Gọọmenti Uzodinma sị azụ ụlọ mịbata ahịrị iwu a na-ese okwu - Frank Ugboma

Frank Ugboma,Hope Uzodinma

Ebe foto si, Frank Ugboma,Hope Uzodinma/Facebook

Onye omeiwu na-anọchịte Oguta n'Ụlọomeiwu Imo steeti n'aha otu PDP bụ Frank Ugboma aghọọla aka na ụkwụ ya n'ebubo na ọ bụ ya wepụtara iwu ọhụrụ nyere gọvanọ Imo state ikike ịnwụchị onye sọrọ ya mgbe ọ sọrọ ya si na ọ bụ "aka Esau" webatara ya.

N'akwụkwọ mgbasaozi nke omeiwu ahụ binyere aka, o kwuru na ọ bụ ezie na ya wepụtara iwu mana o nweghị akụkụ n'ime iwu ya wepụtara nwere ebe o nyere gọvanọ ikike ijichi onye masiri ya mgbe ọ masịrị ya.

" Ihe a abụghị iwu m wepụtara ma kwado. "

" Ọ sịrị, "Iji doo onye ọ bụla anya, e wepụtara m iwu gbakọtara nwee akụkụ 372."

"Etu na ebe e si megharịa ya nwee tinye akụkụ 484 bụ ihe mgbagwoju anya."

Ugboma, onye bụ onye ọkaiwu gara n'ihu kwuo sị na oge ya kesara ndị omeiwu ibe ya akwụkwọ iwu ya webatara, oge a gụrụ ya nke mbụ na nke abụọ, n'akụkọ ahụ ' jọgburu onwe ya ma na-emekwa ihere bụ nke 484, adịghị ya.

O kwukwara na o nweghị onye kpara maka ya bụ akụkụ na kọmiti e hiwere n'ụlọomeiwu Imo steeti.

Ugboma kwuru na dịka ọkaiwu nakwa onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye, "o nweghị ka ụdị iwu a lafere n'ọgbakọ ụlọomeiwu nke Itoolu m so na ya."

Ọ gara n'ihu kpokuo ndị ogbo ya ndị omeiwu ka ha nyocha ebe mmiri siri banye opi ụgbọgụrụ ma hazigharịa iwu ahụ.

'Ọ bụ onye PDP wepụtara atụmatụ iwu nyere Ụzọdinma ikike nwuchi onye sọro ya'

Aha onyonyo, Iwu Imo

Onye ndụmọdụ onyeisi ndị omieiwu n'Imo steeti banyere mgbasa ozi bụ Emeka Ahaneku gwara BBC n'iwu na-ese okwu na steeti ahụ abụghị iwu ọhụrụ.

Maazị Ahaneku sịrị na ọ bụ n'ọchịchị Emeka Ihedioha - bu onye ulọikpe ukwu na Naịjirịa chụtụrụ n'ọchịchị - ka iwu malitere njem.

Aha onyonyo, 'Hope Uzodimma ga-ewetere ndị Imo 400,000 ọrụ'

"Ọ bụ omeiwu na-anọchịte Oguta bụ Frank Uboma wetere atụmatụ iwu a dịka n'usoro a na-akpọ "Private Bill" n'oge Ihedioha na-achị."

Gọvanọ Hope Uzodinma

Ebe foto si, He_HopeUzodinma/Facebook

N'ime iwu a nke Gọvanọ Hope Uzodinmma tinyere aka na ya, o nwere ngalaba nyere gọvanọ ikike inwuchi onye ọbụla ọ chọrọ mgbe ọbụla, n'etu ọ bụ o si masị ya.

Iwu ahụ nyekwara ya ikike idosa onye ahụ a nwuchiri n'ebe ọbụla maọbụ n'ọnọdụ ọbụla masịrị gọvanọ ahụ.

Iwu Imo Steetị

Maazị Ahaneku sị na iwu a gara njem niile o nwereike ịga n'ụlọ omeiwu tupu e were ya nye kọmịti mmadụ itoolu nke gụnyere ndị ọkanmụta abụọ tupu e were ya nye gọvanọ ka o binye aka.

N'ịza BBC azịza banyere iwu, ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Uzodinma bụ Uguwike Nwachukwu sị na ya amaghị ihe mere ndị mmadụ jiri kpụrụ onyeisi ya n'ọnu banyere iwu a.

Nwachukwu sị: "Amaghị m na Gọvanọ Hope Ụzọdịnma hibere iwu ọbụla bụ nke "Executive" n'ọnọdụ a dịka ụfọdụ ndị afọ ọjọọ na-ekwu. Iwu a na-ekwu okwu ya bụ nke onye omeiwu ji aka ya wepụta ma bụrụkwa nke ndị PDP nọ n'Ụlọ Omeiwu Imo kwadoro ọfụma n'oge ahụ."

O kwenyekwere n'ihe Ahaneku kwuru na ndị ọkanmụta n'ihe banyere iwu tinyere ọnụ n'iwu a.

"Ndị isi ha gbagotere n'iwu nyochara atụmatụ iwu a mana ajụghị ajụjụ banyere ọrụ ha rụrụ."

Ọ sịkwa: "Iwu a abụghị iwu ọhụrụ. Ọ bụ iwu e si akara 401 na Criminal Procedure Law" nke Naịjirị bịa."Mana, nnyocha BBC gosiri na iwu "Criminal Procedure Law" bụ maka ndị a na-ahụ dịka ndị mpụ na nrụrụaka. Iwu a akpụ n'ọnụ ekwughi maka ndị mpụ na nrụrụaka.

Uguwike sị na "Ụzọdịnma, dịka onye bụbu onye omeiwu, ma maka iwu a na ihe ọ bụ karịa ndị ji ya eme ihe ndọrọndọrọ."

Ọ sị na ndị na-eche na iwu bụ nke eji emekpa ahụ ma na iwu a dị kemgbe ma bụrụkwa nke ọtụtụ steeti binyekwere aka.

Oguwike sị na Uzodinma ma maka mmegide ikike dịrị onye nakwa usoro onye kwuo uche ya na mba dị ka Naịjirịa, nke mere ịsụ mma n'azụ banyere okwu agaghị akwụrụ. Ahaneku n'onwe ya sị na dịka Ụlọ Omeiwu Imo nọ n'ezumike ugbua, na ha ga-etinye anya n'iwu ma ha lagachite.

Mbọ niile BBC gbara inwete Frank Uboma amịtaghị mkpụrụ.