Charges against Nnamdi Kanu: Kedụ ebubo asatọ ụlọikpe kụchapụrụ Nnamdi Kanu, kedụ ndị ọzọ fọrọ?

N'aka ekpe Ọkaikpe Binta Nyako, n'aka nri Nnamdi Kanu
Nkọwa foto, N'aka ekpe Ọkaikpe Binta Nyako, n'aka nri Nnamdi Kanu

Ọkpụrụkpụ ihe pụtara taa bụ April 8, 2022 n'ikpe Nnamdi Kanụ bụ onye ndu Indigenous People of Biafra bụ ebubo asatọ ọkaikpe Binta Nyako kụchapụrụ n'ebubo iri na ise eboburu nwa amadi ahụ.

Nyako bụ ọkaikpe na-ekpe ikpe Kanu kamgbe 2015 anwụchirị ya na mbụ yigharịrị ikpe nke taa gaa May 17, 18 nakwa 28 nke afọ 2022.

Ebụbọ asatọ ndị ahụ gụnyere

  • Ebụbọ nke isi kwuru na Nnamdi Kanu ji redio gbasaa ozi mere ka ọha malite ịwakpo ndị ọrụ nchekwa nke Naịjirịa.
  • Ebubo nke asaa kwuru na Nnamdi Kanu ji redio gbasaa ozi mere ka ọha malite igbu ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa.
  • Ebubo nke asatọ kwuru na Nnamdi Kanu gbasara ozi ebe ọ gwara ndị otu Ipob ka ha mepụta ogbunigwe.
  • Ebubo nke itoolu kwuru na Nnamdi Kanu gbasara ozi ebe ị gwara ndị mmadụ ka ha ghasaaa ntụliaka e mere n'Anambra na November 2021.
  • Ebubo nke iri kwuru na Nnamdi Kanu gbasara ozi ebe ọ gwara ndị mmadụ ka ha gaa mebie ngwaọrụ gọọmenti.
  • Ebubo iri na otu kwuru na Nnamdi Kanu yiiri ọha egwu ma sị ha apụtala n'ụbọchị May 31, 2021
  • Ebubo iri na abụọ kwuru na Nnamdi Kanu gwara ndị ọha ka ha mee ngaghariwe megide gọọmenti etiti.
  • Ebubo iri na anọ kwuru na Nnamdi Kanu gbasara ozi ebe ọ gwara ndị mmadụ ka ha ga mebie ọdọ ụgbọala njem Lagos steeti nke butere ndatụ akụ na ụba steeti ahụ.
Nnamdi Kanu

Ebubo dị asaa Nnamdi Kanu ka ga-azara ọnụ ya

  • Nke mbụ: Gị bụ Nnamdị Kanụ, onyendụ ndị otu Ipob mere ihe ka onye ọmekatarihe pụọ ụjọ site n'iyi ndị mmadụ egwụ.
  • Nke abụọ: Gị bụ Nnamadị Kanụ, onye ndụ otu Ipob mere ihe ka onye omekataraihe pụọ ụjọ site n'ịgbasa ọzị na-eyi ndị mmadụ egwụ sita n'inye iwu ka ndị mmadụ ghara ipụ apụ.
  • Nke atọ: Gị bụ Nnamdị kanu, onye gbarasa ozi dịka onyendu otu Ipob bụ nke mba Naịjrịa machiri amachi.
  • Nke anọ: Gị bụ Nnamdị Kanu gbasara ozi sị ka ndị mmadụ malite igbu ndị ọrụ nchekwa.
  • Nke ise: Gị bụ NnamdI Kanu gbarasara ozi sị ka ndị mmadụ malite ịmaja ndị ọrụ ụweojii.
  • Nke iri na atọ: Gị bụ Nnamdị kanu gbasara ozi mere ka ndị mmadụ gbaa ụlọ na ngwongwo ndị gọọmentị etiti ọkụ na Legọs bụ nke mere ka akụnaụba gọọmentị laa n'iyi.
  • Nke iri na ise: Gị bụ Nnamdị Kanu, bubatara igwe okwu "transmitter" na nzuzo ga zoo ya n'obodo Ubulisiuzor dị n'okpuruọchịchị ihiala nke Anambra steeti.
Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

Ihe ikpe asatọ akụchapụrụla Nnamdi Kanu pụtara

Ọkaiwu Mike Ozekhome so n'otu ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu ekwuola na ebubo asaa fọrọnụ dịka akụchapụchara ebubo asatọ n'ime ebubo iri na ise eboro Kanu, achịtaghị aja ọbụla.

N'ọnụ ya, ọ bụrụ na akụchapụrụ ebubo asatọ, anyị nwere olileanya na a ga-akụchapụ ebụbọ asaa ndị ọzọ.

Ozekhome gwara ndị ntaakụkọ nke a dịka o si n'ụlọikpe ebe a nọ kpe Nnamdi Kanu ikpe taa.

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu na BBC Igbo

"Anyị ga-eleba ebubo asaa ahụ anya ọzọ ka anyị mara ma ha chịtara aja ọbụla n'iwu.

Nke a ga-eme ka anyị tulee ikpe dapụtara n'etiti FRN na Saraki ebe ngalaba Code of Conduct tribunal

Kụchapụrụ ebubo e boro ya ma hapụ ụfọdụ, ụlọikpe nke appeal mekwara otu ihe ahụ mana ụlọikpe Supreme kwuru na ebe ọ bụ na akụchapụrụ ebubo ụfọdụ na a ga-akụchapụ ndị ozọ.

"Anyị ga-anwalee ebubo ndị a fọdụrụnụ ma mee ka ụlọikpe mkpebi mara maka ya."

N'ọnụ ya, E kwesiri ịtọghapụ Nnamdi Kanu mana ọtu asị ha na-atụ mgbe ọbụla bụ na o wụfere ntọghapụ."

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi "Nwannekaenyi" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie (old Eastern State)kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru nde, atọ ,atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ya, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu(terrorist group).

Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa 'London Metropolitan University'.

Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.

A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.

O kwenyere ma bụrụ onye ofufe Judaism.