Nnamdi Kanu: 'Ihe ga-eme ka m gbaghara ya ma nabatakwa ya dịka nwa m' - Uwazurike

Ebe foto si, Ralph Uwazurike
Raph Uwazurike, onyeisi ndị otu na-achọ nnwereonwe Biafra bụ Biafra Independence Movement (BIM), ekwuola na ọ bụrụ na Nnamdi Kanu, onyeisi otu Ipob, kwụsị ikwu okwu na-akpata ọgbaaghara n'obodo, na ya ga-agbaghara ya ma nabatakwa ya dịka nwa.
Uwazurike kwuru nke a oge otu jikọrọ ndị si mpaghara Ugwu na-ere ehi n'Imo steeti bịara na be ya n'ụbọchị Sọnde ikele ya maka mbọ ọ na-agba iweta udo na mpaghara ala Igbo.
Cheta na Uwazurike bụkwa onye so hibe otu Biafra De facto Customary Government nke Asari Dokubo bụ onyeisioche ya.
O kwuru na Nnamdi Kanu bụ nwa ya nwoke, onye ọ kpọrọ gaa mba UK ma nyefee ya ụlọọrụ Radio Biafra n'aka, mana Kanu mechara gbanwee.
"Mana agbagharala m ya ihe ọjọọ niile o mere m," Uwazurike kwuru.
"Kama ihe ga-eme ka m nabatakwa ya ọzọ dịka nwa m bụ ma ọ kwụsị ikwu okwu ọgbaaghara."
"Ejikwa m ohere a akpọ Nnamdi Kanu ka ọ kwụsị ọgbaaghara ma sonye anyị n'ọgbakọ Biafra Defacto Government."
"Aga m agba mbọ ịhụ na obi Nnamdi Kanu dajụrụ, ọ bụ nwa m nwoke."
Uwazurike kwuru na obi dị ya mma etu otu United Nations siri kpọọ ya oku n'ọgbakọ ha abalị olemole gara aga, nke gosiri na ha hụrụ ya dịka onye na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra n'eziokwu.
O kwuru sị: "Ndị UN chọpụtara na abụ m mmadụ udo, abụghị m onye ọgbaaghara, ọ bụ ya mere ha ji chọọ ịnụ ihe m ga-ekwu."
Ọ gara n'ihu kwe ndị Ugwu nọ n'ala Igbo nkwa na onweghị ihe ọbụla ga-eme ha.
O kwere ndị na-ere ehi nkwa na ha na ndị Igbo ga na-emekọrịta ka nwanne na nwanne, dịka ọtụtụ ndị Igbo sikwa nọrọ na mpaghara Ugwu n'enweghị nsogbu ọbụla.
Uwazurike katọrọ ndị na-awakpo ndị uweojii ma na-egbu ha, ọ katọkwara ụfọdụ ndị ọchịehi ndị na-egbusisi mmadụ n'ime ọhịa dị iche iche.














