Ipob Sit At Home Order: Ihe mere m jiri kwugharịa okwu banyere ya - PG Ogidi

Ebe foto si, Atika General/Screenshot
Onyeisi ndị obodo Ogidi dị n'Anambra Steetị bụ Jideofor Onubogu sị na ndị mmadụ ghọtehiere ihe o kwuru banyere atụmatụ 'sit-at-home' otu Ipob tinyere.
O gwara BBC Igbo na onweghi mgbe ọ sị ka agbahapụ atụmatụ nwete Biafra kama na ọ sị ka emee ihe gbapụtara ihe ga-egosi iwe ndị Biafra.
Onubogu sị na atụmatụ ịnọ n'ụlọ ụbọchị anọ n'otu ọnwa ezughi igosi iwe ndị Biafra, na ọ ga-adị mma ịpụ n'ezi gosi ndị Naịjirịa na ihe a na-eme ha adịghị mma.
Ọ sị na o cheghi na ịnọ n'ụlọ n'Ọwụwa Anyanwụ ga-emetụta onye na-achị Naịjirịa nọ n'Ugwu kama na ọ bụrụ na ọ ga-emetụta ya, ka a gaa n'ihu ịnọ n'ụlọ.
Nke ọzọ o kwuru bụ na a naghị eme ka ọtụtụ ndị so na-agba mbọ ka nwete Biafra mata ihe na-eme, na ọ bụ naanị na soshal midia ka ha na-anụ ihe ọ bụla a chọrọ ime.
Ọ sị na ihe mere ya na ndị obodo ji pụta bụ ka ha nwee ike sonye na mbọ a na-agba n'inwete Biafra kama na ọ bụghị ka o megide atụmatụ a.

Ebe foto si, Atika General/Screenshot
N'ụbọchi Mọnde e mere 'sit-at-home', Maazị Onubogu na ndị otu ya mere nghagharị udo n'Obodo Ogidi na-ekwu na ha anabataghị atụmatụ ahụ.
Ndị ntoroọbịa soro mee nghagharị udo a, ma yiri uwe e dere "Egbula ala Igbo, kama sị mba maka iwu Sit-at-home".
Ha sị na atụmatụ a ga-emetụta ụmụakwụkwọ n'ala Igbo ọkachasị ndị na-ede ulee NECO nakwa ndị ahịa.
Onubogu kwuru na iwu "sit at home" agaghị akwado ọganihu aka ọrụ ụmụ Igbo n'obodo ha nke mere ha ji akatọ ya.
N'ihe onyonyo ahụ, Ọ sị ha kwadoro atụmatụ nwereonwe Biafra, na obi adịghị ha mma maka nwuchi Nnamdi Kanu, mana ya aghaghị anabata maọbụ kwado iwu 'sit-at-home'.












