Nnamdi Kanu: 'Ihe ga-eme ka m gbaghara ya ma nabatakwa ya dịka nwa m' - Uwazurike

Ralph Uwazurike

Ebe foto si, Ralph Uwazurike

Raph Uwazurike, onyeisi ndị otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ Biafra Independence Movement (BIM), ekwuola na ọ bụrụ na Nnamdi Kanu, onyeisi otu Ipob, kwụsị ikwu okwu na-akpata ọgbaaghara n'obodo, na ya ga-agbaghara ya ma nabatakwa ya dịka nwa.

Uwazurike kwuru nke a oge otu jikọrọ ndị si mpaghara Ugwu na-ere ehi n'Imo steeti bịara na be ya n'ụbọchị Sọnde ikele ya maka mbọ ọ na-agba iweta udo na mpaghara ala Igbo.

Cheta na Uwazurike bụkwa onye so hibe otu Biafra De facto Customary Government nke Asari Dokubo bụ onyeisioche ya.

O kwuru na Nnamdi Kanu bụ nwa ya nwoke, onye ọ kpọrọ gaa mba UK ma nyefee ya ụlọọrụ Radio Biafra n'aka, mana Kanu mechara gbanwee.

"Mana agbagharala m ya ihe ọjọọ niile o mere m," Uwazurike kwuru.

"Kama ihe ga-eme ka m nabatakwa ya ọzọ dịka nwa m bụ ma ọ kwụsị ikwu okwu ọgbaaghara."

"Ejikwa m ohere a akpọ Nnamdi Kanu ka ọ kwụsị ọgbaaghara ma sonye anyị n'ọgbakọ Biafra Defacto Government."

"Aga m agba mbọ ịhụ na obi Nnamdi Kanu dajụrụ, ọ bụ nwa m nwoke."

Aha onyonyo, Onye ndu ndị MASSOB bụ Ralph Uwazuruike gbọrọ ọkụ n'ọnụ na mkparịta ụka ya BBC

Uwazurike kwuru na obi dị ya mma etu otu United Nations siri kpọọ ya oku n'ọgbakọ ha abalị olemole gara aga, nke gosiri na ha hụrụ ya dịka onye na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra n'eziokwu.

O kwuru sị: "Ndị UN chọpụtara na abụ m mmadụ udo, abụghị m onye ọgbaaghara, ọ bụ ya mere ha ji chọọ ịnụ ihe m ga-ekwu."

Ọ gara n'ihu kwe ndị Ugwu nọ n'ala Igbo nkwa na onweghị ihe ọbụla ga-eme ha.

Aha onyonyo, Ndịigbo si na ọbụ mmegbu iji onye ugwu tụchịe onye ndịda na gọmmentị Buhari

O kwere ndị na-ere ehi nkwa na ha na ndị Igbo ga na-emekọrịta ka nwanne na nwanne, dịka ọtụtụ ndị Igbo sikwa nọrọ na mpaghara Ugwu n'enweghị nsogbu ọbụla.

Uwazurike katọrọ ndị na-awakpo ndị uweojii ma na-egbu ha, ọ katọkwara ụfọdụ ndị ọchịehi ndị na-egbusisi mmadụ n'ime ọhịa dị iche iche.

Akụkọ ga-amasị gị