Agbawatụla gị obi maka ịhụnanya, lee etu ị ga-esi chịkọta onwe gị

Ebe foto si, AFP
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ị hụtụla onwe gị ebe ọ dị ka ụwa gị agwụla n'ihi na onye ị hụrụ n'anya (enyi gị nwoke maọbụ nwaanyị) gbawara gị obi?
Kedụ ihe ị mere oge ahụ? Ị hapụrụ ka echiche ụwa dakwasị gị ka ị chọrọ ụzọ dọpụta onwe gị?
Ọtụtụ ndị ji echiche na ihe ga-agara ha nke ọma, na ha nwereike imecha lụọ onye ha zutere banye n'ime ọyị, mana o mezughi n'ikpeazụ.
Ebe ụfọdụ mechara jide obi ha aka, ụfọdụ emeela ihe a tụwaghị anya dịka ịma ụma emerụ onwe ha ahụ maọbụ gbuo onwe ha n'ihi ya.
Lee etu ị ga-esi dọpụta onwe gị n'ọnọdụ ahụ.
1) Mara na ụwa gị agwụbeghi:

Ebe foto si, Getty Images
Na onye ị hụrụ n'anya jụrụ gị abụghị na ị ga-ajụ onwe gị.
Ị gaghị anwụ n'ihi na ọ dị gị n'obi sị gị na ọ chọghịzị ihe jikọrọ unu abụọ, kama ihe ị kwesịrị ime bụ ịchịkọta onwe gị ọnụ n'ụdịrị oge a.
Bee akwa ma ọ gụọ gị, gụọ egwu "ụwa mụ oo, gịnị ka m mere ụwa?", mee ihe ọbụla ị chọrọ ime, mana mee ya ọsịsọ, kụchasịa ike gị ma bilie gawa n'ihi na ụwa na-eche ka ị gosi ha dike ị bụ.
2) Atala onwe gị ụta

Ebe foto si, Getty Images
Otu ihe ọma ị ga-emere onwe gị bụ ịkwụsị ịta onwe gị ụta.
Kwụsị ịgwa onwe gị na ọ bụ gị metere ihe onye a ji hapụ gị, na ọ bụ gị metere ihe e jiri gbawaa gị obi etu a.
O sighi gị n'aka nwanne, gwa onwe gị na ebe ọ na-adabaraghị gị na onye a, ọ ga-adabara gị na onye ọzọ.
N'otu aka ahụ, were ihe ị mụtara na mmekọrịta gị na onye nke a hapụrụ gị, mara etu ị ga-esi ṅogharịa ya tupu ị banye n'ime ọyị ọzọ.
3) Pụta n'oke echiche

Ebe foto si, Getty Images
Ị nọrọ n'ebe ndị mmadụ nọ, ọ ga-ara gị ahụ ịbanye n'echiche ebe ị nwereike ị na-ajụ onwe gị "kedụ ihe m mere onye a? Kedụ ihe m tinyere onwe m na ya?"
Ndị ọkachamara n'ihe gbasara akparamagwa mmadụ ekwuola na usoro e si eru uju ruru ụzọ ise.
A bịa n'ihe gbasara mgbawa obi, ụzọ ise ahụ dabara n'usoro ya bụ iru uju nke gụnyere
- Ekweghi ekwe na ihe mere emeela - N'ọnọdụ a, onye a gbawara obi ka nọ na-enwe olileanya na onye gbawara ya obi 'ga-agbaghara ya ma lọghachịta' maọbụ na 'ka m gbachi nkịtị mee ka ọ bụ na m amaghị na mmadụ gbawara m obi, mana nwanne chefuo nke ahụ gaa ihu
- Iwe - Nke a bụ ọnọdụ ụfọdụ ndị na-ejikarị abanye na nsogbu; ụfọdụ ndị ejirila iwe mebie ihe onye gbawara ha obi, ihe dịka ịgba uwe onye ahụ ọkụ, imebicha ihe n'ụlọ ya wdgz. Ụfọdụ na-ebusakwa onye na-enweghi ihe o mere ha iwe, n'ihi na ọ na-achọ ụzọ ọ ga-esi wepụ ọnụma ahụ zuru ya ahụ. Mgbe ị nọ n'ọnọdụ a, akwa gụọ gị ị bee ya, ọchị tọọ gị ị chịpụ ya
- 'Ọ bụrụkwa na m ma' - Nke a bụ oge onye a gbawara obi na-eji echeta ihe ndị ọ na-emenwughi oge ihe ka dị mma, ma na-achọkwa ma ọ ka nwere ohere ịlaghachịkwuru onye tiwara ya obi. Ụfọdụ na-eji oge a eziga akwụkwọ ozi, ndị mmadụ maọbụ chọọ ụzọ ọ ga-esi mee ka onye tiwara ya obi mara ma ọ ga-alọghachite na ndụ ya
- Ịbanye n'oke echiche - Ị nọrọ n'ebe ndị mmadụ nọ, ọ ga-ara gị ahụ ịbanye n'echiche ebe ị nwereike ị na-ajụ onwe gị "kedụ ihe m mere onye a? Kedụ ihe m tinyere onwe m na ya?" N'oge a ka ọtụtụ ndị na-anwa igbu merụọ onwe ha ahụ
- Nnabata na ihe mere eme emeela - O meela bụ na o meela, agaghị egburu ya mmadụ! N'oge a ka onye e tiwara obi na-adọpụta onwe ya n'ọnụ oke akwa. Ugbua, o kwetala na ihe agbanweela na ndụ ya, na ọ bụghị ụbọchị niile ga-adị mma nke bụ na ọ ga-ekpebiri onwe ya na "agaghị m egbu onwe m n'ihi ihe a mere m".
Ọ dịkwa ezigbo mkpa ịma na onye ọbụla anaghị enwekwa otu ụdịrị ahụmihe; iru uju na-emetụta mmadụ n'ụzọ dị iche iche.
Marakwa na o wụghị mmadụ niile na-esi n'olulu iru uju a apụta ọsịsọ, ya mere, ị nweta onwe gị n'ọnọdụ a, ị nwereike ịgakwuru ndị ọkammụta n'ihe gbasara ọnọdụ ahụike nke ụbụrụ ka ha nyere gị aka si na ya rịpụta.












