Madam Social: Mkpọnwụ ahụ m agaghị akwụsị m ịkpa ndị mmadụ ọchị

Aha onyonyo, Mama Social: Mkpọnwụ ahụ m agaghị akwụsị m ịkpa ndị mmadụ ọchị

Madam Social dị afọ 80 na-ewu ewu ọfụma na soshal midia maka etu ya na nwa nwa ya si akpa ndị mmadụ ọchị.

Mana akụkọ anyị nụrụ ugbua bụ na ọ nọ n'ezigbo ọrịa nke ụkwụ.

Nwanwa ya nwoke a kpọrọ a ma dịka Mc Mcshade gwara BBC sị "ọ bụ ule ọkpa na-eme ya ugbua"

"Anyị mefuru ego ruru puku narị ise rue ugbua mana ọ ka na-arịa ya" ka o kwuru.

Cheta na Mama gwaburu BBC Igbo ihe mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị na nka.

Ọ sị na o ruru n'afọ 2019 mgbe ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ na nke a gbawara obi mere o ji daa n'ọrịa mkpọnwụ ahụ bụ 'stroke'.

Madam social sị na nke a mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị iji chụọ ọbara mgbalielu na-agbanyeghi ọrịa ọ na-arịa.

Kirie ihe o kwuru n'uju;

Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu Uzu na Nnamdi Agbanelo

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: