Maternal home in Igbo culture: Ebe ọsọ ndụ, ọsọ ọchụ na uru ndị ihe ndị ọzọ ikwu nne ga-emere onye Igbo

Igbo na-asị, "ọsọ chụọ nwata, ọ gbaga ikwu nne ya".
Ndị Igbo ejighị nne egwu egwu nke mere na ikwu nne, bụ ebe mgbaba nwa afọ Igbo ọbụla n'oge nsogbu.
Ndị Owere na ụfọdụ ndị si mpaghara ahụ na-akpọ ya, 'imere nne' mana ọtụtụ na na-akpọ ya 'ikwu nne' nke pụịtara 'ikwu si n'aka nne.'
Mana gịnị ka ọ pụtara?
Gịnị bụdị ikwu nne?

Ikwu nne, bụ ebe nne mmadụ si were bịa.
Na nkọwa ya, otu onye omenala Igbo doro anya bụ Edy Nwangene kwuru na "Ikwunne bụ obi nne onye siri pụta."
"Ikwu nne bụ obi nke abụọ nwata na-enwe. Nke mbụ bu obi nna ya."
Nwagene kọwakwara na naanị onye nne ya gara di bụ onye na-enwe ikwu nne.
O kwukara na onye a mụrụ na mkpuke enwegh ikwunne.

O kwukwara sị na nkwenye Igbo bụ na ụfọdụ nwata na-esi na ikwu nne ha alọ ụwa nke mere na ihe na-adabara ụfọdụ na ndị ikwu nne ha karịa ikwu nna ha.
N'Igbo, nwata bụ nwadiala n'ikwu nne ya; ndị ikwu nne ya ndị nwoke bụ ''nna ochie''; ebe ụmụnwaanyị bụ ''nne ochie".
Lee ụzọ ikwu nne sị baara ndị Igbo uru:
1. Ịgba ọsọ ndụ
A na-emegbu nwata n'ezinaụlọ, ikekwa n'ihi na nne na nna ya anwụọla, maọbụ maka na ọ bụ naanị otu nwa, ebe ọ ga-agbaga ọsọ ndụ na-abụkarị ikwu nne ya.
Nze Nwangene kọwara sị, "Ihe hịawa gị ahụ, ị lawa ikwu nne gị."
2. Ọsọ ọchụ

Nwanne igbu ibe ya bụ nsọala n'ala Igbo.
Oge gboo, mmadụ gbuo ibe ya na amaghị ama, omenala ji ya na ọ ga-agba 'ọsọ ọchụ.'
Ọtụtụ mgbe, naanị ebe e nwere ike ịnabata onye dị etu a bụ ikwu nne ya.
N'akwụkwọ Chinua Achebe dere ọ kpọrọ 'Things Fall Apart', Okonkwo na ezinaụlọ ya gbagara Mbanta bụ ikwu nne ya ebe ha nọrọ afọ asaa n'ihi na o gburu onye ụmụnna ya na-amaghị ama.
N'otu aka ahụ, onye mara ụma gbuo ibe ya, a chụpụ ya n'obodo, ọ na-agbalakarị ikwu nne ya n'ihi na ikwu nne anaghị ajụ nwa nwanne ha ma ọ dị njọ ma ọ dị mma.
Mana Nwangene gbaghara nkwenye a.
3. Iketa ala,osisi dị mkpa nakwa akụnaụba dị ọzọ

N'ala Igbo, naanị n'ikwu nne mmadụ bụ ebe mmadụ nwere ike iketa ala na-abụghị n'ezinaụlọ nna ya.
N'Abịriba na Ọhafia, ụmụaka na-eketa ala n'ezinaụlọ nne ha si pụta.
N'omenala a, ụmụnwaanyị anaghị eketa ala, mana Abiriba ebe omenala ikwu nne a dị, ụmụnwaanyị nwereike iketa ala n'ikwu nne ya.
4. Inye ndụmọdụ

Uru ọzọ ikwu nne na-abara mmadụ bụ ịgbaziri nwata na-efu ụzọ maọbụ na-akpa agwa ọjọọ.
Ụfọdụ oge a na-ezigakwa nwata dị isi ike ikwu nne ya ka ha zụọ ya.
Eddy Nwangene kọwara na 'nwata na-asa ụsa, nwata na-akparị ndị okenye, nwata na-anyụ mammiri n'ụlọ, a na-akpọla ya ikwu nne".
"Nne ya begara ndị ikwu nne ya akwa gbasara nwa ya. Ụmụọkpụ ga-abara ya mba, ndị okeọha ga-adụ ya ọdụ."
"Ọ bụrụ na o kweghị anụ ndụmọdụ, a gọrọ ya ọfọ, ọ nụghị, e dunye ya ndị okorobịa ha dụọ ya aka."
Ọ kọwara na ụbọchị ọzọ nwata ahụ mee ihe ahụ ọzọ, nne ya erotere ya ihe ọ gabigara.
"O cheta ihe ọ gabigara n'aka ndị ntorobịa ikwu nne ya, ọ chebaa echiche ime."











