Bandits Strip Students: Onyonyo ebe ndị ji egbe na-agba ụmụakwụkwọ ọtọ, abụghị na Naịjirịa ka o mere

Ihe onyonyo ebe ndị omekome ji egbe a sị ụmụakwụkwụ ha yipu uwe ha

Ebe foto si, Screengrab

Ngalaba BBC na-enyocha akụkọ ụgha achọpụtala na onyonyo ebe ndị ji egbe na-agba ụmụakwụkwọ ọtọ, abụghị na Naịjirịa ka o mere.

Ya bụ onyonyo fesara nke ukwuu na 'whatsapp' dịka ndị mmadụ na-akọ na ọ bụ iji gosi etu ọnọdụ nchekwa na Naịjirịa si akawanye njọ.

Mana nnyocha BBC gosiri na ya bụ ihe mere na mba Cameroun.

N'ime onyonyo ahụ, ụmụ okorobịa bucha egbe jidere ụmụakwụkwọ manye ha ka yipu uwe akwụkwọ ha niile, gbara ọtọ.

Ụmụakwụkwọ e gosiri na onyonyo ahụ dị iri na atọ n'ọnụ ọgụgụ, ha yi uwe akwụkwọ na-acha ọcha nakwa anụnụ anụnụ.

Ndị ojiegbe ahụ nọ na-eyi ụmụakwụkwọ ahụ egwu, na-agbali egbe elu iji yijaa ha, ebe ụmụ akwụkwọ ahụ nọ na-arịọ ha biko.

Ihe a mere n'ụbọchị ahụ asọmpi Africa Cup of Nations(AFCON) malitere, n'abalị itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2022.

Ụmụnwoke ahụ na-asụ bekee egbujiri egbujiri bụ nke e ji mara ogbe ndị na-asụ bekee na mba Kameroun, ma na-agwa ụmụakwụkwọ ahụ ka ha chilie aka ha elu, kpọkwa ha ndị oji egbe ezu.

Ọtụtụ mmadụ bị Naịjirịa ji 'Whatsapp' ekesa onyonyo a ma na-ekwu na ọ bụ na Kebbi state, dị na mpaghara ugwu Naịjirịa ka o mere.

Otu ozi so ya bụ onyonyo e kere na Whatsapp ndị Naịjirịa bụ: "Akụkọ mere ugbua: Ndị oji egbe ezu nwụchịrị ụmụakwụkwọ si Kebbi alọta... Ugbua gwam ka ọ bụ etu a ka anyị ga-esi na-ebi ndụ anyị."

BBC amabeghị ma enwere ndị nwụrụ na ya bụ mwakpo merenu dịka ngalaba 'Cameroon Secondary Education Ministry' azaghị ekwenti a kpọrọ ha ịjụta ha maka ya bụ akụkọ.

Mana ụlọọrụ 'Voice Of America' depụtara na ngalaba ahụ kwuru na onweghị nwata akwụkwọ ọbụla merụrụ ahụ n'ọdachị ahụ.

A chọpụtala na ụmụakwụkwọ ahụ bụ ụmụakwụkwọ Government High School Buea-Bokova.

Na ngwụcha onyonyo ahụ ọ bụ otu onye n'ime ndị omekome ahụ setere, a nụrụ ka otu onye n'ime ha na-ekwu "ha bụ ndị na-aga akwụkwọ na Buea."

Ebee bụ Buea?

Ebe ụlọakwụkwọ ahụ dị

Ebe foto si, Satellite

Buea bụ obodo dị na South West Cameroun, ya na North West Cameroon nọ na nsogbu ndị oyi ndụ egwu tinyekwara ndị na-achọ nwereonwe ikepụta mba a kpọrọ Ambazonia na mpaghara ebe a na-asụ beke na Kamerun dị na Central African country.

Ndị a na-achọ nwereonwe ewerela mmechi ụlọakwụkwọ na ụlọahịa n'ike ekwu uche ha.

Akụkọ na-egosi na ndị a nọ na -amanye ụmụakwụkwọ ka ha yipu akwa ha chọrọ iji ohere ahụ ghasaa asọmpi Africa Cup of Nations (AFCON) nke 2021 na-aga n'ihu n'ogbe ahụ.

N'afọ 2020, ndị ji egbe wakporo ụlọakwụkwọ "Mother Francisca International Bilingual Academy' dị na Kumba ma gbuo ụmụaka asaa ma merụọ ndị ọzọ ahụ.

Agbanyeghị ọgbaghara na-eme na mpaghara 'North West' na 'South West' nke mba Cameroon, Buea na Limbe, dịcha n'ogbe ahụ na-anabata ndị otu F maka asọmpị African Cup of Nations nke 2021.