August Meeting: Ị ma etu nzụkọ ụmụnwaanyị a pụrụiche si bido?

- Onye dere ya, Jessica Nwankwo
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, BBC Igbo, Lagos
Kwa ọnwa Ọgọst afọ ọbụla ụmụ nwaanyị Igbo bi n'ebe dị icheiche na-alaghachite n'ala Igbo izuko.
Nzụkọ ahụ na-akpọlata ha bụ nke e ji "August Meeting" mara.
Ọ bụ ebe ha na-akpa ma na-ahazi ọdịmma obodo, ikpezi esemokwu nakwa iwulite ndị ntorobia nakwa ụmụ nwaanyị ibe ha.
O nwekwara ihe ndị pụrụiche eji a ma nzụkọ ahụ.
Ha gụnyere:
- Ejiji: O nwere ejiji pụrụiche bụ akwa ọcha nakwa ukwu akwa abụọ
- Ịtụ ụtụ ego ha ji enyere obodo ha aka
- Ịda nha maka abịaghị n'oge nakwa abịaghị chaa chaa.
- Ịrikọ nrị ọnụ
- Ịkpezi udo n'etiti ndị na-ese okwu.
Etu Nzukọ a si malite

Ebe foto si, Getty Images
Nzụkọ Ọgọst a gbadoro ụkwụ na nzụkọ ebidoro na mba Briten n'afọ 1876 nke mechara bụrụ 'Mother's Union'.
Lady Joy Nwankwo bụ onyeisi ndị nzukọ ụmụnwaanyị nke ụlọụka dị na Ndiowu dị n'okpuruọchịchị Orumba North nke Anambra steeti kọwaara anyị maka nke a.
Ọ sị "nzukọ ụmụnwaanyị nke ụlọụka malitere n'afọ 1876, dịka Mary Summer bụ nwunye otu ụkọchukwu kpokọbara ụmụnwaanyị ibe ya ma kuziwere ha ihe"
"Nke ahụ bụ maka iwulite ezinaụlọ nakwa ịzụ ụmụaka nke ọma mana ugbua, ọ ghọrọla ụzọ e ji ekpezi esemokwu nakwa ịnyere ụlọụka aka"
Ebe ahụ ka ụlọụka ndị Anglịkan si kpọkọzie nzụkọ ụmụnwaanyị ahụ ma kuziwere ha ilekọta obodo ha na, ịlekọta ezinaụlọ ha ọ kachasị ụmụ agbọghọ.
Lady Nwankwo kọwakwara na ha na-enye enyemaka ego nakwa enyemaka idozi ụfọdụ ihe n'ime obodo.
"Ọ bụ nzụkọ ụlọụka bu ụzọ tinye nzụkọ n'ọnwa Ọgọst n'ihi na ọ bụ mgbe ahụ ka ụmụaka na-enwe oge ezumike nke mere ya mfe ka ndị nne mara ebe a ga-akpọsa ha"
"Ndị obodo mechara tinyezie nke ha n'ọnwa Ọgọst ahụ kwa maka etu o si daba ọfụma" ka ọ kọwakwara.
N'obodo ya bụ Ndiowu nzụkọ ụmụ nwaanyị ahụ arụọla mposi, rue ụlọ ebe ụkọchukwu bi ma nye ụlọụka onyinye otu nde naira iji gboo mkpa dịrị ha.
Mmepe batarala n'ala Igbo maka nzụkọ a

Ebe foto si, Facebook/Nnarambia Women
Ị jụọ ase n'obodo dị icheiche, ị ga-ahụrịrị opekatampe otu ihe gbara ọkpụrụkpụ nzụkọ ụmụnwaanyị a wetara.
Dịka ihe ndị ha na-etinye anya na ya metụkarịrị ụmụ aka nakwa ụmụ agbọghọ, ha na-emepụtakwa ihe n'obodo.
Dika Lady Nwankwo si kwuo, n'Ekwulobia bụ obodo dị n'okpuruọchịchị Aguata n'Anambra, nzụkọ ụmụnwaanyị rụgharịrị ụlọọgwụ obodo ahụ na-adakpọ adakpọ.
Ha rụgharịkwara ọgba aja gbara ụlọọgwụ ahụ okirikiri ma tinyeso ndị dọkịnta ga na-elekọta ndị mmadụ anya.
Onye ọzọ bụ Amuche Nnabueze so n'otu nzụkọ ụmụnwaanyị n'Ukehe dị n'Enugwu steeti kọwara na nzụkọ mere ihe ndị a:
-A lụrụ ọgụ ịkwụsị ọgwụike, mmanya ọkụ n'obodo ha n'afọ 2015.
-Ha machiri ndị mmadụ ịkwa akwa n'akwamozu mmadụ karịa ndị onye ahụ mụrụ n'afọ. Kama ha na-akwa akwa mgbe onye ahụ dị ndụ nke pụtara ịkwa onye ahụ ebe ọ dị ndụ
-Ha azụọla ihe ruru mmadụ iri na Mahadum ma na-azụkwa ihe karịrị mmadụ ise n'efu na Mahadum nakwa ụlọakwụkwọ sekọndrị.
-Ikuziri ndị nne na nna ilekọta mbara ebe ha bi n'afọ 2021.













