Etu ije 'Evans' a tụrụ nga mkpụrụ ọka n'ụbọchị Fraịde siri malite

Ebe foto si, Getty Images
N'ikpeazụ, a tụọla Chukwudumeme Onwuamadike a ma dịka 'Evans' nga mkpụrụ ọka dịka Ụlọikpe Ụkwu dị na Lagos steeti kpebiri na ikpe mara ya bụ nwamadi n'ebubo ịtọrọ Donatus Dunu, bụ onye nwe ụlọọrụ Maydon Pharmaceuticals Ltd.
Mkpebi a nke Jọstis Hakeem Oshodi nyere na-abịa afọ anọ a malitere ya bụ ikpe.
Anwụchiri Evans n'ọnwa Juun afọ 2017 ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo igbu ọtụtụ mmadụ, inwe egbe na mgbọ egbe, nakwa ịtọ ọtụtụ mmadụ.
Jọstis Oshodi tụkwara ndị otu Evan's mmadụ abụọ bụ Uche Amadi na Okwuchukwu Nwachukwu, nga mkpụrụ ọka ma sị na kama mmadụ atọ ndị a ga-ekweta na ha mejọrọ na ha gbara isi akwara na-atụ asị n'elu asị.
Ọkaikpe hapụrụ Ogechi Uchechukwu, Chilaka Ifeanyi, Victor Aduba, na otu onye agha sị na ikpe amaghị ha.

Ebe foto si, Kayode Oladapo/NAN
Oge a nwụchiri ya, Evans gwara ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ etu ya na ndị otu ya si anapụ ndị mmadụ akatamkpo ego.
Mana n'afọ 2018, Evans kwugharịrị na o nweghị mgbe ọbụla o jiri ọnụ ya kwupute na ya bụ onye ntọ.
O kwuru na ọ bụ mmanye ka ndị uweojii manyere ya ikwete na ya mere ihe ya emeghị.
Ndị boro ebubo na ha danyere n'aka Evans'
Dịka a kpụpụrụ Evans ụlọikpe, ọtụtụ ndị mmadụ gbara akaebe na Evan tọọrọ ha ma napụ ha nnukwu ego.
Ha gụnyere:
- Sylvanus Ahamonu, boro ebubo n'Ụlọikpe na Evans na ndị otu ya tọọrọ ya napụ ya $420,000
- Uche Okereafor kwuru na Evans tọọrọ ya na Festac, Legos n'abalị 21 Novemba afọ 2017, ma manye ya ka ọ kwụọ nde dọla abụọ iji gbara isi onwe ya
- Mr. Mbarikatta William Uboma, a tọọrọ na Festac Town na June 16, 2012, napụta ya N20 million
- Mr. Paul Cole onye Ohafia n'Abia Steeti a tọọrọ 'onwa Ọgọstụt 23, 2012, na Festac Town napụta ya N20m
- Francis Umeh, a tọọrọ na Julaị afọ 2016 na Raji Rasaki Estate di na Legos naputa ya otu nde dola($1m.)
- Maazi Randeki, bụ onye a tọọrọ na Benin City n'afo 2010 ji 30m gbara isi onwe
- Mr. Ohunyon Ernest a tọọrọ na Nọvemba 2011 n'Edo steeti ji N85m gbara onwe ya
Ubochi niile bụ nke onye ohi mana otu ụbọchị bụ nke onwe nwee ụlọ

Evans kpara ike otutu afọ ma memilaa ọtụtụ ndị nwụrụ n'aka ndị ya na ndị otu ya.
Isi-agbọ-ncha ahụ ndị uweojii kọwara dika ekperima nwere akọ na uche mịlahụrụ ndị uweojii ọtụtụ afọ.
Mana iko Evans juru oge ya na ndị otu ya tọọrọ Donatus Dunu, onye 'pharmacist' mabụrụkwa onye na-atụbata ọgwụ n'ọnwa Febụwarị 14, afọ 2017, n'Ilupeju Legos steeti.
Ha napụtara ezinaụlọ nwaamadi ahụ nde naira 150 (N150m) ma jụ ịtọhapụ ya.
Evans gbara isi akwara na ha ga-ewetakwu nde narị naira atọ (N300m).
Dịka ha jichiri nwoke ahụ onwa atọ, chi ya nyere ya ohere ịgbapụta n'ebe ha jichiri ya n'Igando, Legos.
Ndị uweojii mara imi n'ala ma sipụta Evans n'ụlọ ya n'abalị 10 nke ọnwa June afọ 2017.
Etu a ka aka si mecha kpara Evans bụ ikuku ama n'ọnya.
Onye bụdị Evans?

Chukwudi Onwuamadike bụ nwaafọ Nnewi dị n'okpuru Ọchịchị Nnewi-North, Anambara steeti, bụ onye a ma dịka "ọgaranya onye ntọ".
N'ịza ajụjụ ndị ntaakụkọ jụrụ ya oge e jidere ya ọhụrụ n'afọ 2017, Evans kwuru na ya anaghị eme ntọ obere ego.
Ndị uweojii chọrọ ya afọ anọ maka ntọ, iji egbe ezu na mkpamkpa ọ kpara na steeti atọ; Legọs, Anambra na Edo steeti ma mecha nwụchie ya n'ụlọ ya n' Magodo, Legọs dịka ọ na-akpa nkata iwụ ọsọ gbaga mba ọzọ.
N'otu mkparịtaụka Evans na ndị ntakụkọ nwere,ọ gbara ama na ya nọbu n'Anambara steeti akpa ike tupu Gọọmentị Anambra steeti oge Peter Obi ewere iwu megidere ntọ mee ka steeti ahụ sara ọkụ megide ndị ji ntọ mere ọrụ.












