Ipob: "Ọ bụghị eziokwu na Nnamdi Kanu gbara ọsọ na Briten"

Onye ọnụ na-eru n'okwu n' otu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Paul Achallah ekwuola na ume Naịjirịa ezughị ịchụlata onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.
Achallah sị na "otu ụzọ kwụ ọtụ Naịjriịa ga-esi kpọlata Nnamdị Kanu bụ usoro Bekee kpọrọ "extradition" nke usoro ya tara ezigbo akpụ nke bụ na ha gaghị emeli ya".
Ọ sị na Briten ga-enyocha ka Naịjiria sị agbanye ikike dịịrị onye ha kpọrọ "human right" nakwa ikpe nkwụmọtọ tupu e nye ha udiri ikike ahụ, "nke onye ọbụla ma na-agaghị ekpeli ikpe nkwụmọtọ na Naịjirịa".
Achallah sị na naanị ụzọ Naịjria ga-esi chụlata Nnamdi Kanu bụ ụzọ nzuzo dịka ha mere Umaru Dikko mgbe Buhari nọbụ n'ọchịchị, "mana nke ahụ bụzị ohi".
Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ekwu na gọọmentị Naịjiria iji ọkụ achụ Nnamdi Kanu ka ọ bịa zara ọnụ ya.
Ya bụ akụkọ na-ekwu na Nnamdị Kanu esila Briten gbafuo maka egwu ijide ya kpụlata ya na Naịjrịa.
O kwukwara na gọomentị Naịjria edeelarị akwụkwọ nye gọọmentị Briten kemgbe izuụka abụọ gara aga na-arịọ ka ha kpọlata Nnamdị kanu.
Mgbe onye ntaakụkọ BBC jụrụ Achallah ebe Nnamdị Kanu nọ ugbua, Achalla sị na ọ baghị uru ikwu ebe Nnamdị Kanu nọ.
Ọ sị, "O nweghị ebe Nnamdi Kanu ga-anọ gọọmentị Naịjirịa agaghị akpọlatapu ya ma ọ bụrụ na ha nwere ezigbo ikpe n'isi ya."












