Fake News Debunking: Onye yiwere Umahi na Uzodinma uwe a?

Umahi na Uzodinma

Ndị otu na-achọ nwereonwe Biafra na-ekesasị foto na-egosi ka gọvanọ Ebonyi Steeti bụ David Umahi yi uwe dị ka ọkọlọtọ Biafra.

Otu onye na twitter sịrị "kesaa nụ foto a nke bụ na mgbe Umahi ga-ahụ ya ike ga-agwụ ya maka ndị Hausa Fulani agaghị ekwete na ọ bụ foto a rụrụ arụ.

Aha onyonyo, IPOB: A taghịm Nnamdi Kanu ụta

"Mee ka onye Igbo ọbụla chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala yiri uwe a. Mee ka ọ gazuoe ebe niile, gọọmentị Fulani hụ ya, ọ ga-achụ ha niile n'ọrụ."

Otu onye a kpọrọ Chinasa Nworo bụ onye ndu otu chọrọ Biafra kesara foto a rụrụ arụ nke ndị gọvanọ abụọ a n'akara Facebook ya ma jụọ "I chere na ndị a nwere ọbara Biafra n'ime ha?"

Ndị gọvanọ abụọ a bụ ndị pati All Progressive Congress (APC) bụ ndị ọkwa a na steeti abụọ n'ime steeti ise mejupụtara mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

David Umahi si na PDP banye APC n'ọnwa Nọvemba afọ 2020, ebe Uzodinma were ọchịchị Imo Steeti n'ọnwa Jenụwarị afọ 2020 site na nchụpụ ụlọikpe kachasị chụpụrụ Emeka Ihedioha nke PDP.

Ihe gọvanọ abụọ a anaghị amasị ndị chọrọ nwereonwe Biafra, Umahi akatọọla otu a ọtụtụ mgbe maka etu ha si chọrọ isi na Naịjirịa pụọ.

Na nso nso, o kwuru na Ebonyi agaghị eso na Biafra ma kwụpụta mmasị ya n'ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Ndị ọzọ a rụgharịrị foto ha ka nke ndị gọvanọ a bụ ndị a ma ama si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dịka oti egwu Flavour na ome ihe nkiri Williams Uchemba.

Na-agbanyeghi na Flavour na Uchemba apụtabeghi sị na foto ahụ abụghị ha, mana igwe nyocha foto 'google reverse image' gosiri nke bụ ezigbo foto ndị ahụ.

Aha onyonyo, Otu onye anwụọla dịka ndị ntorobịa na ndị agha takọtara isi n’Oguta

Otu chọrọ nwereonwe Biafra bụ Ipob ejirila soshal midia mere ebe mgbasaozi banyere mba Biafra kwụrụ onwe ya.

N'afọ 2017, akpọpụtara otu a aha dị ka ndị na-eyi ndụ egwu na Naịjirịa.

Onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu nke ọtụtụ na-akwanyere ugwu n'Ọwụwa Anyanwụ nọ n'aka gọọmentị Naịjirịa maka ebubo "iyi ndụ egwu, ibuso gọọmentị agha nakwa ịkpalite ọgbaghara site na mgbasaozi redio."

Ọ ga-apụta n'ụlọikpe dị n'Abuja na 18 Jenụwarị, n'ihi nke a otu a tinyere iwu "onye apụla ezi" n'Ọwụwa Anyanwụ.