Broken Heart Syndrome: Ị ma na "Obi Mgbawa" nwere ike ibutere gị ọnọdụ a?

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ mgbe ka ị na-anụ ndị mmadụ na-ekwu okwu dịka "i mewaala m obi", maọbụ "obi agbawaala m".
Ndị mmadụ na-ekwukarị ụdị okwu a ma onye ha hụrụ n'anya mee ha ihe wutere ha nke ukwuu.
Mana ọtụtụ amaghị na e nwere ọnọdụ ahụike a na-akpọ obi mgbawa, maọbụ 'Broken Heart Syndrome' na bekee.
Akụkọ a bụ iji kọwaa ihe bụ 'Broken Heart Syndrome', ihe nwereike ịkpata ya, etu o si enye mmadụ nsogbu nakwa etu mmadụ ga-esi zeere ya.
Gịnị bụ Broken Heart Syndrome?

Ebe foto si, Getty Images
Dọkịta Chioma Ofoekii kọwara 'Broken Heart Syndrome' dịka mgbe obi mmadụ nwere nsogbu ma rụhie ọrụ nwa mgbe nta.
Ihe na-akpata ụdị ọnọdụ a nwereike ịbụ nnukwu ihe mwute maọbụ ihe mere mmadụ na mberede, dịka ihe obi mwute, nnukwu ihe ịtụnanya, oke iwe, maọbụ nnukwu ihe ịtụ egwu.
Ihe ndị ọzọkwa nwere ike ịkpata ya bụ shuga dị n'ọbara mmadụ ịdatu ala karịa etu o kwesịrị, ọbara ịgbapụ mmadụ n'ahụ nke ukwuu, maọbụ oke ahụ ọkụ.

Mmadụ nwereike inwe ụdị ọnọdụ a bụ 'Broken Heart Syndrome' maọ bụrụ na ahụ mmadụ mepụta nnukwu 'adrenaline' ma ihe dị aṅaa mee.
'Adrenaline' bụ akụrụngwa ahụ mmadụ na-emepụta iji nye aka kwadoo onye ahụ maka ihe ụfọdụ.
Aha ọzọ a na-akpọ ọnọdụ ahụike a bụ "Stress cardiomyopathy" "Takotsubo syndrome", maọbụ "Apical ballooning syndrome".
Etu ọnọdụ a si egosipụta n'ahụ mmadụ

Ebe foto si, CHRISTIAN TEMPLIN, UNIVERSITY HOSPITAL ZURICH
Dịka Dọkịta Ofoekii si kọwaa, ọnọdụ a bụ 'Broken Heart Syndrome' na-egosipụta n'ụdị dị icheiche dịka:
- Obi mgbu maọbụ obi ịfụ mmadụ ụfụ
- Oke ọsịsọọ ịpụta mmanụ n'ahụ
- Ajụ ibu mmadụ
- Mmadụ anaghị ekutecha ume nke ọma
Dkt Ofoekii kọwakwara na ihe ngosi ndị a bụkwa njirimara ụdị ọrịa obi dị icheiche, nke mere o ji dị mkpa ka mmadụ gaa ụlọọgwụ mgbe ọ chọpụtara ihe dị otu a n'ahụ ya.
"Onye nwere ọnọdụ "Broken Heart Syndrome" nwere ike inweta onwe ya ma gbakee na mkpụrụ ụbọchị olemole," Ofoekii kwuru.
Ndị nwere ike inwe ọnọdụ a bụ Broken Heart Syndrome

Ebe foto si, Science Photo Library
Dkt Ofoekii kọwara na ndị ọnọdụ a na-aka emetụta bụ ụmụnwaanyị, ọ kachasị ndị gaferela oge ịhụ nsọ ha nke bekee kpọrọ 'menopause'.
Ọ bụ eziokwu na achọpụtala ọnọdụ 'Broken Heart Syndrome' n'ahụ ụmụ agbọghọ, ụmụ nwoke nakwa ụmụaka, mana nnyocha gosiri na ndị na-enwekarị ụdị ọnọdụ a bụ ụmụnwaanyị gbagoterela n'afọ.
Ọ na-emetụtakarị ndị nwerela ọnọdụ oke obi mmapụ (anxiety), obi ịda mba (depression) nakwa ọnọdụ obi ndị ọzọ.
Ọnọdụ a o nwere ike igbu mmadụ?
Dkt Ofoekii gara n'ihu kwuo sị: "Ọ bụ eziokwu na onye nwere ọnọdụ 'Broken Heart Syndrome' nwereike ịgbake, mana ya bụ ọnọdụ nwekwara ike ibute ọnọdụ obi ndị ọzọ nwereike ibute ọnwụ mmadụ. Ọ bụghị ọnọdụ mmadụ ga-eji egwuri egwu."
Nnyocha sayensị gosiri na ọnọdụ 'broken heart syndrome' anaghị egbukarị mmadụ.
Mana nnyocha gosikwara na o nwere ike ịkpata ọnọdụ obi ka njọ nke nwere ike igbu mmadụ.
Lee ihe ụfọdụ ndị mmadụ kwurula maka ọnọdụ a:
Otu nwaanyị aha ya bụ Momma Sophia na Twitter kwuru na ya bụ ọrịa gburu nna ya.
O kwuru na nwanne ya nna nwụrụ

Ebe foto si, Screengrab
Onye ọzọ aha ya bụ Chloe, dekwara etu nna ya si nwụọ n'ihi obi mgbawa n'ọnwa June 2019.

Ebe foto si, Screengrab













