Ndị uweojii: Ndị ọchịehi abụghị ndị agha Jihadị

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii nọ na Sokoto steeti agọtarala ndị ọchịehi si mba ọzọ enubata na Naijiria na Sokoto steeti ọnụ ha sị na ha abụghị ndị agha Jihadị.
Akụkọ kwuru na ọtụtụ ndị chị ehi ruru 3,000 si mba Niijie nubata n'okpuru ọchịchị Gudu na Tangaza dị na Sokoto steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ DSP Cordelia Nwawe kwuru na akụkọ ahụ na-efegharị nke kwuru na ndị agha Jihad ji ngwaagha wakporo mpaghara ahụ bụ ụgha.
"Nchọpụta anyị na-egosi na akụkọ na-efegharị abụghị eziokwu. A hụrụ ndị ọchịehi mba Mali a na-eche na ha bi n'ọhịa mba Niijie n'agbata okpuru ọchịchị Gudu na Tangaza."
"Ndị ọchịehi a bụ ndị ọbịa na-achị ehi ha abịa kwa afọ.
"Kama ọnụọgụgụ ehi ha chị bịa n'afọ a ruru pụkụ atọ nke karị rinne ehi otu puku ha na-achịbu abịa.
"Ha anaghị achọ okwu. Ha na-abata n'ime obodo ịzụ nri ma lọghachikwa n'ime ọhịa."





