Sit-at-home: Etu atụmatụ a sị gaa n'Ọwụwa Anyanwụ taa Mee 2,2022

Sit at home Ebonyi

N' Ebonyi , ahịa zụrụ, ebe ndị mmadụ na-agagharịị onwe ha taa bụ Monde n'Abakaliki, isiobodo Ebonyi Steeti na mpagharị dị iche iche na steeti ahụ.

Cheta na kemgbe afọ, a na-enwe nọrọụlọ na steeti dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ na-agbanyeghị na otu nwereonwe Biafra tinyeburu mmachị ahụ ekwuola na ha amaghapụla ya bụ mmachi.

Sit at home Ebonyi

Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị na'Ebonyi steeti ahụ kwuru na ọtụtụ ụlọakụ mepere.

O kwuru na ọ bụ naanị ndị ọrụ oyibo bụ ndị agaghị ọlụ n'ihi ụbọchị ezumike nke hgọọmenti tinyere maka ndị ụka Alakuba na-eme emume Eid el-Fitri.

Ebonyi Úbóchí Monde May 2,2022
Nkọwa foto, Ebonyi ụbọchị Monde May 2,2022

Na Nnewi, Anambara Steeti

Na Nnewi, Anambara, e nweghị ngagharị mmadụ maọbụ ụgbọala.

Otu bi na-achọghị ka a kpọ aha kwuru na' "Ogbugbu mmadụ a na-egbuzi otu abalị tupu ụbọchị nọrọnụlọ e mere ka egwu na-ejide ndị mmadụ ụbọchị nọrọn'ụlọ."

Cheta na Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu, onye ndu otu nwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob na mba Kenya, kpụlata ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị.

Kemgba a malitere ikpe ya , otu Ipob tinyere nọrọ n'ụlọ ụbọchị Monde nile nakwa ụbọchị ọbụla e nwere ikpe ya.

Mana ha mechara wepụ mmachi ahụ ma tinye ya naanị n'ụbọchị e nwere ikpe ya.

Ma na-agbanyeghị nke a, egwu anaghị ekwe ndị mmadụ ịpụta ama n'ụbọchị Monde dịka ụfọdụ ndị pụtara zutere ihe ike maọbụ ọnwụ.