Election Tribunal: Mmeri Ihedioha bụ mmeri si na Chineke - Chibuike Onyeukwu

Ihedioha

Ebe foto si, Facebook/Ihedioha

Ụlọikpe nọ n'Abuja eweliela aka Emeka Ihedioha dịka onye meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ nke ọnwa Maachị afọ a.

Ụlọikpe ahụ tụpụrụ ikpe nke Uche Nwosu, Hope Uzodinma nakwa Ifeanyi Ararume gbakọrọ aka kpee Ihedioha.

Ha kwuru na ihe ha ji tụpụ ya bụ ikpe bụ na ọ baghị uru maọbụ o nweghi "Merit" na Bekee.

Chibuike Onyeukwu bụ onye enyemaka Ihedioha etinyela ọnụ n'okwu gbasara mmeri a

Ọ gwara BBC Igbo na mmeri a kwesiri ịbụ ohere mmadụ niile ga-eji bịakọta ọnụ ka edozie Imo steeti.

O kwuru na ihe chere ha n'ihu ugbua bụ ọganihu Imo steeti nakwa etu a ga-esi buli ya n'ọnọdụ dị mma.

Mmadụ atọ gbara akwụkwọ nke taa bụ Hope Uzodinma Uche Nwosu na Ifeanyi Ararume.

Ha boro ebubo na mmeri Ihedioha dara iwu na-achịkọta mmeri ntuliaka na Naijirịa.