Imo Police Command: Anyị ga-enyocha ozu ụmụakwụkwọ e chere nwụrụ site n'ọgwụ ike

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii nọ n'Imo steeti ekwuola na ha ga-enyọcha ozu ụmụakwụkwọ mahadum atọ nwụrụ n'otu ebe obibi a kpọrọ Sunshine Hostel dị na Ihiagwa na nso Owere, Imo steeti.

Ebe foto si, Orlando Ikeokwu
E nwetara mmadụ anọ nke ndị uweojii nyere aha ha dịka; Ugochukwyu Kingsley, Aka Uche, Richard nakwa Onyinye Okafor n'ọnọdụ ọdị-ndụ-ọkwụ-ka-mma n'otu ọnụmara n'ụlọobibi ahụ ụbọchị Tuzde.
E bugara ha ụlọọgwụ ebe ndị dọkịta kwuru na abụọ n'ime ha anwụọla.
E bugara ha abụọ n'ụlọọgwụ Federal Medical Centre dị n'Owere ebe ọzọ nwụrụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Orlando Ikeokwu kọwara na ọ fọrọ ọtụ onye nke ka nọ n'ọnọdụ ọjọọ n'ụlọọgwụ mana o kweghị ekwu aha onye nke ka dị ndụ.
Na nkọwa ya, Ikeokwu kwuru na e nwetara ọgwụ tramadol, Igbo ma hụkwa ha ebe ha gba ọtọ nke na-arụtụ aka na ọnwụ ha metụtara ọgwụike iji mee ka ha dị ike nwee mmekọrịta nwoke na nwaanyị.
" Ọ bụ ndị ụlọokwụ ga-ekwute mana inye anyị na-ele anya bụ ọgwụ ike-Tramadol na igbo."
" Anyị na-ele anya na ha ṅụchara ihe ndị a ahụ, na-eme mmekọrịta nwoke na nwaanyị ka ọgwụ ike ahụ nye ha ikike ime ya n'uju."










