Dare Adeboye burial: Etu akwamozu Dare Adeboye si aga

Dare Adeboye

A malitela akwamozu Ụkọchukwu Oluwadamilare Temitayo Adeboye (Dare) bụ nwa nke atọ nke Ụkọchukwu Enoch Adeboye bụ onyeisi ụlọụka Redeemed Christian Church of God (RCCG).

A na-aka ụka maka akwamozu ya n'ụlọ ọgbakọ ndị ntoroọbịa dị na RCCG Redemption Camp dị n'Ogun steeti.

A kachaa ụka a, a ga-eli ozu ya taa bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Mee, 2021.

Dare a na-etu 'Pasto Dee' dị afọ 42 mgbe ọ nwụrụ n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee, 2021.

Lee etu ndị mmadụ si gbakọọ maka ịka ụka ikpeazụ ya:

Ndị gbakọrọ maka akwamozu
Ndị gbakọrọ maka akwamozu
Ndị gbakọrọ maka akwamozu