'Referendum' ọ dị n'iwu Naijiria? Lee ihe ndị ọkaiwu kwuru,mba ndị e merela ya

Ndị na-eti mkpu Biafra

Ebe foto si, iStock

Nkọwa foto, Ndị Ipob na-eti 'Referendum'
    • Onye dere ya, Uche Akolisa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Kemgbe afọ ole na ole okwu Biafra malitere nọwa ọkụ ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria, otu okwu ndị na-eti mkpu ikewapụ na Naijiria ọkachasị ndị otu Ipob na-akpụ n'ọnụ bụ 'Anyị chọrọ referendum".

Mana nwoke ọma, Ada Igbo, ị ma ihe referendum pụtara? Etu e si eme ya? Mba ndị merela ya na ihe iwu Naijiria na-ekwu maka ya? Soro anyị ka anyị tupenye gị azụ:

Gịnị bụdị 'referendum?

Referendum si n'okwu Latin, 'Propositum quod referendum est populo, nke pụtara, "Alọ e bughachiri ọha (ka ha tinye ọnụ)".

Referendum bụ vootu ọha ndị obodo maọbụ ndị otu mpaghara na-enwe iji kwuo ebe ha kwụ n'okwu maọbụ mkpebi pụrụ iche nke dị iche na mkpebi nke ndị nnọchiteanya ha na-enwe n'ụlọomeiwu.

Ntuliaka/Ndị na-eeti mkpu Biafra

Ebe foto si, BBC/Getty

Ọkaiwu na onye nkuzi na mahadum Nasarawa University bụ Okaiwu Chukwuemeka Ezeh kọwara dịka "okwu ka e je jụọ ndị mmadụ ihe bụ uche n'okwu tara akpụ."

Ọkaiwu Chukwuemeka Eze

Ebe foto si, Ọkaiwu Chukwuemeka Eze

Eze kwuru na ọ bụghị okwu nile ka e ji aga referendum, ọ bụghịkwanụ naanị okwu otu mpaghara ikewapụ n'obodo ha nọ bụ referendum.

Komiti na-ahazi referendum igbo na Italy

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na Brazil ihe Komiti a na-eti mkpu ya bụ ịhazi referendum iwu ịnabata igbo na Italy

"Ọmụmaatụ, okwu iwu ụmụnwaanyị inwe ohere iwepụ afọime na mba ndị Katọlik katara ahụ, okwu iwu na-akwado iwepụ afọ na-adọta nnukwu okwu nke ọ bụ ihe dịka referendum ka e ji ekpebi ya."

Etu e si eme referendum?

Ụlọakwụkwụ Praịmarị nke New Haven
Nkọwa foto, Ụlọakwụkwụ Praịmarị nke New Haven

Referendum dịka ịtụ vootu nkịtị mana ana-akpọ ya aha ihe ọ bụ n'ihi na ọ bụghị ntuliaka nke ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ezeh kọwara na, "A na-ajụ ya ka ajụjụ, nye ndị mmadụ ohere ị họrọ "Ee" maọbụ "Mba".

Kedụ ndị ọ bụ ọrụ ha hazị referendum?

Ndị ọrụ Inec

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ọrụ Inec na-ahazị ntuliaka nwere ike inweta ikike

Ọkaiwu Eze kwuru na iwu hiwere referendum na-etinye ndị ga-ahazi referendum.

"E nwere ike a sị ka enweta Referendum Commission maọbụ etu a Naijiria dị, a sị ka enye ya ndị Inec ka ndị Inec rụọ."

Kedụ onye tozuru ịtụ referendum?

Igwe card reader eji eme ntuliaka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ejighị 'Incident Form' ga-akwụsị nrụrụaka na-aga na ntuliaka

Ọ bụ ndị ruola afọ 18 ma debanyekwa aha dịka ndị na-atụ vootu n'obodo.

Ọkaiwu Eze sị, "Ọ bụ ndị na-atụnwu vootu bụ ndị na-eme referendum."

Mba ndị merela referendum

Brexit

Ebe foto si, Getty Images

  • Briten: Na 'Juun 23, afọ 2016 ụmụafọ Briten tụrụ vootu referendum iji kpebie ma ha chọrọ ịpụ na 'European Union' ka ha aga-anọ nke ha kpọrọ "Brexit" n'ịchafụ.
  • Scotland: N'otu United Kingdom ahụ, n'afọ 2014, e nwere referendum ebe ndị Scotland gara tụọ vootu ma ha a chọrọ ịnọsi ike na United Kingdom ka ha chọrọ inwere onwe ha.
  • East Timor nwere onwe ha n'aka mba Indonesia dịka ha mechara referendum n'Ọgọstụ 30, afọ 1999 (East Timor nwetaburu nnwereonwe n'afọ 1975 mana ọgbaghara dapụtara n'ime ha nke mere Indonesia ji wegharakwa mba ahụ ma mee ka ha sụwa asụsụ ha).
  • Taiwan: N'afọ 2021dị Taiwan tụrụ referendum n'okwu anọ; azụmahịa (imachị ịtụbata anụ ezi), iwu metụtara gaasị, iwu maka gburugburu nakwa iwu ga-amazi referendum"

Ọ dị n'iwu Naijiria?

Ụlọomeiwu Naijiria

Ebe foto si, Nigerian Senate-Facebook

Okaiwu Maxwell Udechukwu na Chukwuemeka Eze kwuru na Iwu Naijiria ka ọ dị ugbua akwadoghị referendum.

Okaiwu Eze kọwara na referendum dịbụ n'iwu Naijiria oge Naijiria nweere onwe ya tupu ndị agha eweghara ọchịchị n'afọ 1966.

O kwuru na iwu niile e mere na Naijiria kemgbe 1979 kụpụrụ referendum na ya.

"Ugbua enweghị ohere maka referendum. "Ọ dịbụ n'iwu Naijiria, na "Independence Constitution".

Ụlọomeiwu ukwu na nke nta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụlọomeiwu ukwu na nke nta.

"Anyị (Naijiria) na ndị Southern Cameroon (ndị ebe Bakassi nọbu). Mana ha mechara sị na ha achọghịzị."

"Ọ bụ ya ka e ji mee referendum e mere na 1961, kenye ha ndị Cameroon."

O kwukwara n'Adamawa nakwa Mubi sobu na Cameroon mana ha kwuru na ha chọrọ isonye Naijirịa.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị