Bruce Fein vs Ifeanyi Ejiofor: Lee ihe butere esemokwu n'etiti ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Bruce Fein/LinkedIn
Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor asaala ebubo ọkaiwu nke si mba Amerịka bụ Bruce Fein na-ebo ya.
Akwụkwọ ozi Fein zigara Ejiofor pụtara na soshal midia n'ụbọchị Tọọzde.
Ya bụ akwụkwọ ozi gwara Ejiofor ka osepụ aka n'ikpe Nnamdi Kanu ngwa ngwa n'ihe na aka ya adighị ọcha ma ncha.
Ejiofor sara ya sị:
"Kedụ ka i ga-esi chụpụ onye were gị n'ọrụ n'ọkwa oche ya?"
"Onye nyere gị ikike ime nke a?"
Ejiofor gara n'ihu kwuo na Fein enweghi ikike ịrụ ọrụ dịka onye ọkaiwu na Naịjirịa n'ihi ọnataghi akwụkwọ ikike si n'aka ngalaba ndị ọkaiwu nke Naịjirịa bụ "Nigerian Bar".
Ejiofor kwukwara sị na ọ bụ naanị ma ọ bụrụ na akpọrọ ya oku pụrụiche ịrụ ya bụ ọrọ nke ya bụ Ejiofor mere n'oge gara aga.
Ọ kọwara na ọ ma na ihe nwereike ịbụ iwe Fein ugbua bụ na ọ nwebeghị ike hụ Nnamdi Kanu kamgbe ma n'ụlọikpe maọbụ n'ụlọ nga ndị ụlọọrụ Department of State Services (DSS).
O kwukwara na Fein ebola ya ebubo kwa mgbe kwa mgbe na ọ bụ ya mere ọ hụbeghị Kanu mana Ejiofor kwuru n'akwụkwọ ozi ya na nke a bụ akụkọ ugha.
Ejiofor gosiri BBC Igbo akwụkwọ ebe Fein toro ya n'afọ 2021 maka etu o si arụsị ọrụ ọma ike n'ikpe Kanu.
O kwuru na ozi ọhụrụ a bụ ozi mmaja bụrụkwa nkata Fein na-akpa ịhụ na etetọrọ aha ya.
Akwụkwọ ozi ahụ Fein zigara Ejiofor nke o gosiri BBC gbara ama emelụ ebe otu akwụkwọ ozi nke o kwuru na Fein zitere ya kọpụtara akụkọ etu Ejiofor si kwụrụ chim n'ibuso gọọmentị Naịjirịa agha n'okwu mmegbu Kanu nakwa ndị ọkaiwu n'afọ 2021.
Akwụkwọ ozi kọpụtara ọtụtụ otiti nye Ejiofor.
Ejiofor onye gosiri BBC Igbo akwụkwọ ozi kwuru na ebe Fein etu o si na-agba mbọ n'okwu Kanu, kedụzị ihe mere o ji ekwu ihe ndị a ọ na-ekwu maka ya ugbua?

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor
Kedụ ka okwu a si malite?
Bruce Fein so n'otu n'ime ndị ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) nke Naịjirịa gọọmentị ji eji kamgbe afọ 2021.
Fein bụ onye mba Amerịka.
Ejiofor gosiri BBC Igbo n'ụbọchị Tọọzde akwụkwọ e ji kpọọ Fein oku itinye aka n'okwu Kanu.
Fein zipụtara ozi kwuru na Ejiofor na-achịnye aja na garri ikpe Kanu.
O kpuhere ikpe otu nwoke o kwuru aha ya bụ Okpala Comas Ikechukw gbara Ejiofor.
Ebubo okwu kwuru na Ejiofor si n'ụzọ aghụghọ napụ ya bụ nwoke ego ruru N5,600,000.00 nke ngalaba na-ahụ maka ndị si n'ụzọ aghụghọ napụ ndị mmadụ ego bụ Economic & Financial Crimes Commission (EFCC) ma maka ya.
N'okwu ya, ọ sị na ya bụ ikpe nwereike imebi mpụtara ikpe Nnamdi Kanu.
Ejiofor zara na ya bụ ikpe achitaghi aja n'ihi ikpe ahụ bụ akụkọ imebi aha ya.
O kwukwara na ọ kpụpụla nwoke ahụ chọrọ ima ya ikpe ahụ ụlọikpe.

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor
Akwụkwọ ozi Fein gara n'ihu kwuo na Ejiofor agwaghị Kanu maka ikpe a nọ n'isi ya nke mere o ji dụọ ya ndụmọdụ ka ọ rịọ Kanu mgbaghara maka etu o si chọrọ imebi mpụtara ikpe ya.
Fein bokwara Ejiofor ebubo na ọ kpachanya hapụ ikwupụta ikpe a nọ n'isi ya agbanyeghị na o nwereike ikposa ikpe Nnamdi Kanu.
Fein kọwara na Ejiofor mere nkea n'ihi ọ na-eche na e nwereike ịgbaghara ya.
Ejiofor n'isa ya bụ ebubo kwuru na Fein ma ebumnobi ọ nwere mere o jiri malite ibuso ya agha ugbua mana ọ ga-asa ya n'oge na adighị anya.
Cheta na akpọrọ Bruce oku isonye n'ikpe Kanu n'afọ 2021.
Fein ekwupụtala kwa mgbe kwa mgbe etu anaghi ekwe ya hụ Kanu n'ụlọikpe maọbụ n'ụlọ nga etu o kwesiri dịka ọ bụ onye ọkaiwu ya.








