Ije Di: Gịnị mere ndị Igbo ji asị ka nwaanyị nwalee alụmdị na nwunye?

Nwaanyị na-agba nkwụ

Ebe foto si, Mazi Nwonwu

Ọtụtụ ndị agba ọhụrụ amaghị na ndị Igbo nwere omenala alụmdi na nwunye nke na-enye nwaanyị ohere ịga nwalee ma ibi n'ụlọ onye chọro ịlụ ya ọ ga-amasịkwa ya.

Ọ bụ atụmatụ ahụ ka ụfọdụ mpaghara Igbo na-akpọ Ije di.

N'ịkọwa ihe Ije Di pụtara, otu okenye n'obodo Nkwe dị n'okpuruọchịchị Awgu, n'Enugwu steeti, aha ya bụ Ichie Fredrick Chukwu sị na Ije Di bụ dịka nwale nwaanyị chọrọ ịlụ di ọhụrụ.

Ọ sị na nke a bụ mgbe nwaanyị achọrọ ịlụ ọhụrụ ga-eburu ụzọ gaa n'ụlọ di chọrọ ịlụ ya ka ya na nne na nna ya na ụmụnne ya nọkọọ.

Ichie Chukwu sị na nke a bụ ka nwaanyị a chọrọ ịlụ na ezinaụlọ di chọrọ ịlụ ya mata onwe ha ma nwalee me ha a ga-ebinwu.

Ọ sị: "Atụmatụ a na-enyere onye ọbụla aka. Ezinaụlọ nwoke a mata etu nwaanyị ọ chọrọ ịlụ si akpa agwa, nwaanyị a chọrọ ịlụ amatakwa etu ezinaụlọ ahụ si eme."

Ọ sịkwa na isi nwale a bụ ka oke na ngwere mara ma ha a ga-anọkọnwu. Nke a metụtara nghọta Igbo na ọ bụghị otu onye na-alụ nwaanyị.

Usoro esi aga Ije Di

Ichie Chukwu kọwakwara na tupu nwaanyị agaa Ije Di, ndị be nke nwoke ga-ebu ụzọ gaa na nke nwaanyị jụta ese maọbụ nata akwụkwọ e dere usoro omenala nwoke ga-eji lụọ nwaanyị ahụ.

Ọ bụ n'ụbọchị ahụ ka nke nwaanyị ga-esoro ndi be nwoke ahụ laa n'ụlọ ha jee nọrọ otu izu.

Uru Ije Di bara

Dịka Ichie Chukwu siri kọwaa, uru Ije Di bara gụnyere:

  • Mkpụrụ ụbọchị anọ ahụ nwaanyị ga-anọ na be onye chọrọ ilụ ya ga-enye aka ka ọmata akparamagwa di na na be ya
  • Ọ bụkwa ohere di ịmata etu nwunye ya nwereike kpaa agwa na be di
  • Ọzọ bụkwa na ezinaụlọ nwekwara ohere ịmata onye nwa ha ga-alụ
  • Ọ na-enyekwa nwaànyị ọnụ okwu n'ihe banyere ọlụlụ ya
  • Nke kachasị nke bụ mmadụ abụọ ahụ ịmata ma ha a ga-alụnwukwa onwe ha.

Ụbọchị anọ gachaa, nwaanyị ga-alaghachi na be nne na nna ya were kọwara ha etu o siri jee.

Ọ bụ n'oge a ka ọ ga-agwa ndị be ha ma ọ chọrọ ịlụ nwata nwoke ahụ ma ọ chọghị.

Ndị nke nwoke ga-ajụtakwa nwa ha ma ọ chọrọ ịga n'ihu, ma kwukwa etu ha siri hụ agwa nke nwaanyị n'oge ha na ya nọ.

Ya bụrụ na ha kpebiri na agwa nke nwaanyị adịghị ha mma maọbụ na ya achọghị ya na be ha, ndi nke nwoke agaghị abịachị be nke nwaanyị.

Ma ya bụrụ na-agwa ya dị ha mma, ha ga-atụ aro, zitere ndị nke nwaanyị ozi ụbọchị ha ga-ebute ihe niile di n'akwụkwọ omenala ha ga-eji bịa lụọ nwaanyị ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: