E rere m ọtụtụ ihe m nwere iji kwụọrọ nwa m nwaanyị ụgwọ akwụkwọ - Nna Deborah Yakubu

Nna Deborah Yakubu bụ Emmanuel Garba ekwuola na olileanya ya na nwa ya ga-agụcha Mahadum n'afọ a akụọla afọ n'ala.
Mazị Garba kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Pidgin nwere n'ụbọchị Mọnde.
"Amụrụ m ụmụ asaa, Deborah bụ nwa m nke a bụọ, ọ dị afọ 21 ugbua," Garba kwuru.
"Agụmakwụkwọ ya kacha mekpaa ahụ maka na erere m ọkara ụlọ m ka m wee nwee ike ịkwụrụ ya ụgwọakwụkwọ."
"Ọ bụ na-afọ a ka o kwesịrị ịgụcha, olileanya m niile bụ ịhụ ya ka ọ gụchara mahadum."
Gbasara etu o si nweta ozi ọnwụ nwa ya bụ Deborah, Mazi Emmanuel Garba kwuru na ọ bụ nwanne ya bi na Sokoto kpọrọ ya n'ekwentị kọọrọ ya."

O kwuru na ya tụfuru nnukwu ego ma takwaa nnukwu ahụhụ iji si na Sokoto bulata ozu nwa ya.
"Naanị ego ụgbọala isi Sokoto buru ozu ya lọta Niger, akwụrụ m N100,000."
"Tinyekwara ahụhụ ndị ọzọ dịka ịga n'ụlọọrụ ndị DSS nakwa ebe ndị ọzọ tupu ha ekwe ka m buru ozu ya."
"Anụrụ m na ndị uweojii sị na ha anwụchiela ụfọdụ ndị so gbuo nwa m, mana ewerela m ihe niile hafee n'aka Chukwu."
"Ọ bụrụgodi na a kpọpụ ndị ahụ ụlọikpe, agaghị m aga."

Emmanuel Garaba, onye dị afọ 55, kwuru na ọnwụ nwa ya na-ewute ya nke ukwu maka na nwa ahụ bụ onye na-eme ya obi ọma.
O kwuru na Deborah kwere ya nkwa ịrụrụ ya ụlọ ma ọ gụchaa akwụkwọ bido ịkpata ego, mana nkwa niile ahụ alaala ugbua.
Gbasara nwunye ya, bụ nne Deborah, Mazi Garba kwuru na ọ bụ sọ akwa ka ọ na-ebe ugbua.
"Anyị akpọrọla ya gaa ụlọọgwụ maka na ya bụ ihe metụtara ya nke ukwuu."
Akpụpụla mmadụ a na-enyo enyo maka iso gbuo Deborah Yakubu ụlọikpe

Ndị uweojii Sokoto Steeti akpụpụla mmadụ abụọ ụlọikpe dịka e boro ha ebubo na ha so na ndị gburu nwaada Deborah Yakubu na Sokoto Steeti n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Mee afọ 2020.
Otu ọkaiwu aha ya bụ Mansur Ibrahim gwara BBC na ọ bụ ya na-anọchite anya ndị ahụ e boro ebubo n'ụlọikpe.
Oge ya bụ ikpe malitere, mmadụ abụọ ahụ kwuru na aka ha dị ọcha na ya bụ ebubo.
Ọkaikpe nyere iwu ka e jichie mmadụ abụọ ahụ n'ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị eyigharịrị ya bụ ikpe.
Ndị uweojii kwukwara na nnyocha ha ka na-aga n'ihu dịka ha nwere olileanya ịnwuchi ndị ọzọ aka ha dị n'ogbugbu Deborah.
Cheta na e mere ngagharịiwe nke butere nnukwu ọgbaaghara na Sokoto n'ụbọchị Satọde, dịka ndị ntorobịa chọrọ ka a tọhapụ ndị ahụ e ji eji.
Nke a mere ka gọọmentị Sokoto steeti tinye mmachi mkpagharị na steeti ahụ niile malite n'ụtụtụ ruo n'abalị
Deborah Yakubu bụ nwata akwụkwọ onye okpukperechi Kraịst e gburu n'ihi ebubo na ọ kparịrị okpukperechi Islam nakwa onyeisi ya bụ Mohammed.
Etu e siri gbuo Deborah Yakubu ma gbaa ya ọkụ na Sokoto

Ebe foto si, Screengrab Deborah Yakubu
Ndị uweojii nọ na Sokoto steeti dị na Naịjirịa ekwuola na ha anwụchiela mmadụ abụọ sịcha na mahadum "Shehu Shagari College of Education" ebe e gburu Deborah Yakubu maka ebubo ịkatọ okpukperechi ndị ụka alakụba.
Ha kwuru na nwụchị a na-abịa dịka ha a na-eme nyocha gbasara etu nwaagbọghọ ahụ si nwụ kpọmkwem.
Ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ n'okwu gbasara ogbugbu Deborah Yakubu maka ebubo ịkatọ okpukperechi ndị ụka alakụba.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu agbachiela ya bụ mahadum ma gwa ụmụakwụkwọ ka ha lawa ozugbo.
Akụkọ na-ekwu na Deborah ka na-agụ 200 level na mahadum "Shehu Shagari College of Education" tupu ọnwụ ya.
Cheta na ụmụ okorobịa iwe na-ewe gburu otu nwata nwaanyị na-agụ akwụkwọ na nnukwu ụlọakwụkwọ 'Shehu Shagari College of Education' na Sokoto.
Dịka akụkọ ahụ si kwuo, ha boro nwata nwaanyị a aha ya bụ Deborah Yakubu ebubo na ọ kparịrị okpukperechi Islam.

Ebe foto si, Shehu Shagari College of Education, Sokoto
Ihe onyonyo pụtara na soshal midia gosiri ebe ndị ntorobịa ji iwe na-atụ nwata ahụ okwute.
Ha mechara jiri ụkwụ taya ụgbọala munye ahụ nwa agbọghọ ahụ ọkụ.
Ihe onyonyo ahụ gosiri otu n'ime ndị kpara arụ a ebe ọ na-ekwu n'asụsụ Hausa sị: "Ọ bụ m mụnyere ya ọkụ."
Ụmụakwụkwọ ahụ jikwa iwe malite imebi ụlọ nakwa ụgbọala ndị mmadụ n'okirikiri ahụ.

Ebe foto si, Gọọmentị Sokoto
BBC achọpụtabeghị kpọmkwem ihe nwata ahụ kwuru nke mere ụmụ akwụkwọ ibe ya ji gbuo ya.
Mana gọọmentị Sokoto Steeti emechiela ya bụ ụlọakwụkwọ ugbua n'ihi ya bụ ihe merenụ.
Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Isa Galadanchi kwuru na Gọvanọ Aminu Tambuwal enyela iwu ka e mechie ụlọakwụkwọ ahụ ma malite nnyocha maka ya bụ ihe.

Ebe foto si, Sultan of Sokoto
N'otu aka ahụ kwa, Sultan nke Sokoto bụ Sa'ad Abubakar katọkwara ihe a merenụ ma kpọọ oku ka ebe niile dere jii.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ gwara BBC na ndị otu ha awụchiela n'ụlọakwụkwọ ahụ iji mee ka udo chịa.

Ebe foto si, Catholic Diocese of Sokoto
Na nke dịka ibe ya, Bishọpụ ụka Katọlik na Sokoto bụ Mathew Hassan Kukah, katọkwara ogbugbu e gburu Deborah Yakubu.
Kukah kwuru sị: "Otu ụgwọ gọọmentị ji ezinụlọ nwaada a bụ ịhụ na ndị kpara arụ a alaghị n'ụkpọrọ."
"Ha kwesịrị ka a taa ha ahụhụ dịka iwu siri dị."
"Ndị ụka Kraịst na ndị nke Islam na-ebi n'udo na Sokoto ebe a kamgbe ogologo afọ."
"Arụ a ndị a kpara abụghị maka okpukperechi ọbụla. Ọ bụ arụ nke e kwesịrị ka a taa ndị kpara ya ahụhụ."
Bishọpụ Kukah rịọrọ ndị ụka Kraịst bi na Sokoto ka ha dere jụụ, kama ka ha kpee ekpere ka mkpụrụobi Deborah zuo ike n'udo.
Ọ rịọkwara ka Chineke kasie ezinụlọ nwa ada ahụ obi maka ọdachi a dakwasara ha.

Ọgbaghara dapụtara na Sokoto maka nwụchị ndị a na-eche na ọ bụ ha gburu Yakubu
Ngagharịiwe malitere dịka akụkọ pụtara na ụmụakwụkwọ Shehu Shagari College of Education gburu otu nwata akwụkwọ ha aha ya bụ Deborah Yakubu.
Akụkọ kwuru na ha boro Deborah ebubo na ọ katọrọ okpukperechi Islam nakwa Onye Amụma ha dị nsọ bụ Mohammed.
Nke a mere ndị ntorobịa ji wakpoo ya, were okwute tụgbuo ya ma gbaa ozu ya ọkụ.
Ndị mere ihe a jikwa ekwentị ha see ya n'onyonyo nke fesara na soshal midia na-egbughị oge.
Akụkọ kwukwara na ndị ntorobịa ahu malitere imebi ụlọ na ụgbọala ndị mmadụ n'okirikiri ahụ.
Iji belata ọgbaaghara, Gọvanọ Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal tinyere mmachi mkpagharị, ma nye ndị uweojii iwu ka ha nwuchie ndị so gbuo nwata nwaanyị ahụ bụ Deborah Yakubu.
Ndị uweojii kwukwara na ha anwụchiela mmadụ abụọ a hụrụ ihu ha n'onyonyo ahụ ebe e gburu Deborah.
Nke a kpatara ngagharịiwe ji malitekwa ọzọ, dịka ndị ntorobịa na-achọ ka a tọhapụ mmadụ abụọ ahụ e jidere.
Ọ bụ etu a ka ya bụ ngagharịiwe si ghọọ nnukwu ọgbaaghara nke butere mmebi ihe.
Ndị a ne-eme ngagharịiwe wakporo ụlọ, ahịa, ụlọụka, ụgbọala nakwa ọtụtụ ihe ndị mmadụ n'agbanyeghị na onweghị ihe gbasara ha n'ihe na-emenụ.













