Nwayọ nwayọ, ịkwa baro emeela m ọgaranya
Chukwuma Ezeh bụ nwa okoroọbịa na-ekweghị ka ihe ọdachị gbochie ya ime ihe ọ chọrọ ime.
Akụkọ ihe onyonyo a ga-akọwara gị etu nwata nwoke a siri bido ahịa ịkwa baro ma site na ya bụ ihe bulie ọtụtụ ndị nroroọbịa siote n'ụbịam pụta.
Na "Igbo Amaka" abụghị n'ọnụ, ọ bụ n'ọmume.

Ebe foto si, Chukwuma Ezeh
Ọ bụghị sọ ahịa ịkwa baro ka Chukwuma bidoro iji nye ndị ntorobịa ọrụ, ọ mepekwara ụlọọrụ ebe a na-agba ihe ọkụ, nke bekee kpọrọ 'welding'.
Ụlọọrụ a nyekwara ọtụtụ ndị ntorobịa ọrụ, ma bụrụkwa ụzọ ọzọ na-etinye Chukwuma ego n'akpa.

Ebe foto si, Chukwuma Ezeh
Ugbua, Chukwuma nwere ụlọọrụ ọhụrụ bụ nke ọrụ ha bụ ime ndị mmadụ obi ọma.
Gere akụkọ ya n'uju n'ihe onyonyo dị n'elu.
Ndị mere akụkọ a bụ Vining Ogu na Chigozie Ohaka
