Igbo Burial Rites: Ebee ka e kwesịrị ili nwunye mmadụ n'ala Igbo?

Nwaanyị na-eru uju

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọnwụ bụ nnukwu ihe mgbawa obi
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ọnwụ na olili ozu bụ otu omenala ndị Igbo ejighi egwu egwu.

Mana olili nwaanyị anaghị abụcha otu ihe n'akụkụ dị icheiche n'ala Igbo.

Ọtụtụ oge, a na-enwekarị nrụrịtaụka gbasara ebe e kwesịrị ili nwaanyị; ọ bụ na be nna ya ka ọ bụ na be di ya.

Nrụrịtaụka a akawanyela njọ ọkachasị n'oge ugbua mgbe ndị ọgbara ọhụrụ na-ekwu na nwoke na nwaanyị bụ otu ihe.

Ha na-ekwu na ihe kwesịrị nwoke kwesịkwara nwaanyị, nke bụ na ọ bụrụ na a na-eli nwoke na be nna ya, o kwesịkwara ka e lie nwaanyị na be nna ya.

Mana kedụ etu ọ dị n'oge gboo?

Ndị bu akpati ozu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'oge gboo a na-ebula nwaanyị nwụrụ anwụ na be nna ya ga lie

Ọkammụta Chigozie Nnabuihe bụ onye nkuzi asụsụ na ọdịnala Igbo na Mahadum Legọs kọwara na oge gboo, ndị Igbo kwenyere na ebe e liri alọ mmadụ ka a ga-eli isi ya.

Alọ bụ ihe ndị Bekee na-akpọ 'placenta'. Ndị Igbo ụfọdụ na-akpọ ya uwo maọbụ ichi.

Cheta na a mụọ nwa ọhụrụ, a na-ewere alọ ya ga lie na mbara nna ya.

Nke a pụtara na a na-eli nwaanyị na be nna ya na-agbanyeghi na ọ lụọla di ma mụọ ụmụ.

Nnabuihe kwuru sị: "Mgbe nwaanyị gara ije di, ọpụtaghị na e rere ya ere dịka ohu. Ya mere na ọ nwụọ, a ga-ebulara ya ndị nwe ya."

Ili ozu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ kwenyere na e kwesịrị ili nwaanyị na be di ya, mana ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ na be nna ya ka e kwesịrị ili ya

"A na-eji ewu aga alụta nwaanyị, n'otu aka ahụ, a na-ejikwa ewu ebulara nwaanyị ndị nwe ya ma ọ nwụọ."

Oriaku Benedicta Nwokocha-Akuezi gwakwara anyị na oge gboo, "omenala ọtụtụ obodo n'ala Igbo bụ na isi nwaada anaghị atọ na mba, ọkachasị onye bụ isi ada na be nna ya."

Akuezi kwukwara na ebe ụfọdụ, ọ bụrụ na anaghị eme nwaanyị ọfụma na be di ya, ọ nwụọ, ndị mụrụ ya ga-abịa buru ozu ya laa.

Mgbe ụfọdụkwa, ọ bụrụ ajọ nwaanyị nke nyere ndị be di ya nnukwu nsogbu, oge ọ nwụrụ, ndị be di ya ga-akpọ ndị mụrụ ya ka ha bịa buru ya.

Ka ọ dị ugbua

Nwoke na-ebe akwa n'elu akpati ozu

Ebe foto si, Getty Images

Ọkammụta Nnabuihe kwuru na omenala ili nwaanyị ebe ọ lụrụ di bụ omenala bịara abịa, "ọbụghị omenala ọkpụ Igbo."

O kwuru sị: "Oge ụfọdụ, nwaanyị nwere ike rịọ ndị mụrụ ya ka ha kwe ka e lie ya na be di ya n'ihi na ya na ha na-ebi nke ọma."

"Mgbe ọ dị otu a, ọ dịịrị ndị mụrụ ya ikwete maọbụ ịjụ n'ihi na onye kechaa ekpe nwụọ, ndị dị ndụ ekegharịa."

Onye na-egwu ili

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwanyị alụghị di, amụtaghị nwa, a na-eli ya n'akụkụ ụlọ maọbụ n'azụ owere n'ihi na a na-ahụ ya ka onye nwụfuru anwụfu

Oge BBC Igbo kpọtụụrụ Oriaku Celestina Obiejesi onye omenala Igbi dọrọ anya, o kọwara na ugbua nwaanyị ọbụla a lụrụ alụ bụ na be di ya ka a na-eli ya."

"Ọ bụrụ nwaanyị na-alụghi di ma nwụọ oge nne na nna ya ka dị ndụ, a na-eli ya n'akụkụ ụlọ, ọbụghị na mbara ezi, maka a na-ahụta na ọ nwụfuru anwụfu."

Ọkammụta Nnabụihe kwukwara ihe dị otu a.

Ka ọ dị ugbua a ka nwere obodo ụfọdụ ndị omenala ha bụ na a ga-elirịrị nwaanyị na be nna ya kama na be di ya.

Mpaghara ụfọdụ n'Edo steeti, dịka ndị Esan, ka na-eme otu a.

Mana obodo ndị a ebuchaghizi ibu ugbua.