Deborah Yakubu: 'Ndị na-eme ngaghariiwe n'ihi nnwuchi ndị gburu Deborah kuriri ọdọahịa m, zukọọ ngwaahịa m'

Ebe foto si, Getty Images
Ọtụtụ ndị na-azụ ahịa na Sokoto nọ n'iru uju ugbua dịka ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe maka nnwuchi a nwuchiri ndị gburu Deborah Yakubu wakporo ụlọahịa ha ma zuo ha ohi.
E gburu ma gbaa Deborah Yakubu, nwata akwụkwọ 'Shehu Shagari College of Education, Sokoto' ọkụ n'ụbọchị Tọzde, abalị 12 nke ọnwa Mee ,afọ 2022, maka ebubo na ọ kparịrị onye amụma ndị Ụka Alakuba bụ Mohammed.
Ndị uweojii nwụchiri mmadụ abụọ ha na-enyo maka ọnwụ nwada ahụ mana ndị ntorobia nọ na steeti ahụ malitere ụbọchị Satode mewe ngagharịiwe na-ekwu ka a tọhapụ ha.
Otu nwa afọ bi na Sokoto achọghị ka a kpọọ aha ya kọọrọ BBC Igbo na ụlọahịa nke ya so na ndị a wakporo.
Ọ sịrị, "Ihe na-emenụ bụ na ha na-eme ngagharịiwe, sikwa ebe ahụ na-ezu ngwaahịa ndị mmadụ, na-emebisi ihe ndị mmadụ," Onyedika kwuru.
"Mụ onwe m ha kụwara shọọpụ mụ zuo ihe niile dị n'ime ya."
"Enwere ndị ha gbara ụlọ ha ọkụ, enwere ndị ha gbara ụgbọala ha ọkụ. Ohi ka ha na-ezu."
"Ha mebichara ọtụtụ ihe ndị mmadụ n'ọnụ na ha na-eme ngagharịiwe."
Ọ gara n'ihu kọwaa na ndị a mere ngagharịiwe wakporo ahịa 'Central Market' dị na Sokoto, mana ha enwenwughị ike ịbanye n'ime ahịa ahụ.
"Ị ma na 'Central Market' gbara ọkụ n'afọ gara aga, nke mere ka ndị mmadụ nọrọzie n'okporoụzọ na-azụ ahịa."
"Ọ bụ ebe ahụ ka ha gara ma mebie ihe ndị mmadụ zukwaa ha ohi."
"Mana mpaghara ebe ụlọahịa nke m dị bụ n'ogbe a na-akpọ "Hajia Halima."

Ha banyekwara mpaghara 'Bello Way' na ebe ndị ọzọ."
Nwa amadi ahụ onye kwuru na ọ bụ ụnyaahụ bụ Satọde, Mee 14 ka ihe a mere ma kwuru na ya agbaala ọsọ ndụ ebe ahụ ọdachi dapụtara.
Taa bụ ụbọchị ụka, gọọmentị Sokoto tinyere mmachi mkpagharị, mana dịka ndị bi na steeti ahụ si gwa BBC Igbo, o nweghị ndị ọrụ nchekwa nọ n'ụzọ.
Onye ahụ bi na steeti ahụ gwara anyị sị, "Ọ na-abụ e nwee 'curfew' e mechie okporoụzọ niile, ndị ọrụ nchekwa a na-akpagharị, mana nke a, onweghị kama otu mkpụrụ onye uweojii nọ n'ụzọ."
"Ka ọ dị ugbua, ha (bụ ndị na-eme ngagharịiwe) anaghị agagharịzi."
"Ha emezuola ihe ha chọrọ ime (nke bụ) ha bịa ha yie ndị mmadụ egwu, ndị mmadụ agbaa ọsọ, ha zuo ndị mmadụ ohi, mebichaa ihe ndị mmadụ."
Gịnị kpatara ngagharịiwe a na Sokoto?

Ebe foto si, Gọọmentị Sokoto Steeti
Ngagharịiwe malitere dịka akụkọ pụtara na ụmụakwụkwọ Shehu Shagari College of Education gburu otu nwata akwụkwọ ha aha ya bụ Deborah Yakubu.
Akụkọ kwuru na ha boro Deborah ebubo na ọ katọrọ okpukperechi Islam nakwa Onye Amụma ha dị nsọ bụ Mohammed.
Nke a mere ndị ntorobịa ji wakpoo ya, were okwute tụgbuo ya ma gbaa ozu ya ọkụ.
Ndị mere ihe a jikwa ekwentị ha see ya n'onyonyo nke fesara na soshal midia na-egbughị oge.
Akụkọ kwukwara na ndị ntorobịa ahu malitere imebi ụlọ na ụgbọala ndị mmadụ n'okirikiri ahụ.
Iji belata ọgbaaghara, Gọvanọ Sokoto steeti bụ Aminu Tambuwal tinyere mmachi mkpagharị, ma nye ndị uweojii iwu ka ha nwuchie ndị so gbuo nwata nwaanyị ahụ bụ Deborah Yakubu.
Ndị uweojii kwukwara na ha anwụchiela mmadụ abụọ a hụrụ ihu ha n'onyonyo ahụ ebe e gburu Deborah.

Nke a kpatara ngagharịiwe ji malitekwa ọzọ, dịka ndị ntorobịa na-achọ ka a tọhapụ mmadụ abụọ ahụ e jidere.
Ọ bụ etu a ka ya bụ ngagharịiwe si ghọọ nnukwu ọgbaaghara nke butere mmebi ihe.
Ndị a ne-eme ngagharịiwe wakporo ụlọ, ahịa, ụlọụka, ụgbọala nakwa ọtụtụ ihe ndị mmadụ n'agbanyeghị na onweghị ihe gbasara ha n'ihe na-emenụ.












