Chioma Akpotha: Mgbasa ka mma karịa ịtụnye ndụ gí n'alụmdi tigbuo-zọgbuo

Aha onyonyo, Mkparịtaụka BBC Igbo na Chioma Akpotha

Nwaada Igbo ji eme ọnụ n’ọrụ ejije Nollywood bụ Chioma Akpotha gwara BBC Igbo ọkpụrụkpụ ihe olemoele banyere ndụ ya, ọrụ ya, alụmdịannwunye nakwa ihe ndị o kwenyere na ndụ a.

Na mkparịtaụka a pụrụiche nke e nwere n’afọ 2018, ọ kọrọ akụkọ etu o si chọọ ịbụ onye a ma ama malite oge ọ dị na nwata.

Ọ kọkwara etu o si ejikọlata ezinụlọ ya iji zeere ụfọdụ akụkọ ọjọọ a na-anụ gbasara ndị a ma ama maọbụ 'celebrities' na bekee.

Akpotha kọwara na ịrụ ọrụ dịka onye ejije ga-eme ka ọtụtụ ndị mmadụ na-achọ asịrị n’ime be gị, nke mere o ji kwuo:

“Ọ bụghị nsogbu niile ị na-enwe n'ezinaụlọ gị ka ị ga-ewepụta ka ọha tinye ọnụ”

"E nwere ihe ndị naanị gị na ndị be gị kwesịrị ima maọbụ hụ."

Anyị jụkwara ya ihe kpatara na ejije e mere n'asụsụ Igbo ji dị nta n'ọnụọgụgụ.

O kwuru sị: "Uru ego adichaghi na-ime ihe onyoonyo nke asụsụ Igbo maka na ọtụtụ mmadụ anaghị enwe mmasị na ha".

Kirie ihe onyoonyo a ka ịmara etu Akpotha si banye ọrụ ejije Nollywood nakwa ihe ndị ọzọ.

Onye bụ Chioma Akpotha?

Chioma Akpotha

Ebe foto si, Nstagram/Chioma Akpotha

Nwaada a na-arụ ọrụ dịka onye na-eme ejije na Nollywood ma na-ahizịkwara ndị ọzọ ejije.

Ọ dị afọ 42 ugbua.

Agwa ọ kpara n’otu ejije nke ọ mere n’afọ 2007 nke akpọrọ “Sins of the flesh” riteere ya nturuugo Africa Movie Academy Award n'afo ahụ.

O ritekwala ọtụtụ nturuugo n'ọrụ ya dịka onye na-eme ejije.

Chioma Akpotha onye na-eme ejije na Nollywood

Ebe foto si, Chioma Akpotha

Nkọwa foto, Chioma Akpotha onye na-eme ejije na Nollywood

Akpotha bụ onye Oraifite nke Anambra steeti mana a mụrụ ya na Legọs steeti.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Legọs steeti ebe o nwetere ọzụzụ n’ọrụ ụlọakụ.

Taa, Akpotha so na ndị aka ochie n’ọrụ ejije Nollywood.

N’afọ 2019, Akpotha malitere atụmatụ ikuziri ndị nwere mmasị n’ịmụta ọrụ ejije etu esi eme ya bụ ihe.

Na nso nso a, o ji akara soshal midia, ọ kachasi nke Tiktok na-eme ndị mmadụ obi ọma, ekwupụta uche ya n’ụzọ pụrụiche ma na-akuzikwa ihe.

Ihe i kwesịrị ima maka Nollywood

Ejije Nollywood

Ebe foto si, Getty Images

Nollywood bụ ngalaba na-ahụ maka mmepụta na nhazi ihe ejije na ihe onyoonye egwuregwu nakwa ihe ịkpa obu aṅụrị na Naịjirịa.

E wepụ ngalaba ejije mba Amerịka bụ Hollywood, na nke mba India bụ Bollywood, Nollywood nke Naịjirịa bụ ngalaba ejije nke atọ a kacha anụ aha ya n'ụwa niile.

Atapịala ọtụtụ ejije Nollywood n’ọtụtụ asụsụ mba ụwa dị icheiche.

Ịntanetị na teknuzu eji ekesa ejije, a na-akpọ “Streaming platforms”, enyela aka nke ukwu ịgbasa ejije Nollywood ma mee ya ka ọ kawanye mma.

Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo.