International Day Of Women Judges: Ihe dị mkpa ị kwesiri ima maka Binta Nyako bụ ọkaikpe nọ n’isi ikpe Nnamdi Kanu

Ebe foto si, FHC/Ng
Abalị iri nke ọnwa Maachị n'afọ ọbụla bụ ụbọchị otu mba ụwa bụ United Nations wepụtara dịka ụbọchị ncheta ụmụnwaanyị ndị ọkaikpe n'ụwa niile.
Ọ bụ eziokwu na ụmụnwaanyị na-ewelite isi n'ọkwa dị icheiche, mana ọnụọgụgụ ụmụwaanyị nwere agba n'ikpebi ikpe ka dị nta.
Na Naịjirịa naanị ndị ọkaikpe 23 n'ime 86 bụ ụmụnwaayị dịka akwụkwọ ozi ọkaiwu Paul Usoro zipụtara n'afọ 2020 si kwuo.
Ọ bụ n'afọ 1969 ka nwaanyị mbụ toruru ọkwa ọkaikpe na Naịjirịa, mana iji sonye n'emume nke afọ a, akụkọ a ga akọwa maka otu n'ime ụmụnwaanyị ọkaikpe Naịjirịa nwere aha ya bụ Binta Nyako.
Kedụ onye bụ ọkaikpe Binta Nyako?
Aha ya n'uju bụ Hajiya Binta Nyako.
Ọ dị afọ 63 dịka a mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Mee afọ 1959.
A mụrụ ya n'obodo Remawa nke dị n'okpuruọchịchị Rimi dị na Katisna steeti.
Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello nke Zaria, Kaduna steeti ebe ọ natara ọzụzụ dịka onye ọkaiwu ma natakwa ọzụzụ ntozuoke ndị ọkaiwu n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu nke Legọs steeti n'afọ 1981.
Ọ malitere ọrụ dịka ọkaikpe n'afọ 2000.
Binta Nyako so n'otu n'ime nwunye anọ di ya luru.
Di ya bụ Murtala Nyako bụbu gọvanọ Adamawa steeti nke malitere ọchịchị ya n'ọnwa Mee 2007.
Murtala Nyako chịbụkwara n'okpuru ọchịchị ndị agha dịka gọvanọ Niger steeti tupu ahọpụta ya dịka onyeisi ndị agha mmiri Naijiria n'afọ 2018.
Nyako bụ nwaanyị mbụ rụrụ ọrụ dịka ọkaikpe nwaanyị na Katsina steeti, ma bụrụkwa nwaanyị mbụ gbagotere n'ọkwa onyeisi ọkaikpe nke steeti ahụ.
Binta mechara gafee Bauchi steeti ebe ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ọkaikpe n'ụlọikpe steeti ahụ ruo afọ abụọ, 2015 - 2017.
Otu ọkpụrụkpụ ihe Nyako mere na Bauchi bụ na o ihere kọmitii nke zọtara nnwereonwe nye ngalaba ikpe na steeti ahụ, maọbu "financial autonomy for the judiciary" na bekee.
Otu jịkọrọ ndị ọkaiwu bụ 'Nigeria Bar Association' ajala Binta Nyako ike ugboro ugboro maka etu o sirila kpebie ọtụtụ ikpe tara akpụ na Naịjirịa.

Ebe foto si, AFP
Binta Nyako na Nnamdi Kanu
N'afọ 2015, oge gọọmenti Naịjirịa nwuchiri Mazi Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous people of Biafra (Ipob), ma kpụga ya ụlọikpe, ọ bụ Binta Nyako ka e tinyere n'isi ya bụ ikpe.
N'oge ahụ, ụfọdụ mmadụ nakwa ndị otu Ipob katọrọ nhọpụta Nyako ma na-ekwu na ọ bụ onye si mpaghara Ugwu nke bụ na ọgaghị ekpe ikpe ziri ezi.
Ụfọdụ tụkwara ya aka maka ebubo mpụ e boro di ya na nwa ya nwoke n'oge gara agbanyeghi na ọkaikpe Okon Abang nke ụlọikpe ukwu dị n'Abuja mechara kụchapụ ya bụ ikpe.
Asịrị mechara fesaa n'oge ahụ na ọkaikpe Nyako ewepụla aka n'ikpe Nnamdi Kanu, mana nke ahụ abụghị eziokwu. Ọ bụ ya ka nọkwa n'isi ikpe ahụ ruo taa.









