Mental Health Awareness Week: Psychosis, Bipolar disorder na ọrịa isi ndị ọzọ ị kwesịrị ịma maka ya

Onye nwere ọrịa isi

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ oge ka ndị ọ na-edoghi anya na akpọ ndị nwere ọrịa isi "ndị isi mgbaka". Mana ọ bụ ọrịa isi niile bụ 'isi mgbaka'?

Akụkọ a na-akọwa etu ọrịa isi dị iche iche na-esi emetụta ndị mmadụ na etu o si dị iche n'isi mgbaka.

Site n'ụbọchị itoolu ruo 15 nke nke ọnwa Mee afọ 2022, bụ oge a họpụtara maka nkọwa na mgbasaozi maka ahụike nke a kpọrọ 'Mental Health Awareness Week' na Bekee.

A wepụtara ụbọchị a iji gbaa tọọchị n'ihe gbasara ọrịa ndị na-emetụta isi, nke gụnyere ọrịa ụbụrụ, ọrịa uche wdgz.

Ụfọdụ ọrịa na-emetụta isi gụnyere:

Psychosis:

Nnyocha ngalaba ahụike mba UK a kpọrọ 'National Health Scheme' (NHS) kọwara ọrịa a kpọrọ 'psychosis' dịka mgbe mmadụ na-ahụ ihe na-eme n'ụwa a dịka ọ na-eme n'ụwa ọzọ.

Nke a gụnyere ịhụ ihe ndị ọzọ nọ gị nso anaghị ahụ nakwa ịnụ ihe ndị ọzọ anaghị anụ (Bekee kpọrọ hallucinations), nakwa ikwenye n'ihe ndị emeghi n'eziokwu, ọkachasị na mmadụ bu n'obi imerụ ha ahụ (Bekee kpọrọ ya delusions).

Ụfọdụ oge onye na-arịa psychosis anaghị ama na ọ bụ naanị ya ka ihe na-eme na-eme; ụfọdụ ndị nọ ha nso na-eche na isi agbakaala ha.

Ihe na-ebute psychosis gụnyere:

  • Schizophrenia - nke bụ ọnọdụ na-ebute ihe gụnyere ịnụ nakwa ịhụ ihe na-adịghị ebe ahụ, nke ndị ọzọ anaghị ahụ.
  • Depression - nke a bụ ọnọdụ oke obi ịda mba.
  • Oke ndọkasị ahụ, ahụmihe ọdachi, ịṅụbiga ọgwụ ike na mmanya na-aba n'anya oke
  • Ụfọdụ oge, psychosis na-emekwa ndị nwekwara ọrịa akpụ ito n'ụbụrụ isi a kpọrọ (brain tumor)

Ọgwụgwọ psychosis:

Psychosis na-abịa abịa na-ala ala dịka onye ọbịa, mana ọ naghị alakarị kpamkpam.

Nlekọta onye na-arịa psychosis gụnyere ịṅụ ọgwụ nke ụlọọgwụ na-enye.

Onye ọrịa isi na-eme

Ebe foto si, Getty Images

Ọrịa 'Bipolar Disorder'

NHS kọwara 'Bipolar disorder' dịka ọrịa na-emetụta ụbụrụ nke nwereike ịgbanwe ọnọdụ mmadụ n'otu ntabi anya.

Onye na-arịa ọrịa ụbụrụ a nwereike inwe nnukwu obi aṅụrị n'otu mgbe nke nwereike igbanwe ma bụrụ ọnọdụ mwute ozugbo.

Ndị na-arịa ọrịa ụbụrụ a na-ahụta ihe ndị dị etu a:

  • Obi ịda mba - Inwe mwute, ịdị ala na ịdị ka ọ bụ i kwesighi ekwesi
  • Inwe akparamagwa dị aṅaa - Imebiga ihe oke, ime oke ike ike, obi ụtọ.

O nweghi onye ma kpọmkwem ihe na-ebute ọrịa Bipolar, mana ọtụtụ ihe gụnyere oke nchekasị, oke ndọga, oke nsogbu ụwa nakwa ihe ndị na-agbanwe ndụ (dịka ihe mberede a kpọrọ trauma), nwereike ịkpali ya.

N'afọ 2021 ka otu onye ejije a ma ama bụ Cha Cha Eke kwuputere na ọ na-arịa ọrịa Bipolar , nke mere ka o wusaa ebe niile.

Ọrịa Dementia

Ọrịa Dementia bụ ọrịa uche na-emetụta akụkụ ụbụrụ a kpọrọ 'Hippocampus' nke bụ ụzọ e si abanye ihe jikọrọ echiche.

Ọrịa a na-emetụta ndị mmadụ dịka ndị na-arịa ya na-echefukarị ihe.

Ọ na-emekarị ndị merela okenye maka na ọ bụ ọrịa na-abịa n'agadị.

Nwata akwụkwọ na-ede ihe na bọd

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụaka nwere ọnọdụ dị aṅaa kwesịrị ka a kpachapụrụ ha anya n'ụzọ pụrụ iche

Ọrịa isi ndị ọzọ gụnyere:

Obsessive Compulsive Disorder (OCD)

Aha onyonyo, Ara maọbụ isi mgbaka abụghị mmụọ ọjọọ na-ebute ya

Ọnọdụ a na-eme ka mmadụ nwee echiche ime ihe na anaghị ekwe apụ n'uche onye ahụ.

Ọnọdụ ahụike a nwereike ịkpalite mgbakasị ahụ dịka onye ga-achọrịrị ime ihe ọbụla gbatara ya n'uche.

Ọnọdụ a nwereike imetụta ụmụnwoke, ụmụnwaanyị nakwa ụmụaka.

Ndị bu ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwọ sịte n'ịṅụ ọgwụ nakwa usoro enyemaka ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi nke Bekee na-akpọ "psychological therapy".

Autism

Autism bụ otu ọrịa na-emetụta mkparịtaụka nakwa akparamagwa . Ọtụtụ oge ndị mmadụ na-aghọtaghie ya dịka ara.

'Autism na-emetụta ụbụrụ isi ndị mmadụ ọkachasị mgbe mmadụ ka na-eto eto.

O dochabeghi ndi ọkacha mara anya ihe na-akpata ya bụ ọrịa, mana nnyocha egosila na ụbụrụ ndị nwere 'autism' na nke ndị ọzọ anaghị abụcha otu ihe.

Mana ọ dị mwute na ọtụtụ na-akpọ ndị nwere ọria a 'imbecile' ma were ha na-eme ihe ọchị. Nke a jọgburu onwe ya.

Ndi nwere 'autism' bụ mmadu zuru oke ma nwee uche zuru oke.

Post-Traumatic Stress Disorder

Nke a bụ ụdị ọnọdụ obi mmapụ na ụjọ nke Bekee na-akpọ "anxiety".

Ndị mmadụ na-adaba n'ọnọdụ a site n'ihe dị oke egwu maọbụ ihe mkpagbu na obi mmapụ mere mmadụ n'oge gara aga.

Ọnọdụ a nwereike ime ka mmadụ ghara ịrahụ ụra.

Ụdịrị ihe ndị mere mmadụ nwereike ịkpalịte ọnọdụ a bụ: Ihe mberede, mwakpo n'aka ndị ọjọọ, mwakpo maọbụ ndịna n'ike, ọnọdụ dị egwu n'ịmụ nwa wdgz.

Ndị bu ọnọdụ a nwereike ịnata ọgwụgwọ sịte n'ịṅụ ọgwụ nakwa usoro enyemaka ndị ọrụ ahụike ụbụrụisi nke Bekee na-akpọ "psychological therapy".