Igbo burial rites: Ihe mere nwaanyị anaghị eli ozu n'ala Igbo

Ndị na-akwa ozu mmadụ

Ebe foto si, Apams Limited

Igbo tụrụ ilu sị na "onye aka ruru ya elie nne maọbụ nna ya" mana nwaanyị o nwere ikike ime nke a n'ala Igbo?

Ọ bụ ajụjụ a ka ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ dịka akụkọ sị na otu nwaanyị na nwanne ya nwoke na-azọ onye ga-eli nna ha.

Onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo North bụ Obiageri Oko Enyim na nwanne ya nwoke bụ Ogbonnia Oko Enyim na-ama aka onye ga-eli nna ha nwụrụ.

Nna ha bụ Simon Oko Enyim nwụrụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ

Ọ bụghị otu nne mụrụ ha abụọ kama ọ bụ otu nna jikọtara ha abụọ.

Gịnị butere esemokwu a?

Ogbonnia Oko Enyim

Ebe foto si, Ogbonnia Oko Enyim/facebook

Nkọwa foto, Ogbonnia Oko Enyim bụbu onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo North nke Ebonyi Steetị

A maghị kpọmkwem ebe mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ mana Ogbonnia gwara BBC Igbo na kamgbe a na-apụrụ ya ikike ịzọ ọkwa okpuruọchịchị Afikpo North ma nye ya Obiageri na ha abụọ adịghịzi na mma.

Kama na nke ahụ apụtaghị na nwaanyị ga-abịa na-azọsị nwoke onye ga-eli nna ha na o nweghi ebe nke ahụ na-eme n'ala Igbo.

O boro gọọmentị Ebonyi Steetị ebubo maka ịkwado Obiageri bụ ihe nyere ya ikike dịka nwaanyị ịna-azọ onye ga-eli nna ha.

Ogbonnia sị na o mechara lie nna ha n'ụbọchị 8 nke ọnwa Eprelụ na-agbanyeghi esemokwu a dị n'olili ya.

Obiageri Oko Enyim

Ebe foto si, Obiageri Oko Enyim/Facebook

Nkọwa foto, Obiageri Oko Enyim bụ onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo North ugbua

Mana nwada Obiageri gwara BBC Igbo na nwanne ya nwoke achọghị ịkpọkọta ezinaụlọ ha ọnụ dịka diọkpara ọ bụ.

Na Ogbonnia hiwere olili nna ha na-emeghi ka ụmụnne ndị nwoke kpaa maka ya ka ọfọdụzie ha nwa bụ ndị nwaanyị.

Mgbe a jụrụ ya ma ọ bụ eziokwu na ọ bụ ya tinyere ụbọchị olili nna ya, Obiageri sị na ọ bụghị hiwere ụbọchị kama na ọ bụ ndị nze nke nna bụ otu n'ime ha hiwere n'ụbọchị 8 nke ọnwa Mee, afọ 2021.

Obiageri sị na ọ rịọla nwanne nwoke ka ha meeudo iji hụ na e liri nna ha mana ọ jụrụ ịnabata arịrịọ ọ rịọrọ ya.

Ọ sị dịka ọ dị ugbua na e libeghi nna na ozu ya ka na n'ụlọozu rue ụbọchị 8 nke ọnwa Mee a ga-eli ya dịka ezinaụlọ na ndị obodo ji nwee nkwerịkọta.

Ọ sị na ebubo Ogbonnia na-ebo gọọmentị Ebonyi maka ịdọnyere ya ukwu bụ asị maka na gọọmentị gwara Ogbonnia ka ya na ezinaụlọ ya mee udo.

Kedụ ihe omenala Igbo kwuru banyere ya?

Ndị na-akwa ozu mmadụ

Ebe foto si, Apams Limted

Maazị Chigozie Nnabuihe bụ ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo sị na ọ bụghị omenala Igbo na nwaanyị ga-eli nne ya maọbụ nna ya.

Ọ sị na ọ bụrụgodi na o nweghi nwoke a mụtara n'ezinaụlọ ahụ, na ụmụnna maọbụ onye nwoke kachasị nọrọ ha nso ga-apụta mee omenala a ga-eji lie onye ahụ.

Ọ sị na ike kwe na ụfọdụ obodo ndị na-eri ala na nne nwereike ị na-eme ụdị nke a kama na omenala Igbo gbaa gburugburu anaghị eme ya.

Nnabuihe jụrụ sị "ọ bụrụ nwaanyị lụọ di na ọ ga-ahapụ ụlọ di ya bịa na-azọ onye ga-eli nna ya?"

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Mwakpo Ebele di na Ngbo