Dementia: Kedụ ihe mere ọrịa a ji akawanye njọ ugbua?

Nyocha e mere ụbụrụ otu nwoke akpọrọ Aldo

Dementia bụ otu n'ime ọrịa na-emetụta ụbụrụ ndị mmadụ nke na-eme ka ha chezọọ ihe mere nsoso a.

Dịka ngalaba WHO si kwuo, ihe karịrị mmadụ nde ise na ụma ise bụ ndị bu ọrịa ahụ ma kwuo na ọnụọgụgụ a nwereike iji ugboro atọ rịa elu n'afọ ole na ole na-abịa.

Mgbe achọpụtara ọrịa a n'afọ 1908, ọbụghị ọrịa na-emetụta mmadụ niile mana ugbua otu onye na-ebute ya kwa ntabi anya atọ

Mana n'agbanyeghị nke a, naanị otu mba n'ime mba anọ nwere iwu na-enyere ndị na-agabiga ọrịa a aka.

Gịnị bụ ọrịa Dementia?

Ọrịa Dementia bụ ọrịa na-emetụta akụkụ ụbụrụ akpọrọ 'Hippocampus' nke bụ ụzọ e si abanye ihe jikọrọ echiche.

Seheli Jahan bụ onyeisi ọgwụ ụbụrụ n'ụlọọgwụ Bangladesh kwuru na ọ bụ 'ọrịa nchefu ihe' na nkenke.

Ọ kọwara na ọ na-ara ahụ ka onye bu ọrịa dementia cheta ihe mere nsonso a mana ha na-enwe ike ịcheta ihe mere n'oge gara aga.

"Ọ na-aka mma na ndị bụ ntorobịa n'ihi na hippocampus' ka nwere ahụike, ọ na-akpọ nkụ ka mmadụ na-aka nka"

E nwere udiri ọrịa anọ bụ vascular dementia, Alzheimers dementia, live body dementia, frontal temporal dementia nakwa Parkinson's dementia.

Ọ bụ ọrịa Alzheimers dementia bụ nke kachasị emetụta ndị mmadụ.

Etu ọrịa a si egosiputa?

Eserese na-egosi nnyocha ụbụrụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Eserese na-egosi nnyocha ụbụrụ

Mgbanwe omume bụ ihe mbụ e ji achọpụta ndị nwere Dementia.

Ihe ọzọ bụ nchefu ihe mere nsonso a, nchefu aha ha nakwa ebe ha nọ.

Ha na-efukwa n'ebe ha magbu mbụ maọbụ chefuo okwu ha bụ n'uche ma ha na-enwe mkparịtaụka.

Ihe ndị so eme ka ọrịa bawanye bụ na ndị mmadụ na-ebizi ogologo ndụ; ha anaghị anwụ n'oge

Ọgwụgwọ Dementia

Igwe MRI na-enyocha ụbụrụ

Ebe foto si, Getty Images

O nweghi ọgwụgwọ eji aka maka ọrịa dịka ndị nnyocha sayensị na-agbasị mbọ ike ịrụpụta ọgwụ ga-akwụsị ya.

Ya mere na achọtabeghị ihe jikọrọ 'amyloid' na ọrịa Dementia.

Nke a pụtara na ndị nnyocha sayensi ka nwere ụfọdụ akụkọ gụnyere:

- Gịnị na-egbu 'neurons' n'ụbụrụ

- Kedụ ụdịrị 'protein' na-ejupute n'ụbụrụ

- Ha kwenyere na achọta asịsa ajụjụ ndị a, ọ ga-eme ka achọta ọgwụgwọ ọrịa ahụ ngwa ngwa

Ihe ndị ga-enye aka gbochi ya

Agadị nwaanyị na-agba egwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mmegharị ahụ bụ otu ụzọ e si egbochi ọrịa Dementia dịka dọkịta si ekwu

O doro anya na enwebeghi ọgwụgwọ maọbụ ọgwụ mgbochi Dementia mana ndị dọkịnta na-ekwukwa na o nwere ihe ndị mmadụ nwere ike ime iji gbochi ya.

  • - Enwena ọbara mgbali elu
  • - Ebune oke ibu
  • - Gị na ndị mmadụ nwee nnọkọ na ọgbakọ
  • - Gbaara ọrịa shuga ọsọ
  • - A nọla sọsọ gị
  • - Megharịa ahụ
  • - Gwọọ ọrịa ịda mba (depression) ngwangwa
  • - Esela 'ciga'

A mabeghi ihe jikọrọ omume ndị a na ọrịa 'dementia' mana nnyocha ka na-aga n'ihu.