Etu ụmụnne abụọ si gbuo nwanne ha nwoke maka akụnaụba nna ha

Ezinaụlọ ụmụnne gburu nwanne ha

Ndị uweojii n'Imo Steeti sị na aka Chioma na Mishark Emenyionu gburu Chinonso Emenyionu maka ndọrọndọrọ akụnaụba nna ha.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu kwuru na ụmụnne a si Uborji dị n'obodo Okuku nke okpuruọchịchị Owerri West, Imo Steeti nọzị n'aka ndị uweojii ugbua.

Orlando Ikeokwu

Maazị Ikeokwu sị na nnyocha mbụ ha gosiri na esemokwu malitere dịka Chinonso na-agba isi akwara maka usoro e jiri chọọ ike akụnaụba nna ha hapụrụ nwụọ.

Ọ sị na Chinonso ji mma yie nne ha egwu, nke mere Chioma Emenyionu jiri kpọọ ụmụ nne ha nwoke bụ Chigbu, Mishark na Shedrack Emenyionu.

Maazị Ikeokwu dere na dịka ha bịara, ha malitere tiwe Chinonso ihe nke butere ibu ya gawa ụlọọgwụ ebe ndị ọrụ ahụike jiri kwuo na ọ nwụọla.

Ozu Chinonso nọzị n'ebe a na-edowe ndị nwụrụ anwụ.