Igbo burial rites: Ihe mere nwaanyị anaghị eli ozu n'ala Igbo

Ebe foto si, Apams Limited
Igbo tụrụ ilu sị na "onye aka ruru ya elie nne maọbụ nna ya" mana nwaanyị o nwere ikike ime nke a n'ala Igbo?
Ọ bụ ajụjụ a ka ọtụtụ mmadụ kpụ n'ọnụ dịka akụkọ sị na otu nwaanyị na nwanne ya nwoke na-azọ onye ga-eli nna ha.
Onyeisioche okpuruọchịchị Afikpo North bụ Obiageri Oko Enyim na nwanne ya nwoke bụ Ogbonnia Oko Enyim na-ama aka onye ga-eli nna ha nwụrụ.
Nna ha bụ Simon Oko Enyim nwụrụ n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ
Ọ bụghị otu nne mụrụ ha abụọ kama ọ bụ otu nna jikọtara ha abụọ.
Gịnị butere esemokwu a?

Ebe foto si, Ogbonnia Oko Enyim/facebook
A maghị kpọmkwem ebe mmiri si baa n'opi ụgbọghọrọ mana Ogbonnia gwara BBC Igbo na kamgbe a na-apụrụ ya ikike ịzọ ọkwa okpuruọchịchị Afikpo North ma nye ya Obiageri na ha abụọ adịghịzi na mma.
Kama na nke ahụ apụtaghị na nwaanyị ga-abịa na-azọsị nwoke onye ga-eli nna ha na o nweghi ebe nke ahụ na-eme n'ala Igbo.
O boro gọọmentị Ebonyi Steetị ebubo maka ịkwado Obiageri bụ ihe nyere ya ikike dịka nwaanyị ịna-azọ onye ga-eli nna ha.
Ogbonnia sị na o mechara lie nna ha n'ụbọchị 8 nke ọnwa Eprelụ na-agbanyeghi esemokwu a dị n'olili ya.

Ebe foto si, Obiageri Oko Enyim/Facebook
Mana nwada Obiageri gwara BBC Igbo na nwanne ya nwoke achọghị ịkpọkọta ezinaụlọ ha ọnụ dịka diọkpara ọ bụ.
Na Ogbonnia hiwere olili nna ha na-emeghi ka ụmụnne ndị nwoke kpaa maka ya ka ọfọdụzie ha nwa bụ ndị nwaanyị.
Mgbe a jụrụ ya ma ọ bụ eziokwu na ọ bụ ya tinyere ụbọchị olili nna ya, Obiageri sị na ọ bụghị hiwere ụbọchị kama na ọ bụ ndị nze nke nna bụ otu n'ime ha hiwere n'ụbọchị 8 nke ọnwa Mee, afọ 2021.
Obiageri sị na ọ rịọla nwanne nwoke ka ha meeudo iji hụ na e liri nna ha mana ọ jụrụ ịnabata arịrịọ ọ rịọrọ ya.
Ọ sị dịka ọ dị ugbua na e libeghi nna na ozu ya ka na n'ụlọozu rue ụbọchị 8 nke ọnwa Mee a ga-eli ya dịka ezinaụlọ na ndị obodo ji nwee nkwerịkọta.
Ọ sị na ebubo Ogbonnia na-ebo gọọmentị Ebonyi maka ịdọnyere ya ukwu bụ asị maka na gọọmentị gwara Ogbonnia ka ya na ezinaụlọ ya mee udo.
Kedụ ihe omenala Igbo kwuru banyere ya?

Ebe foto si, Apams Limted
Maazị Chigozie Nnabuihe bụ ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo sị na ọ bụghị omenala Igbo na nwaanyị ga-eli nne ya maọbụ nna ya.
Ọ sị na ọ bụrụgodi na o nweghi nwoke a mụtara n'ezinaụlọ ahụ, na ụmụnna maọbụ onye nwoke kachasị nọrọ ha nso ga-apụta mee omenala a ga-eji lie onye ahụ.
Ọ sị na ike kwe na ụfọdụ obodo ndị na-eri ala na nne nwereike ị na-eme ụdị nke a kama na omenala Igbo gbaa gburugburu anaghị eme ya.
Nnabuihe jụrụ sị "ọ bụrụ nwaanyị lụọ di na ọ ga-ahapụ ụlọ di ya bịa na-azọ onye ga-eli nna ya?"
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:












