World Cancer Day: Etu m si nweta ọgwụgwọ ọrịa kansa - Onye meriri Kansa ara
Ọrịa kansa bụ ọrịa na-eyi ụwa niile egwu maka etu o si egbu ndị mmadụ. Nke ka njọ bụ ndị na-achọ ọgwụgwọ na-achọ ya mana onwebeghi ọgwụ ewepụtara na ya bụ ọgwụgwọ ya.
Isiokwu emume ncheta ọrịa Kansa nke afọ 2019 bụ "Enwere m ike , ị nwere ike" nke pụtara na anyị niile nwereike ịwakpo ọrịa Kansa.
Mana nwaada Gloria bụ onye chọpụtara akpụ kansa n'ara ya n'afọ 2010, a waa ya ahụ, o mee kimo na ihe ndị ọzọ niile wee merie ya bụ ọrịa.
N'okwu ya , "Kansa abụghị ikpe ọnwụ", ugbua, ọ na-etinye ọnụ na okwu gbasara ụmụnwaanyị kansa na-arịa.
Ọ gwara BBC Igbo etu o siri merịe ya bụ ọrịa na-atụ ụwa niile egwu.