọ ọbụla bụ ụbochị iji dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha zeere ịṅụ ọgwụ ike.

Dịka ndị otu 'United Nations Office on Drugs and Crime' si kwuo, ihe dịka mmadu nde iri na anọ na ụma na-aṅụ maọbụ na-agba ọgwụ ike na Naijiria.

Ha kwukwara na n'ime mmadụ anọ ọbụla na-aṅụ ọgwụ ike, otu bụ nwaanyị.

Akụkọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Nigeria VS Guinea: Lee ihe ụmụ Naijiria na ekwu maka mmeri Super Eagles meriri