Madam Social: Mkpọnwụ ahụ m agaghị akwụsị m ịkpa ndị mmadụ ọchị
Madam Social dị afọ 80 na-ewu ewu ọfụma na soshal midia maka etu ya na nwa nwa ya si akpa ndị mmadụ ọchị.
Mana akụkọ anyị nụrụ ugbua bụ na ọ nọ n'ezigbo ọrịa nke ụkwụ.
Nwanwa ya nwoke a kpọrọ a ma dịka Mc Mcshade gwara BBC sị "ọ bụ ule ọkpa na-eme ya ugbua"
"Anyị mefuru ego ruru puku narị ise rue ugbua mana ọ ka na-arịa ya" ka o kwuru.
Cheta na Mama gwaburu BBC Igbo ihe mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị na nka.
Ọ sị na o ruru n'afọ 2019 mgbe ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ na nke a gbawara obi mere o ji daa n'ọrịa mkpọnwụ ahụ bụ 'stroke'.
Madam social sị na nke a mere o ji malite ịkpa ndị mmadụ ọchị iji chụọ ọbara mgbalielu na-agbanyeghi ọrịa ọ na-arịa.
Kirie ihe o kwuru n'uju;
Ndị mere akụkọ a: Ikechukwu Kalu Uzu na Nnamdi Agbanelo
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

