Ịchụ nta Biafra anaghị enye anyị ohere itinye uche ebe Uwazurike nọ - Ipob

Ebe foto si, STEFAN HEUNIS
Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ekwuola na onweghi oge ha jiri cheta maọbụ nwee atụmatu igbu onye malitere atụmatu ịchọ nwereonwe Biafra nke agba ọhụrụ bụ Ralph Uwazurike.
Otu Ipob sara ebubo na ha na-achọ igbu Uwazuruike site n'ozi ọnụ na-ekwuru ha zitere BBC Igbo.
Emma Powerful kwuru sị na njem ịchọta Biafra anaghi enye ha ohere itinye uche n'ebe Uwazurike na ndị otu ya nọ.
Dịka ha si kwuo, ndị Ipob sị na okwu Uwazurike na Chris Mocha abụghị ụdịrị okwu ha ga-asa.
Ha sị na ọ bụ maka ndị okwu a nwereike ghọgbuo mere ha jiri etinye ya ọnụ.
Ha sị: "Ibo Ipob ebubo na ọ chọrọ igbu Uwazurike bụ asị sị ọkụ mmụọ pụta, nke nwereike bụrụ ụzọ achọrọ iji nye anyi ajọ aha."
Ipob, sịte n'ozi Emma Powerful, sị ka Uwazurike na Massob rapụ ESN na Ipob aka.
"Ọ bụghị eziokwu na Ipob chọrọ igbu m"
Uwazurike n'onwe nke ya apụtala kwuo na akụkọ pụtara na ndị otu Ipob na-achọ igbu ya bụ akụko ụgha.
Ọ sị na ya akwadoghi akụkọ ahụ maka na ọ bụghị eziokwu.
Uwazurike sị na okwua Chris Mocha kwuru abụghị nke ya nyere nkwado.
Ọ sị: "Onye ọbụla na-eso m kwesiri ikwenye n'ihe m kwenyere."
Ọ sịkwa na ya enyela onye biputere akụkọ a ezumike nwa mgbenta maka ihe a o mere.
"Atụmatụ sit at home dị ka mmadụ iji aka ya gụpụ anya ya maka ọ na-ewere onye ọzọ iwe"
Maazị Uwazurike kwukwara uche ya banyere atụmatụ sit at home ndị otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob) hibere ma mecha sị na ha akagbuola.
Uwazurike sị na ya akwadoghị atụmatụ ịnọdụ n'ụlọ kwa Mọnde.
Ọ kwuru na nke a dịka mmadụ ịta onwe ya ahụhụ maka na ọ na-ewere onye ọzọ iwe.
Ọ sị: "Atụmatụ a dị ka iji maka na m narala gị ekwentị gị were gụpụ anya gị. E were sịkwa nye gị ekwentị ahụ m si gị mba, e were gbupu aka gị."
"Ka atọghapụ Nnamdi Kanu"
Uwazurike sịkwa na ya chọrọ ka gọọmentị Naịjirịa tụghapụ Nnamdi Kanu na nga ọ nọ mana a ga-enye ya iwu ka ọ nọdụ na Naịjirịa.
Maazị Uwazurike si na nke bụ ihe ga-enye aka hụ na udo chịri na Naịjirịa.
Ọ gakwara n'ihu kwuo ka Maazị Kanu "nọdụ na Naịjirịa na-achọ nwereonwe dịka Uwazurike na ndị ọzọ na-eme".
Ọ sị: "Ya bụrụ na Kanu nọ na Naịjirịa ọ gaghị na-asị "gaa gbuo onye uweojii, ga gbaa ụlo ọkụ, makana ya kwuo etu e jide ya."
Maazị Uwazurike bụ onye hibere otu Bekee kpọrọ "Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra" (Massob) n'afọ 1999.
Kanu n'onwe ya bụbu onye Massob tupu ya na ndi ọzọ ehibe otu "Indigenous People of Biafra" (Ipob).
Nnamdi Kanu bụ "sabo" nke mbụ"

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Maazi Uwazurike sịrị na ya bụrụ na ya bụrụ na a na-ekwu maka ndị na-agba njem nwereonwe Biafra mgba okpuru aha Nnamdi Kanu ga-abu mbụ.
Ọ sị na dịka Maazị Kanu - bụ onye hibere otu Indigenous People of Biafra (Ipob) - napụrụ ya Radio Biafra n'atụmatụ ndị ọzọ niile Massob nwere na mba ofesi dị icheiche. Ọ bụ mgba okpuru ka ọ gbara ya na otu ya".
Maazị Uwazurike gakwara n'ihu kwuo na ka ọ dị ugbua, na ya agbagharala Maazị Kanu.
Ọ sị na ya mere nke a makana ya chọrọ ka otu niile na-achọ nwereonwe Biafra bịakọta.
Uwazurike sị na ya mere nke a maka na ya apụtala kwuo na ya agbagharala ihe niile e mere ya mbụ dika ya chọrọ ka udo chịa n'etiti ndị niile na-achọ nwereonwe.
Lee ihe onyonyo ebe Uwazurike kwuru ihe ndị a nakwa etu o siri debe ọnụ were kwuo ha n'okpuru.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Cheta na dịka gọọmentị Naịjirịa kpọrọ Ipob otu na-eyi ndụ egwu, ha emeghi Massob etu a.
Mana, gọọmentị Naịjirịa bokwara Uwazurike ebubo ịkpa nkata megide Naịjirịa ma ma kpọchie ya na nga ọtụtụ mgbe.
N'afọ 2005 atụrụ Uwazurike nga, nke ọ nọ ruo afọ 2007 oge Binta Nyako nyere ya ohere ọnwa atọ ka ọ gaa akwamozu nne ya.













