Deborah Samuel: Lee akụkọ ụgha dị icheiche na-efegharị gbasara ọgbaaghara dara na Sokoto

Akụkọ ụgha

Ọtụtụ akụkọ ụgha na-efegharị ugbu gbasara ọgbaaghara dapụtara na Sokoto Steeti n'ihi ogbugbu Deborah Samuel, nwata akwụkwọ 'Shehu Shagari College of Education n'ụbọchị Tọzde, Mee 12, 2022.

Ụfọdụ akụkọ ụgha ndị a malitere na Twitter na Facebook dịka onyonyo etu e si gbuo nwata nwaanyị ahụ ịgbasa.

Ka ọ gachara abalị abụọ ihe a mechara, nnukwu ọgbaghara dapụtara na Sokoto dịka ndị ntorobịa na-akpọ oku ka a tọhapụ ndị otu ha a nwuchiri n'ihi ebubo iso gbuo Deborah.

Kamgbe ahụ, akụkọ, foto nakwa onyonyo ụgha na-agbasa na soshal midia iji kwanye ọkụ ka ya bụ ọgbaaghara kawanye njọ nakwa nkewa na Naịjirịa.

Ọtụtụ na-agbasa ozi ụgha ndị a na-akpọkwa oku ka e kewaa Naịjirịa ka ndị alakụba na ndị otu Kraịst gawara onwe ha.

Onyonyo kwuru na e gbuola ọtụtụ ndị otu Kraịst na Sokoto

Akụkọ ụgha

Otu onye akara Facebook ya bụ 'Emeka Fans Page' tinyere onyonyo ebe ọ nọ kwuo na "ndị Sokoto egbuola ndị otu Kraịst niile nọ na steeti ha."

Ndị mmadụ ekiriela onyonyo ahụ ihe karịrị ugboro 670,000, ma kesakwaa ya ihe karịrị ugboro puku ise.

Naanị mmadụ abụọ ka ndị uweojii kwuru na ha gbatara egbe oge ha chọrọ iwakpo ụlọ onyeisi ndị ụka alakụba bụ Sultan nke Sokoto.

E nwere foto nakwa onyonyo ndị bụ eziokwu gbasara ndị mmadụ na-akpọ taya ọkụ n'okporoụzọ, buruchaa mma na osisi na-agbagharị n'okporoụzọ.

Onyonyoo ọzọ gosikwara ebe ndị mmadụ na-emebi ụlọahịa, na-ezu ihe ndị mmadụ ma na-agbakwa ụlọahịa ndị mmadụ ọkụ.

Mana e nweghị ihe akaebe ọbụla gosiri na "e gburu ọtụtụ ndị otu Kraịstị" dịka Emeka Fans Page si depụta.

Onyonyo ebe a na-akụ nwata nwaanyị osisi

Akuko ugha

Onyonyo ọzọ fesara bụ nke gosiri ebe ndị ntorobịa ji osisi na-akụ otu nwaanyị yi uwe dọkara adọka.

N'onyonyo ahụ, a hụkwara ka ụmụnwaanyị ndị ọzọ yicha akwa ndị Alakụba kwụ n'akụkụ na-ele anya.

"Nwaanyị ahụ a na-akụ osisi na-ebe akwa na-asị "Agaghị m emekwa ya ọzọ, biko gbagharanụ m".

Nnyocha BBC mere gosiri na onyonyo ahụ agbasaalarị kemgbe afọ abụọ gara aga.

Ya bụ onyonyo bụ na Kaduna ka e sere ya, dịka a na-ebo nwaanyị ahụ ebubo na ọ na-ezu, ma na-ere ụmụntakịrị.

Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekesa ya bụ onyonyo ugbua na-ekwu na ọ bụ ihe na-eme na Sokoto.

Foto onye akụkọ e boro ebubo ụgha na ọ bụ dọkịta ogbu mmadụ

Akuko ugha

Otu foto pụtakwara nke gosiri otu onye kpọrọ onwe ya Christopher Uche-Ayodeji (Dr Chris), onye kwuru na ọ bụrụ na ndị si mpaghara Ugwu bịa n'ụlọọgwụ ya, ọ na-ama ụma gbachi ha nkịtị ka ha nwụọ.

Dịka Foto ahụ si gosi, ya bụ Dr Chris na-arụ ọrụ ugbua na 'University Hospitals' dị n'obodo Birmingham nke mba UK.

Otu onye na Twitter zigaara ụlọọgwụ ahụ ozi maka ya bụ ihe, mana ha zaghachiri na e nweghị onye ọbụla na-aza ụdị aha ahụ n'ụlọọgwụ ha.

N'agbanyeghị nke a, ndị mmadụ ka na-ekesakwa ya bụ onyonyo ụgha.

E mechara chọpụta na foto e tinyere na mgbasa ozi ahụ bụ nke onye ntaakụkọ aha ya bụ Ayodeji Rotinwa na-arụ ọrụ n'Abuja.

Nnyocha gosikwara na o nweghị akara Facebook aha ya bụ 'Christopher Uche-Ayodeji (Dr Chris)', nke pụtara na mgbasaozi ahụ bụ okpotokpo asị.

Akụkọ ụgha maka mwakpo ụlọ Bishop Kukah

Bishop Mathew hassan Kukah

Ebe foto si, Sokoto Diocese

Akụkọ ụgha ọzọ fesara bụ nke kwuru na a wakporo ụlọ Bishọp ụka Katọlik bụ Mathew Hassan Kukah ma gbaa ya ọkụ.

Mana Bishọp Kukah ewepụtala akwụkwọ ozi ma kwuo na ya bụ akụkọ abụghị eziokwu.

Kukah kwuru na ebe a wakporo bụ Ụlọ ụka Holy Family nakwa ụlọụka St Kevin ebe a gbara otu ụgbọala ọkụ ma kurie ụfọdụ ihe tupu ndị uweojii achụsaa ha.