Ihe mere ụmụnwaanyị anaghị eketa ala n'omenala Igbo

Ndị na-akọ ugbo n'ala

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist Igbo

Atụmatụ ike akụnaụba n'ime ezinaụlọ bụ atụmatụ zuru mbaụwa niile ọnụ nke ndị Igbo so na ya.

A bịa n'ala Igbo, ihe a na-akpọ atụmatụ ike akụnaụba bụ "Ike Ekpere" nke gụnyere ụlọ, ala, ụgbọala, uwe nakwa ihe ndị ọzọ.

Ebe akụkọ a na-elekwasị anya bụ etu ndị Igbo si eke ala n'ụzọ omenala, mana ọ ga-ebuzo kọwaa ihe bụ ala.

Kedụ onye na-eketa ala n'omenala Igbo

Onye ọkammụta n'asụsụ nakwa omenala Igbo na Mahadum Legọs bụ Maazị Chigozie Nnabuihe sị na ike ala n'omenala Igbo abụghị ma ụmụnwaanyị, na ọ bụ naanị ụmụnwoke na-eketa ala.

Ọ sị nke a bụ makana ndị Igbo kwenyere na nwaanyị ga-esi n'ezinaụlọ ya pụọ ga-enyere di ya aka wulite ezinaụlọ nke ha.

Ọ sị na ọ bụrụ na e kenye nwaanyị ala n'ụlọ nna ya, na anya nwaanyị ahụ agaghị anọgide n'ụlọ di ya, na obere ihe na ọ ga-agbalata.

Nnabuihe katọrọ ikpe ahụ a chabiri na nso nso nke sị ka amalite ikenye nwaanyị ala, na nke megidere omenala Igbo.

Ọ sị na nke a bụ ihe ọ gbara ọhụrụ na abụghị etu omenala Igbo si na mgbe gboo.

Gịnị bụ Ala?

Nwoke na-aga n'okeala ya

Ebe foto si, Getty Images

Ndị Igbo kwenyere na ala bụ otu n'ime ihe onyinye Chineke ji chọọ ụwa mma, nke o nyere ndị nna anyị ochie.

Ala bụ otu n'ime ụzọ e ji enweta akụrụ ngwa ndị e ji ebi ndụ dịka ihe a kụrụ n'ugbo, ịrụ ụlọ obibi na ngwupụta ihe ọ natarachi.

Ndị Igbo na-efekwa ala ka chi, bụ nke na-arịọ ya ka o nye ha onyinye nwa, mpụrụosisi na uwe ihe ubi dị iche iche.

Kedụ ụzọ ndị e si enwete ala?

Ime ọhịa dị n'obodo

Mmadụ nwereike inwete ala site n'ụzọ ndị a:

Ihe nketa: Nke a bụ ala ndị eketara dịka ịbụ otu n'ime onye si n'ezinaụlọ. A na-atụ anya na nwa ga-eketa ala n'aka nna ya.

Ọzụzụ: Nke a bụ ala ndị e nwetere site n'ọzụzụ. Mgbe mbụ a na-ahụta ire ala dịka arụ nke mere na ọtụtụ obodo n'ala Igbo anaghị ere ala ere mana nke agbanweela n'ụfọdụ obodo.

Mgbazinye: Ọ bụ ala agbazinyere mmadụ n'ime afọ ole na ole ka o were ya rụọ ọrụ ugbo maọbụ mee ihe ọzọ.

Mgbanwe: Nke a bụ mgbe mmadụ abụọ nwere ala kpebiri ịgbanwe ala ha nwere n'etiti ha abụọ iji mee ka ọ dịrị ha mfe.

Onyinye: Nke a bụ ala a natara site n'onyinye, onye na-abụghị otu n'ime ezinaụlọ nwereike ikete ala dịka onyinye.

Kedụ etu ndị Igbo si eke ala?

Ndị nọ n'ala ha

Ebe foto si, Getty Images

Onye ọkammụta n'asụsụ na omenala Igbo bụ Maazị Chigozie Nnabuihe sị na mpaghara Igbo dị iche iche nwere etu ha si eke ihe nke gụnyere ala.

Ọ sị na ụfọdụ ndị dịka Ohafia, Edda na-eke n'ikwu nne, ọtụtụ ebe ndị ọzọ na-eke n'ikwu nna.

"N'ezinaụlọ nwere di na otu nwunye, na ọ bụ diọkpara na-eketa obi nna ya na o nweghi onye na-azọ sị ya okeala ahụ kama na ọ bụ ọrụ ya ịnọ n'obi nna ya hụ na ụmụnne ya ndị ọzọ agaghị ehi n'ezi.

N''aka nke ọzọ na ọ bụ nwa nke ọdụ nwe okeala ebe ahụ usekwu nne ya nọ, ebe ụmụ ndị ọzọ ga-eketa ala ndị ọzọ."

Nnabuihe sị na ọ bụrụ ezinaụlọ nwoke lụrụ ọtụtụ nwunye na a ga-ebuzọ kenye diọkpara obi nna ya tupu e kee ala ndị ọzọ n'isi nwunye ya ndị mụtara nwoke.

Mgbe nke a mechara na ụmụnwoke ole otu nwaanyị mụrụ ga-aga kee ala nke ha n'agbanyeghị ole ha dị.

Nwata na-abọchị ala

Ebe foto si, Getty Images

Nnabuihe sị mgbe ụfọdụ nwoke na-eke ala etu o si maasị ya tupu ọ nwụọ.

Mana ọ bụrụ na etu o si kee ya adịghị mma, na ndị ụmụnna ka e kegharị ala ma ọ nwụọ, nke mere e ji a sị " Onye nwụrụ anwụ kechaa ekpe ndị dị ndụ ekegharịa".

N'Imo Steetị, Maazị Achonna John-Okere sị n'obodo Imerienwe, ọ sị na ọ bụ di ọkpara nwee obi nna ya. Na a na-ekezi ndị ọzọ n'isi ụmụnwoke ole nọ n'ezinaụlọ.

Ọ sị na ọ bụrụ nwoke lụkwara ọtụtụ nwunye na ọ bụ n'isi nwunye ole ọ mụrụ ka a ga-eji keere ụmụ ya ala.

Kama na ọ bụrụ na o nwere onye obi adịghị mma etu e si kee ala na onye ahụ ga-eme mkpesa n'obieze ka ha kpee ikpe dị n'ala ahụ.

John-Okere sị na ọ bụrụ na Eze na obi ya ekpeteghi ya na onye ahụ nwere ị ga ụlọikpe ọdịnala a kpọrọ 'Customary Court'.

Obi ezinaụlọ

N'obodo Nkwe dị n'Ọgwụ nke Enugwu Steetị, Maazị Laz Udogwu sị na ọ bụ ụzọ atọ ka ha ji eke ala n'obodo ahụ.

Nke mbụ bụ na nwoke nwereike iji aka ya eke ụmụ ya ala dịka o si maasị nakwa etu ụmụ ya si kpasị ya agwa mana ọ bụ diọkpara ga-eketa obi naa.

Nke abụọ bụ na site n'ịhọrọ ala (Balloting); ebe a ga-enye ala niile ahụ akara ma kpọkọta ụmụ ya ha bịa ghọrọ akara ndị a malitena diọkpara ya.

Akara ọbụla onye họtara ga-abụ okeala ọ ga-eketa n'aka nna ya.

Nke atọ abụrụ na a gụkọchaa ala ndị ahụ ọnụ ma nye ha akara ndị ụmụnna ga-ehiwe kọmitti ga-eke ala ndị a n'etiti ụmụ nwoke ahụ.

Ndị kọmitii a ga-abụkwa ndị akaebe ma ọ bụrụ nsogbu ọbụla adapụta n'etu e si kee ala ndị ahụ.

Na nchịkọta, mpaghara ala Igbo dị iche iche nwere usoro ha ji eke ala mana ihe gbapụtara ihe n'ime ha niile bụ na diọkpara na-eketa obi nna ya ebe nwa ọdụ na-eketakarị usekwu nne ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị