'Ọ bụ ndị ntoroọbịa Atani na-awakpo ndị okenye ka ndị agha jidere, ọ bụghị ndị Ipob' - Igwe Ngoddy

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service
Igwe Augustine Ngoddy bụ onyeisi obodo Atani nọ n'Anambra Steetị ekwuola nke ọ sị n'okwu na-ese n'obodo ya enweghị eto o si metụta Indigenous People of Biafra (Ipob).
Igwe Ngoddy sị na ọ bụ okwu dị n'etiti ndi obodo na ụfọdụ okorọbịa ha banyere ụtụ isi a na-ana ndị na-abịa ego aja n'obodo ahụ.
Cheta otu Ipob kpọrọ Igwe Ngoddy aha dịka ha dọrọ ụfọdụ ndị eze ọdịnala aka na ntị banyere nwuchi ndị otu ha.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful wepụtara n'izuụka gara aga, o nyere Igwe Augustin Ngoddy nke obodo Atani dị n'Ogbaru nke Anambra Steetị ụbọchị asaa ịkpọpụta ndị ntoroọbịa a nwuchiri n'obodo ahụ.
Powerful sị na ọ bụrụ na Igwe emeghi nke ahụ na ihe a tụghị anya ga-eme.
Mana Igwe Ngoddy gwara BBC Igbo n'obodo Atani nọ nso mmiri Rịva Naịja nke mere otu n'ime ọrụ aka ndị obodo ha bụ igwupute aja e jị arụ ụlọ n'ime mmiri.
Ọ sị na nsogbu bidoro dịka ndị obodo gbakọtara họpụta ndị ga na-anapụta ego ụtụ isi (nari Naịra abụọ) n'aka ndị gwongworo n'ebu aja n'obodo ahụ.
Igwe Ngoddy sị na ego ụtụ isi a bụ ego ha ji emezi ụzọ, ọkụ latrịk nakwa ọrụ imezi obodo.
Na nkọwa ya, dịka ndị ntorobịa obodo malịtere napụwa ndị gwomgworo utu isi n'ike, ọ kpọrọ ha oku ka ha nwee mkparịtaụka na kwụsị ị napụ ndị a ego dịka ndị ndu ahọpụtala ndị kwesiri ịnakọta ego ụtụ a.
Etu ndị ọrụ nchekwa siri bata n'Atani

Ebe foto si, Getty Images
Igwe Ngoddy sị na ọ bụ eziokwu na ndị ọrụ nchekwa nwuchiri ụfọdụ ndị ntoroọbia Atani, mana ọ sịkwa na ya gwara ha ka atụghapụ.
Ọ sị: "Mgbe ndị ntorobịa gara n'ihu na-enupuru okwu ndị ndu isi, anyị kpọrọ ndị ọrụ nchekwa bụ ndị uweojii ka ha tinye aka gbochie ndị ntorobịa inapụ ndị ọrụ ụgbọ ala gwongworo ego"
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị ntorobịa bịagidere ndị uweojii n'ike buso ha agha ma napụ ụfọdụ n'ime ha egbe ha bu.
"Ndị ntorobia ji ịwe banye obodo mebiwe ihe ma wakpowa ụlọ ndị okenye nakwa ndị ọzọ so bụru ndị ndu obodo".
Igwe Ngoddy sị na iwe ndị ntoroọbịa bụ na ndị uweojii batara igbochi ha atụmatụ ịnapụ ndị gwongworo ụtụ isi.
O gwara BBC Igbo ọ bụ ọgbaghara mere o jị kpọọ ndị ọrụ nchekwa nọ nso ebe ahụ bụ ndị agha mmiri ka ha bịa zọpụta ndị uweojii ahụ ma dajuo ọgbaghara a.
Ọ kọwara na dịka ndị agha mmiri batara ha tinyere aka hụ na udo loghachịtere na obodo ha.
O kwukwara na onweghị ihe gbasara ndị otu Ipob na ọgbaghara mere be ha, dịka ndị anwụchiri bụ ndị ntorobia so kpalịte ya bụ ọgbaghara ma buso luso ndị uweojii ọgụ.
Gịnị mere Ipob ji nye Igwe Austin Ngoddy iwe a?

Ebe foto si, Getty Images
O nwebeghi onye maara kpọmkwem ihe mere Ipob ji nye Igwe Ngoddy iwu mana ihe onyonyo pụtara na soshal midia ke otu onye kọrọ ihe mere n'Atani.
Ihe onyonyo ahụ gosiri ka ndị agha mmiri na Naịjirịa (Nigerian Navy) na-anwuchi ụfọdụ ụmụokoroọbịa na-etinye ha n'ụgbọala.
Nkọwa so ihe onyonyo ahụ na-ekwu na ndị ntoroọbịa obodo bu ngagharịiwe gaa n'ụlọ Igwe Ngoddy maka etu ụgbọala Timpa na-ebu aja si emebisi okporoụzọ ha.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
A sị na ndị gwomgworo ahụ na-akwụ Igwe a ụgwọ iji bata bịa gwuru aja na mmiri dị n'obodo nke mere ụzọ ha ji na-emebisi.
Mana, dịka ọ gwara BBC Igbo, Igwe Ngoddy sị na okwu a niile abụghị eziokwu.
Ndị ntoroọbịa gakwuru Igwe, sị ka o were ego ahụ a na-akwụ ya tinye aka mezie ụzọ ha mana Igwe hụtara ha ka ndị na-ama ọchịchị ya aka n'ihu.
Na nke a mere o jiri ga kpọtụrụ ndịagha mmiri ma sị ha na ndị ntoroọbịa ahụ bụ ndị otu Ipob na-enye nsogbu n'obodo Atani.










