Hope Uzodinma: Aga m ebido ịgbasa oziọma APC n'Ọwụwa-anyanwụ

Ebe foto si, Hope Uzodinma/Facebook
Dịka o merichara n'Ụlọikpe Kachasị n'ikpe ya na Emeka Ihedioha, Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Ụzọdinma ekwuola na ọrụ ya ugbua bụ idozi ihe ndị mebiri emebi na steeti ahụ.
O kwuru na ya achọghị ka ya na onye ọbụla nwee esemokwu kama ọ bụ ịrụrụ ndị Imo ọrụ.
Uzodinma, onye kwuru nke a n'ehihie Wenezde na mkparịtaụka ya na ụlọakụkọ Channels TV, gara n'ihu kwuo na ya ga-ebido ịgbasa oziọma APC.
Lee ihe ndị ọzọ o kwuru:
- "Ihe atọ m ga-agbado ụkwụ na ya (ịrụ ọrụ n'imo) bụ nrụgharị (Rehabilitation), mweghachi (recovery), na nhazigharị(Restructuring)"
- APC bụ pati bụ ebe anọ ugbua.Ọ bụ pati ji ọgbọ n'etiti
- Imo steeti abụrụla steeti nwere otu pati
- Aga m ebido mgbasa oziọma ndọrọndọrọ ọchịchị( maka APC)
- Enweghị m ohere ịlụso onye ọbụla ọgụ kama abịara m ịrụrụ ndị Imo ọrụ.
- "Akwụọla m ụgwọọnwa abụọ(kemgbe m banyere). M ga-elebanye ụgwọọnwa ndịọrụ nke gọọmentị gara aga akwụbeghi."
- Na ya ga-elebanye n'okwu akụ gọọmenti e zuru ezu ma napụta ihe ndị furu efu.
- Gbasara nchụda ụlọikpe chụdara Oshiohmole, Uzodinma kwuru sị: "Amaghị m ka ụlọikpe ga-esi wepụ onyeisioche. Aghọtabeghị m ya, mgbe m ghọtara ya ka m ga-ekwu okwu."
Akụkọ ga-amasị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:





