Udeh Chiamaka Victoria: Ihe mere m ji fee ọkọlọtọ Naijiria bu ọbara
Udeh Chiamaka Victoria, nwada Igbo nọchitere Naijiria n'asọmpi 'Miss Africa Russia' ekwuola na ihe mere o ji ọkọlọtọ Naịjirịa ọbara gburu bụ iji chetere ụwa ihe mere na Lekki Toll Gate Legọsị n'abali iri abụọ nke ọnwa Oktoba afọ 2020.
O kwukwara na o ji nke a iji rụtụ aka n'etu ọnọdụ nchekwa sị kwuru ugbua na Naijiria.
Nwada Chiamaka Ude, onye Anambara steeti wuru ewu na soshal midia abali ole na ole gara aga dịka onyonyo ebe o fere ọkọlọtọ Naijiria bu ọbara n'asọmpi "Miss Africa Russia nke afọ gbara n'ịntanet.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere ụbọchị Tọzde n'ikuku, Chiamaka, kwuru na ọ bụ isi ụwa bịa lele ihe mere ihe mere na Lekki Toll Gate n'afọ 2020, ọnọdụ oke ogbugbu mmadụ na ịwakpo ụmụnwaanyị na-eme na mpaghara di iche iche na Naijiria na-eri ya nri n'afọ.
"E ji ohere e nyere m iji gosi ụwa ihe na-eme na Naijiria."
"Ọ bụ iji gosi ihe mere n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Oktoba (afọ 2021) nakwa nke na-eme ugbua; aka na-egbusisi ndị mmadụ, nsogbu nchekwa ka na-aganihu.
Udeh, onye gbara ama na ya kiriri ihe mere na Lekki Toll Gate intanet butere ya nsogbu ahụike nke Bekee kpọrọ 'Post Traumatic Stress Disorder" kwuru na o nweghị onye manyere ife ya bụ ọkọlọtọ.
O kwuru na ya amaghị na ya bụ ihe onyonyo ga-ewu ewu, were gaa n'ihu sị,"Ihe mere si m n'obi. O nweghị onye gwara mee ya."
Nwada ahụ rụtụrụ aka na ọtụtụ eziterela ya ozi ịyi ya egwu maọbụ maja ya, ebe ụfọdụ na-akatọ ya mana na ya anaghị ata onwe ya ụta na ya mere ihe ya mere n'ihi na ọ bụ obi mwute kpaliitere ya.
Ihe ndị mmadụ kwuru maka etu o si fee ọkọlọtọ Naijiria na Russia

Ebe foto si, MissAfricaRussia/Udeh Chiamaka
Ụmụ Naijiria nọ na sọshal midia ajaala Nwada Udeh Chiamaka Victoria maka 'ịka obi' fee ọkọlọtọ Naịjirịa ọbara tere n'asọmpi ọkachamma bụ "Miss Africa Russia" nke e mere n'abalị 13 nke ọnwa Juune afọ 2021.
Nwada Udeh wuru na soshal midia dịka ihe onyonyo ebe o fere Ọkọlọta Naijiria ọbara gburu n'asọmpi ahụ gbara n'ịntanet ụbọchị Tusde.
Ọtụtụ kwuru na obi kara nwada.
Eugenia Cletus sị, "Agụ nwaanyi, i mere nke oma. Daalụ".
Efes Efes sịrị, "O meele nke oma. Jide ka i ji, nwaanyị ọma ọsịsọ."

Ebe foto si, Chiamaka Udeh/Miss Africa Russia
Charles Ifeanyi Nnamani sịrị, "O mere nke oma. Ana m agba mbo n' ala Igbo n' ụzọ kwụ ọtọ. Ụfọdụ oge m zute ndiagha Naijiriaia, ụjọ abịa m n'ahụ n' ihi etu ha si egbu ndi be anyi na nkiti."
Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru na ya bụ ihe onyonyo gbara ha anyammiri dịka o chetara ha ihe Naijiria na-agabiga ugbua dịka ogbugbu mmadụ na tigbu-ozogbuo na-arị ibe ya elu.
Ogochukwu Okoye Clara sị, "Ihe nke a gbara m anyammiri. Chai nwagbọghọ a kara obi!"

Miriam Uche Abara sị na "m lechara ihe onyonyo ahụ, m nọrọ ala bewe akwa. Naanị ajụjụ m na-ajụ onwe m bụ kedụ etu anyị si rute ebe a?".

Ndubuisi Augustine kwuru na "Eziokwu ka o kwuru, anyi nile mara nke oma."
Ment Okoye kwuru "Nwada Chiamaka, otito na-ada n'ubọchi taa maka ngosi nke i gosiri mbaụwa etu ọnọdu Najiria si debe imi na ọnụ n'ụbọchị taa. Daalụ."
Ụfọdụ kwuru na o chetara ha maka ihe mere na ngagharịiwe EndSARS ebe ndịagha Naijiria gbagburu ihe karịrị ndị ntorobia iri na-eme ngagharịiwe Endsars.
Mana ụfọdụ katọrọ nwata nwaanyị ahụ nọ n'afọ anọ na mahadum na Rọshịa ebe ọ na-agụ maka ọgwụ Bekee.
Udeh Chiamaka Victoria: Ihe mere Nwada Igbo ji ewu na soshal midia

Ebe foto si, Udeh Chiamaka Victoria
Otu nwa ada Igbo aha ya bụ Chiamaka Victoria Udeh ewuwala na soshal midia maka ife Ọkọlọta Naijiria ọbara gburu n'asọmpi "Miss Africa Russia iji gosi etu ihe siri kwụrụ na Naijiria ugbua.
Miss Africa Russia bụ asọmpi onye ka ibe ya mma nke ndị isiojii Afrịka bi mba Rọshịa na-eme kwa afọ na Moscow, isiobodo ahụ ji kwalite ọdịnala Afrịka.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
N'ihe onyonyo ahụ na-efegharị na Soshal midia, Nwada Udeh fere ọkọlọta ọbara ahụ gagharịa n'elu ogongo e mebere maka ndị na-asọ mpi ahụ igosi onwe ha na ihe ha jiri biri n'agba nke ikpeazụ asọmpi ahụ mere ụbọchịụka (13/6/2021.)
Nwata nwaaanyị ahụ gbara afọ 23 na-agụ ọgwụ Bekee na mahadum na Rọshịa, onye Anambra steeti mechara nweta nturuugo, onye ejiji ya kacha mma (Best Costume) n'asọmpị ahụ, ebe nwa ada Zambia bụ Enah Chilogoshi meriri n'Asompi ahụ.

Ebe foto si, Screen grab
Ọkọlọta Naijiria ọbara huchiri bụ otu n'ihe nrịmama e ji echeta ọbara akwafuru na ngagharịiwe EndSARs oge ndịagha Naijiria gbaburu ndị na-eto eto amabeghị ole ha dị na Lekki Toll gate,Legọs n'abalị 20 nke ọnwa Ọktoba afọ 2020 (20/1020).
N'abalị njiji ahụ jiri n'oge EndSARS jiri, otu onye Amerịka na-ede akwụkwọ aha ya bụ Shaun King kwuru okwu dịka amụma banyere ọkọlọta ọbara a.

Ebe foto si, "MissAfricaRussia
King sị na ọkọlọta ahụ ọbara gburu ga abụ ihe njiricheta ọdachị dara ebe ndịagha gbara ndị ntorobịa ji ọkọlọtọ Naijiria kwụrụ eme ngagharịiwe maka mkpagbu n'aka ngalaba ndị uweojii ehiwere maka ibu aghara megide ndị ojiegbeezu bụ nke a kpọrọ SARS n'aha ịchafụ.

Ebe foto si, Shaun King
Mmadụ karịrị puku anọ kegharịrị ozi King, ebe mmadụ puku sara ozi ahụ.












