Obi Cubana: Akwadoghị m ụdị ego emefuru n’Oba na mmemme akwamozu – Bishọpụ Chukwuma

Ebe foto si, Bishop Chukwuma,Omu/Fr Oluoma
Ndị isi omenala, ndị ịsị ụka Katọlịk na nke ndị Anglịkan ndị ọnụ ruru n'okwu n'ala Igbo ekwuola na ọ bụ otu ụmụnwaanyị bụ ndị kacha ebute nsogbu ịnapụ ndị mmadụ nwụnarịrị ego na ihe ndị ọzọ n'akwamozu.
Ka o si dị ugbua n'ala Igbo, ọtụtụ ihe na-emetụta ezinụlọ ndị mmadụ nwụrụ na be ha.
Ewepụ mkpụ akwa obi mgbawa maka ndi nwụụrụ ha, ihe ndị ọzọ n'echi ha bụ ihe ndị ụka Krịastị nakwa ndị omenala na-atụ anya ịnata n'aka ha.
Na mkparịtaụka BBC Igbo nwere taa bụ ụbọchị nke iri na otu nke ọnwa Ọgọst, ha gbadoro ụkwụ n'okwu ihe ndị a a na atụanya na-aka ezinụlọ ndị mmadụ nwụụrụ ma a na-eme akwamozu.
BBC Igbo nabara ndị ọnụ ruru n'okwu bụ mmadụ anọ nke abụọ n'ime ha bụ ndị isi ụka Kriastị nke Katọlịk nakwa nke Anglịkan bụ Fada Chinyere Oluomachi na Bịshọpụ Emmanuel Chukwuma.
Ndị abụọ ndị nke ọzọ bụ onye omenala Eze Nwaanyị Martha Dunkwu na onyeisi ụmụnwaanyị bụ Kosi udechukwu.
Lee ihe ha kwuru na ya bụ mkparịtaụka:
Eze Nwaanyị Martha Dunkwu

Eze Nwaanyị Martha Dunkwu kwuru sị na ugbua mmadụ lie nne maọbụ nna ha , ha agbara aka kama ọdịghị etu a na mbụ.
O kwuru sị, " oge m batara na obodo Omu , ahụrụ m na ụmuada na-emegbu ụmụada ibe ha maka ụtụ dị iche iche".
O kwuru na ya kpọrọ ụmu nwaanyị were sị ha cheta kwa na ụfọdụ ndị ejighi ego itu ụdịrị ụtụ a na-etinye ha n'isi.
Eze Dunkwu kwuru sị, "akpọkwara m ndị nwoke sị ha ka ewebileta aka n'ụtụ a na-enye ndị mmadụ na-akwa ozu. Ha kwetara ma sị na ọ bụ ụmụ nwaanyị kacha ana ụtụ ndị a".
Eze Nwaanyị Dunkwu kwuru na ọ dịghị mma na mmadụ kwacha ozu onye ahụ abanyezia n'ụbịam.
Ọ kọwara na, "ọ ka mma na anyị gosiri onwe anyị ịhụnaya na obi ọmaikọ n'ihe a na-atụ n'aka ezinụlọ n'akwa ozu".
Bịshọpụ Chukwuma

Ebe foto si, Alamy
Bịshọpụ Chukwuma ekwuola na ya akwadoghị ụdị ego emefuru n'Oba na mmemme akwamozu.
O kwuru sị," n'uche m, ego ahụ ga-aka mma i jị mezie ụzọ nakwa obodo ahụ".
Ọ gara n'ihu kwuo, "na Parishị ụka m nke m na-elekọta a na-akatọọ oke mmefụ ego na ị na ezinụlọ na-akwa ọzụ ihe, oke ememe n'akwamọzụ eweghị uru ọ bara onye ọ bụla ọkachasi ndị aka erughi"
Fada Oluoma

Ebe foto si, Fada Oluoma
Oluoma kwuru sị, " Ịgbasa mkparịtaụka a dị mkpa maka mmadụ niile kwesiri itinye aka hụ na ihe gbanwere, n'ezia okwu a metụtara anyị niile".
Ọ gara n'ihu kwuo sị, "akwadoghị m ndị ụka ịna ndị ezinulo na-awka ozu oke ego, maọbụ ikwu na ha agaghi eli ozu onye nwụrụ anwụ maka ya bụ onye akwụghị ego otu ụka mgbe ọ dị ndu.
O kwuru na ya akwadoghi oke mmefu ego na-akwamozu.
O kwuru uche obi ya were sị na ọ bụ ndị dị ndu na-akwa ozu, ma sị na ọ dighi mma ma ndị ụka maọbụ ndị omenala were aka ike kpachapụta ego nakwa ihe ndị ọzọ n'aka ezinụlọ na-akwa ozu.
O kwukwara sị, "nke ga-emezi ka ezinulo ahụ dị ka ndị ọdịndu ọnwụ ka mma".
Kosi Udechukwu

Ebe foto si, Uche Akolisa
Kosi Udechukwuru kwuru uche obi ya were sị,"Otu ụmụ nwoke, otu ụmụ nwaanyị, otu ndị ntorobia, ndị ụka na mmadụ niile kwesiri itinyekọta aka ọnụ hụ n'enwere mgbanwe n'okwu ichọ ihe n'aka ezinụlọ n'akwa ozu".
Kama o kwuru sị na mgbe onye dị ndu, ka ọ tụọ ụtụ dịrị ya, na nke a ga-eme ka ọ hapụ itinye ndị ezinụlọ ya na nsogbu oke ụtụ ma ọ laa mmụọ.










